Joshua 18 (BOICB)

1 Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel, 2 ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa. 3 Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu nyere unu? 4 Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m. 5 Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu. 6 Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ. 7 Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.” 8 Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta ONYENWE ANYỊ ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.” 9 Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo. 10 Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị. 11 Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef. 12 Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven. 13 Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon. 14 Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ. 15 Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa. 16 O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel. 17 Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben. 18 O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba, 19 ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda. 20 Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan.Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile. 21 Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị:Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz, 22 Bet-Araba, Zemaraim, Betel, 23 Avim, Para, Ofra, 24 Kefa Amoni, Ofni, Geba, obodo iri na abụọ na obodo nta ha ndị ọzọ. 25 Na Gibiọn, Rema, Beerọt, 26 Mizpa, Kefira, Moza, 27 Rekem, Iapeel, Tarala, 28 Zela, Haelef na obodo ndị Jebus, nke aha ya bụ Jerusalem, Gibea na Kiriat Jearim, obodo iri na anọ na obodo nta niile gbara ha gburugburu.Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin maka ikwu ya niile.

In Other Versions

Joshua 18 in the ANGEFD

Joshua 18 in the ANTPNG2D

Joshua 18 in the AS21

Joshua 18 in the BAGH

Joshua 18 in the BBPNG

Joshua 18 in the BBT1E

Joshua 18 in the BDS

Joshua 18 in the BEV

Joshua 18 in the BHAD

Joshua 18 in the BIB

Joshua 18 in the BLPT

Joshua 18 in the BNT

Joshua 18 in the BNTABOOT

Joshua 18 in the BNTLV

Joshua 18 in the BOATCB

Joshua 18 in the BOATCB2

Joshua 18 in the BOBCV

Joshua 18 in the BOCNT

Joshua 18 in the BOECS

Joshua 18 in the BOGWICC

Joshua 18 in the BOHCB

Joshua 18 in the BOHCV

Joshua 18 in the BOHLNT

Joshua 18 in the BOHNTLTAL

Joshua 18 in the BOILNTAP

Joshua 18 in the BOITCV

Joshua 18 in the BOKCV

Joshua 18 in the BOKCV2

Joshua 18 in the BOKHWOG

Joshua 18 in the BOKSSV

Joshua 18 in the BOLCB

Joshua 18 in the BOLCB2

Joshua 18 in the BOMCV

Joshua 18 in the BONAV

Joshua 18 in the BONCB

Joshua 18 in the BONLT

Joshua 18 in the BONUT2

Joshua 18 in the BOPLNT

Joshua 18 in the BOSCB

Joshua 18 in the BOSNC

Joshua 18 in the BOTLNT

Joshua 18 in the BOVCB

Joshua 18 in the BOYCB

Joshua 18 in the BPBB

Joshua 18 in the BPH

Joshua 18 in the BSB

Joshua 18 in the CCB

Joshua 18 in the CUV

Joshua 18 in the CUVS

Joshua 18 in the DBT

Joshua 18 in the DGDNT

Joshua 18 in the DHNT

Joshua 18 in the DNT

Joshua 18 in the ELBE

Joshua 18 in the EMTV

Joshua 18 in the ESV

Joshua 18 in the FBV

Joshua 18 in the FEB

Joshua 18 in the GGMNT

Joshua 18 in the GNT

Joshua 18 in the HARY

Joshua 18 in the HNT

Joshua 18 in the IRVA

Joshua 18 in the IRVB

Joshua 18 in the IRVG

Joshua 18 in the IRVH

Joshua 18 in the IRVK

Joshua 18 in the IRVM

Joshua 18 in the IRVM2

Joshua 18 in the IRVO

Joshua 18 in the IRVP

Joshua 18 in the IRVT

Joshua 18 in the IRVT2

Joshua 18 in the IRVU

Joshua 18 in the ISVN

Joshua 18 in the JSNT

Joshua 18 in the KAPI

Joshua 18 in the KBT1ETNIK

Joshua 18 in the KBV

Joshua 18 in the KJV

Joshua 18 in the KNFD

Joshua 18 in the LBA

Joshua 18 in the LBLA

Joshua 18 in the LNT

Joshua 18 in the LSV

Joshua 18 in the MAAL

Joshua 18 in the MBV

Joshua 18 in the MBV2

Joshua 18 in the MHNT

Joshua 18 in the MKNFD

Joshua 18 in the MNG

Joshua 18 in the MNT

Joshua 18 in the MNT2

Joshua 18 in the MRS1T

Joshua 18 in the NAA

Joshua 18 in the NASB

Joshua 18 in the NBLA

Joshua 18 in the NBS

Joshua 18 in the NBVTP

Joshua 18 in the NET2

Joshua 18 in the NIV11

Joshua 18 in the NNT

Joshua 18 in the NNT2

Joshua 18 in the NNT3

Joshua 18 in the PDDPT

Joshua 18 in the PFNT

Joshua 18 in the RMNT

Joshua 18 in the SBIAS

Joshua 18 in the SBIBS

Joshua 18 in the SBIBS2

Joshua 18 in the SBICS

Joshua 18 in the SBIDS

Joshua 18 in the SBIGS

Joshua 18 in the SBIHS

Joshua 18 in the SBIIS

Joshua 18 in the SBIIS2

Joshua 18 in the SBIIS3

Joshua 18 in the SBIKS

Joshua 18 in the SBIKS2

Joshua 18 in the SBIMS

Joshua 18 in the SBIOS

Joshua 18 in the SBIPS

Joshua 18 in the SBISS

Joshua 18 in the SBITS

Joshua 18 in the SBITS2

Joshua 18 in the SBITS3

Joshua 18 in the SBITS4

Joshua 18 in the SBIUS

Joshua 18 in the SBIVS

Joshua 18 in the SBT

Joshua 18 in the SBT1E

Joshua 18 in the SCHL

Joshua 18 in the SNT

Joshua 18 in the SUSU

Joshua 18 in the SUSU2

Joshua 18 in the SYNO

Joshua 18 in the TBIAOTANT

Joshua 18 in the TBT1E

Joshua 18 in the TBT1E2

Joshua 18 in the TFTIP

Joshua 18 in the TFTU

Joshua 18 in the TGNTATF3T

Joshua 18 in the THAI

Joshua 18 in the TNFD

Joshua 18 in the TNT

Joshua 18 in the TNTIK

Joshua 18 in the TNTIL

Joshua 18 in the TNTIN

Joshua 18 in the TNTIP

Joshua 18 in the TNTIZ

Joshua 18 in the TOMA

Joshua 18 in the TTENT

Joshua 18 in the UBG

Joshua 18 in the UGV

Joshua 18 in the UGV2

Joshua 18 in the UGV3

Joshua 18 in the VBL

Joshua 18 in the VDCC

Joshua 18 in the YALU

Joshua 18 in the YAPE

Joshua 18 in the YBVTP

Joshua 18 in the ZBP