Leviticus 10 (BOICB)

1 Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu. 2 Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu ONYENWE ANYỊ daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. 3 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ bu nʼobi mgbe o kwuru sị,“ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nsoka a ga-edo m nsọọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ,ka a ga-asọpụrụ m.’ ”Ma Erọn gbara nkịtị. 4 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.” 5 Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu. 6 Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe ONYENWE ANYỊ ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu. 7 Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke ONYENWE ANYỊ dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha. 8 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Erọn sị, 9 “Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa. 10 Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. 11 Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile ONYENWE ANYỊ nyere ha site nʼaka Mosis.” 12 Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere ONYENWE ANYỊ. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 13 Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere ONYENWE ANYỊ; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu. 14 Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu ONYENWE ANYỊ. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel. 15 Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu.” 16 Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha, 17 “Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu ONYENWE ANYỊ. 18 Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.” 19 Ma Erọn zara Mosis sị ya, “Lee, taa ka ha chụrụ aja mmehie na aja nsure ọkụ ha nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ma lee ụdị ihe dakwasịrị m. Ọ gaara atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ ma a sị na m riri anụ aja mmehie ndị a nʼụbọchị dị otu a?” 20 Mgbe Mosis nụrụ nke a, o nwere afọ ojuju nʼihi ọsịsa Erọn nyere.

In Other Versions

Leviticus 10 in the ANGEFD

Leviticus 10 in the ANTPNG2D

Leviticus 10 in the AS21

Leviticus 10 in the BAGH

Leviticus 10 in the BBPNG

Leviticus 10 in the BBT1E

Leviticus 10 in the BDS

Leviticus 10 in the BEV

Leviticus 10 in the BHAD

Leviticus 10 in the BIB

Leviticus 10 in the BLPT

Leviticus 10 in the BNT

Leviticus 10 in the BNTABOOT

Leviticus 10 in the BNTLV

Leviticus 10 in the BOATCB

Leviticus 10 in the BOATCB2

Leviticus 10 in the BOBCV

Leviticus 10 in the BOCNT

Leviticus 10 in the BOECS

Leviticus 10 in the BOGWICC

Leviticus 10 in the BOHCB

Leviticus 10 in the BOHCV

Leviticus 10 in the BOHLNT

Leviticus 10 in the BOHNTLTAL

Leviticus 10 in the BOILNTAP

Leviticus 10 in the BOITCV

Leviticus 10 in the BOKCV

Leviticus 10 in the BOKCV2

Leviticus 10 in the BOKHWOG

Leviticus 10 in the BOKSSV

Leviticus 10 in the BOLCB

Leviticus 10 in the BOLCB2

Leviticus 10 in the BOMCV

Leviticus 10 in the BONAV

Leviticus 10 in the BONCB

Leviticus 10 in the BONLT

Leviticus 10 in the BONUT2

Leviticus 10 in the BOPLNT

Leviticus 10 in the BOSCB

Leviticus 10 in the BOSNC

Leviticus 10 in the BOTLNT

Leviticus 10 in the BOVCB

Leviticus 10 in the BOYCB

Leviticus 10 in the BPBB

Leviticus 10 in the BPH

Leviticus 10 in the BSB

Leviticus 10 in the CCB

Leviticus 10 in the CUV

Leviticus 10 in the CUVS

Leviticus 10 in the DBT

Leviticus 10 in the DGDNT

Leviticus 10 in the DHNT

Leviticus 10 in the DNT

Leviticus 10 in the ELBE

Leviticus 10 in the EMTV

Leviticus 10 in the ESV

Leviticus 10 in the FBV

Leviticus 10 in the FEB

Leviticus 10 in the GGMNT

Leviticus 10 in the GNT

Leviticus 10 in the HARY

Leviticus 10 in the HNT

Leviticus 10 in the IRVA

Leviticus 10 in the IRVB

Leviticus 10 in the IRVG

Leviticus 10 in the IRVH

Leviticus 10 in the IRVK

Leviticus 10 in the IRVM

Leviticus 10 in the IRVM2

Leviticus 10 in the IRVO

Leviticus 10 in the IRVP

Leviticus 10 in the IRVT

Leviticus 10 in the IRVT2

Leviticus 10 in the IRVU

Leviticus 10 in the ISVN

Leviticus 10 in the JSNT

Leviticus 10 in the KAPI

Leviticus 10 in the KBT1ETNIK

Leviticus 10 in the KBV

Leviticus 10 in the KJV

Leviticus 10 in the KNFD

Leviticus 10 in the LBA

Leviticus 10 in the LBLA

Leviticus 10 in the LNT

Leviticus 10 in the LSV

Leviticus 10 in the MAAL

Leviticus 10 in the MBV

Leviticus 10 in the MBV2

Leviticus 10 in the MHNT

Leviticus 10 in the MKNFD

Leviticus 10 in the MNG

Leviticus 10 in the MNT

Leviticus 10 in the MNT2

Leviticus 10 in the MRS1T

Leviticus 10 in the NAA

Leviticus 10 in the NASB

Leviticus 10 in the NBLA

Leviticus 10 in the NBS

Leviticus 10 in the NBVTP

Leviticus 10 in the NET2

Leviticus 10 in the NIV11

Leviticus 10 in the NNT

Leviticus 10 in the NNT2

Leviticus 10 in the NNT3

Leviticus 10 in the PDDPT

Leviticus 10 in the PFNT

Leviticus 10 in the RMNT

Leviticus 10 in the SBIAS

Leviticus 10 in the SBIBS

Leviticus 10 in the SBIBS2

Leviticus 10 in the SBICS

Leviticus 10 in the SBIDS

Leviticus 10 in the SBIGS

Leviticus 10 in the SBIHS

Leviticus 10 in the SBIIS

Leviticus 10 in the SBIIS2

Leviticus 10 in the SBIIS3

Leviticus 10 in the SBIKS

Leviticus 10 in the SBIKS2

Leviticus 10 in the SBIMS

Leviticus 10 in the SBIOS

Leviticus 10 in the SBIPS

Leviticus 10 in the SBISS

Leviticus 10 in the SBITS

Leviticus 10 in the SBITS2

Leviticus 10 in the SBITS3

Leviticus 10 in the SBITS4

Leviticus 10 in the SBIUS

Leviticus 10 in the SBIVS

Leviticus 10 in the SBT

Leviticus 10 in the SBT1E

Leviticus 10 in the SCHL

Leviticus 10 in the SNT

Leviticus 10 in the SUSU

Leviticus 10 in the SUSU2

Leviticus 10 in the SYNO

Leviticus 10 in the TBIAOTANT

Leviticus 10 in the TBT1E

Leviticus 10 in the TBT1E2

Leviticus 10 in the TFTIP

Leviticus 10 in the TFTU

Leviticus 10 in the TGNTATF3T

Leviticus 10 in the THAI

Leviticus 10 in the TNFD

Leviticus 10 in the TNT

Leviticus 10 in the TNTIK

Leviticus 10 in the TNTIL

Leviticus 10 in the TNTIN

Leviticus 10 in the TNTIP

Leviticus 10 in the TNTIZ

Leviticus 10 in the TOMA

Leviticus 10 in the TTENT

Leviticus 10 in the UBG

Leviticus 10 in the UGV

Leviticus 10 in the UGV2

Leviticus 10 in the UGV3

Leviticus 10 in the VBL

Leviticus 10 in the VDCC

Leviticus 10 in the YALU

Leviticus 10 in the YAPE

Leviticus 10 in the YBVTP

Leviticus 10 in the ZBP