Matthew 1 (BOICB)
1 Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham. 2 Ebraham mụrụ Aịzik,Aịzik amụọ Jekọb,Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya. 3 Juda mụtara Perez na Zera site na Tama,Perez mụrụ Hezrọn,Hezrọn amụọ Aram. 4 Aram mụrụ Aminadab,Aminadab mụrụ Nashọn,Nashọn amụọ Salmọn. 5 Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab,Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut,Obed amụọ Jesi. 6 Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya. 7 Solomọn mụrụ Rehoboam,Rehoboam amụọ Abija,Abija amụọ Esa. 8 Esa mụrụ Jehoshafat,Jehoshafat amụọ Joram,Joram amụọ Ụzaịa. 9 Ụzaịa mụrụ Jotam,Jọtam amụọ Ehaz,Ehaz amụọ Hezekaya. 10 Hezekaya mụrụ Manase,Manase amụọ Emọn,Emọn amụọ Josaya. 11 Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. 12 Mgbe ha si Babilọn lọtaJekonaya mụrụ Shealtiel,Shealtiel amụọ Zerubabel. 13 Zerubabel mụrụ Abiud,Abiud amụọ Eliakịm,Eliakịm amụọ Azoa. 14 Azoa mụrụ Zadọk,Zadọk amụọ Akịm,Akịm amụọ Eliud. 15 Eliud mụrụ Elieza,Elieza amụọ Matan,Matan amụọ Jekọb. 16 Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 17 Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ. 18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22 Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23 “Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24 Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
In Other Versions
Matthew 1 in the ANGEFD
Matthew 1 in the ANTPNG2D
Matthew 1 in the AS21
Matthew 1 in the BAGH
Matthew 1 in the BBPNG
Matthew 1 in the BBT1E
Matthew 1 in the BDS
Matthew 1 in the BEV
Matthew 1 in the BHAD
Matthew 1 in the BIB
Matthew 1 in the BLPT
Matthew 1 in the BNT
Matthew 1 in the BNTABOOT
Matthew 1 in the BNTLV
Matthew 1 in the BOATCB
Matthew 1 in the BOATCB2
Matthew 1 in the BOBCV
Matthew 1 in the BOCNT
Matthew 1 in the BOECS
Matthew 1 in the BOGWICC
Matthew 1 in the BOHCB
Matthew 1 in the BOHCV
Matthew 1 in the BOHLNT
Matthew 1 in the BOHNTLTAL
Matthew 1 in the BOILNTAP
Matthew 1 in the BOITCV
Matthew 1 in the BOKCV
Matthew 1 in the BOKCV2
Matthew 1 in the BOKHWOG
Matthew 1 in the BOKSSV
Matthew 1 in the BOLCB
Matthew 1 in the BOLCB2
Matthew 1 in the BOMCV
Matthew 1 in the BONAV
Matthew 1 in the BONCB
Matthew 1 in the BONLT
Matthew 1 in the BONUT2
Matthew 1 in the BOPLNT
Matthew 1 in the BOSCB
Matthew 1 in the BOSNC
Matthew 1 in the BOTLNT
Matthew 1 in the BOVCB
Matthew 1 in the BOYCB
Matthew 1 in the BPBB
Matthew 1 in the BPH
Matthew 1 in the BSB
Matthew 1 in the CCB
Matthew 1 in the CUV
Matthew 1 in the CUVS
Matthew 1 in the DBT
Matthew 1 in the DGDNT
Matthew 1 in the DHNT
Matthew 1 in the DNT
Matthew 1 in the ELBE
Matthew 1 in the EMTV
Matthew 1 in the ESV
Matthew 1 in the FBV
Matthew 1 in the FEB
Matthew 1 in the GGMNT
Matthew 1 in the GNT
Matthew 1 in the HARY
Matthew 1 in the HNT
Matthew 1 in the IRVA
Matthew 1 in the IRVB
Matthew 1 in the IRVG
Matthew 1 in the IRVH
Matthew 1 in the IRVK
Matthew 1 in the IRVM
Matthew 1 in the IRVM2
Matthew 1 in the IRVO
Matthew 1 in the IRVP
Matthew 1 in the IRVT
Matthew 1 in the IRVT2
Matthew 1 in the IRVU
Matthew 1 in the ISVN
Matthew 1 in the JSNT
Matthew 1 in the KAPI
Matthew 1 in the KBT1ETNIK
Matthew 1 in the KBV
Matthew 1 in the KJV
Matthew 1 in the KNFD
Matthew 1 in the LBA
Matthew 1 in the LBLA
Matthew 1 in the LNT
Matthew 1 in the LSV
Matthew 1 in the MAAL
Matthew 1 in the MBV
Matthew 1 in the MBV2
Matthew 1 in the MHNT
Matthew 1 in the MKNFD
Matthew 1 in the MNG
Matthew 1 in the MNT
Matthew 1 in the MNT2
Matthew 1 in the MRS1T
Matthew 1 in the NAA
Matthew 1 in the NASB
Matthew 1 in the NBLA
Matthew 1 in the NBS
Matthew 1 in the NBVTP
Matthew 1 in the NET2
Matthew 1 in the NIV11
Matthew 1 in the NNT
Matthew 1 in the NNT2
Matthew 1 in the NNT3
Matthew 1 in the PDDPT
Matthew 1 in the PFNT
Matthew 1 in the RMNT
Matthew 1 in the SBIAS
Matthew 1 in the SBIBS
Matthew 1 in the SBIBS2
Matthew 1 in the SBICS
Matthew 1 in the SBIDS
Matthew 1 in the SBIGS
Matthew 1 in the SBIHS
Matthew 1 in the SBIIS
Matthew 1 in the SBIIS2
Matthew 1 in the SBIIS3
Matthew 1 in the SBIKS
Matthew 1 in the SBIKS2
Matthew 1 in the SBIMS
Matthew 1 in the SBIOS
Matthew 1 in the SBIPS
Matthew 1 in the SBISS
Matthew 1 in the SBITS
Matthew 1 in the SBITS2
Matthew 1 in the SBITS3
Matthew 1 in the SBITS4
Matthew 1 in the SBIUS
Matthew 1 in the SBIVS
Matthew 1 in the SBT
Matthew 1 in the SBT1E
Matthew 1 in the SCHL
Matthew 1 in the SNT
Matthew 1 in the SUSU
Matthew 1 in the SUSU2
Matthew 1 in the SYNO
Matthew 1 in the TBIAOTANT
Matthew 1 in the TBT1E
Matthew 1 in the TBT1E2
Matthew 1 in the TFTIP
Matthew 1 in the TFTU
Matthew 1 in the TGNTATF3T
Matthew 1 in the THAI
Matthew 1 in the TNFD
Matthew 1 in the TNT
Matthew 1 in the TNTIK
Matthew 1 in the TNTIL
Matthew 1 in the TNTIN
Matthew 1 in the TNTIP
Matthew 1 in the TNTIZ
Matthew 1 in the TOMA
Matthew 1 in the TTENT
Matthew 1 in the UBG
Matthew 1 in the UGV
Matthew 1 in the UGV2
Matthew 1 in the UGV3
Matthew 1 in the VBL
Matthew 1 in the VDCC
Matthew 1 in the YALU
Matthew 1 in the YAPE
Matthew 1 in the YBVTP
Matthew 1 in the ZBP