Job 7 (BOICB)

1 “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ? 2 Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya, 3 otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya. 4 Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 5 Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya. 6 “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla. 7 O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ. 8 Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ. 9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. 10 E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ. 11 “Ya mere agaghị m emechi ọnụ;aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi. 12 A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,nke mere i ji eche m nche? 13 Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m, 14 nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwuwerekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji, 15 ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,karịa inwe ụdị ahụ m nke a. 16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi. 17 “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya, 18 i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,ma na-anwale ya mgbe mgbe? 19 Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri? 20 Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?Gịnị mere i ji elekwasị m anya?Abụrụla m ibu arọ nye gị? 21 Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,ma bupụ mmehie m?Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”

In Other Versions

Job 7 in the ANGEFD

Job 7 in the ANTPNG2D

Job 7 in the AS21

Job 7 in the BAGH

Job 7 in the BBPNG

Job 7 in the BBT1E

Job 7 in the BDS

Job 7 in the BEV

Job 7 in the BHAD

Job 7 in the BIB

Job 7 in the BLPT

Job 7 in the BNT

Job 7 in the BNTABOOT

Job 7 in the BNTLV

Job 7 in the BOATCB

Job 7 in the BOATCB2

Job 7 in the BOBCV

Job 7 in the BOCNT

Job 7 in the BOECS

Job 7 in the BOGWICC

Job 7 in the BOHCB

Job 7 in the BOHCV

Job 7 in the BOHLNT

Job 7 in the BOHNTLTAL

Job 7 in the BOILNTAP

Job 7 in the BOITCV

Job 7 in the BOKCV

Job 7 in the BOKCV2

Job 7 in the BOKHWOG

Job 7 in the BOKSSV

Job 7 in the BOLCB

Job 7 in the BOLCB2

Job 7 in the BOMCV

Job 7 in the BONAV

Job 7 in the BONCB

Job 7 in the BONLT

Job 7 in the BONUT2

Job 7 in the BOPLNT

Job 7 in the BOSCB

Job 7 in the BOSNC

Job 7 in the BOTLNT

Job 7 in the BOVCB

Job 7 in the BOYCB

Job 7 in the BPBB

Job 7 in the BPH

Job 7 in the BSB

Job 7 in the CCB

Job 7 in the CUV

Job 7 in the CUVS

Job 7 in the DBT

Job 7 in the DGDNT

Job 7 in the DHNT

Job 7 in the DNT

Job 7 in the ELBE

Job 7 in the EMTV

Job 7 in the ESV

Job 7 in the FBV

Job 7 in the FEB

Job 7 in the GGMNT

Job 7 in the GNT

Job 7 in the HARY

Job 7 in the HNT

Job 7 in the IRVA

Job 7 in the IRVB

Job 7 in the IRVG

Job 7 in the IRVH

Job 7 in the IRVK

Job 7 in the IRVM

Job 7 in the IRVM2

Job 7 in the IRVO

Job 7 in the IRVP

Job 7 in the IRVT

Job 7 in the IRVT2

Job 7 in the IRVU

Job 7 in the ISVN

Job 7 in the JSNT

Job 7 in the KAPI

Job 7 in the KBT1ETNIK

Job 7 in the KBV

Job 7 in the KJV

Job 7 in the KNFD

Job 7 in the LBA

Job 7 in the LBLA

Job 7 in the LNT

Job 7 in the LSV

Job 7 in the MAAL

Job 7 in the MBV

Job 7 in the MBV2

Job 7 in the MHNT

Job 7 in the MKNFD

Job 7 in the MNG

Job 7 in the MNT

Job 7 in the MNT2

Job 7 in the MRS1T

Job 7 in the NAA

Job 7 in the NASB

Job 7 in the NBLA

Job 7 in the NBS

Job 7 in the NBVTP

Job 7 in the NET2

Job 7 in the NIV11

Job 7 in the NNT

Job 7 in the NNT2

Job 7 in the NNT3

Job 7 in the PDDPT

Job 7 in the PFNT

Job 7 in the RMNT

Job 7 in the SBIAS

Job 7 in the SBIBS

Job 7 in the SBIBS2

Job 7 in the SBICS

Job 7 in the SBIDS

Job 7 in the SBIGS

Job 7 in the SBIHS

Job 7 in the SBIIS

Job 7 in the SBIIS2

Job 7 in the SBIIS3

Job 7 in the SBIKS

Job 7 in the SBIKS2

Job 7 in the SBIMS

Job 7 in the SBIOS

Job 7 in the SBIPS

Job 7 in the SBISS

Job 7 in the SBITS

Job 7 in the SBITS2

Job 7 in the SBITS3

Job 7 in the SBITS4

Job 7 in the SBIUS

Job 7 in the SBIVS

Job 7 in the SBT

Job 7 in the SBT1E

Job 7 in the SCHL

Job 7 in the SNT

Job 7 in the SUSU

Job 7 in the SUSU2

Job 7 in the SYNO

Job 7 in the TBIAOTANT

Job 7 in the TBT1E

Job 7 in the TBT1E2

Job 7 in the TFTIP

Job 7 in the TFTU

Job 7 in the TGNTATF3T

Job 7 in the THAI

Job 7 in the TNFD

Job 7 in the TNT

Job 7 in the TNTIK

Job 7 in the TNTIL

Job 7 in the TNTIN

Job 7 in the TNTIP

Job 7 in the TNTIZ

Job 7 in the TOMA

Job 7 in the TTENT

Job 7 in the UBG

Job 7 in the UGV

Job 7 in the UGV2

Job 7 in the UGV3

Job 7 in the VBL

Job 7 in the VDCC

Job 7 in the YALU

Job 7 in the YAPE

Job 7 in the YBVTP

Job 7 in the ZBP