Matthew 11 (BOICB)

1 Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma. 2 Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya. 3 Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?” 4 Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5 Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6 Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 7 Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 8 Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze. 9 Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma. 10 Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 11 Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12 Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13 Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14 Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ. 16 “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha, 17 “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’ 18 Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 19 Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.” 20 Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. 21 “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. 22 Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. 23 Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. 24 Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.” 25 Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. 26 E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a. 27 “Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28 “Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29 Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30 Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

In Other Versions

Matthew 11 in the ANGEFD

Matthew 11 in the ANTPNG2D

Matthew 11 in the AS21

Matthew 11 in the BAGH

Matthew 11 in the BBPNG

Matthew 11 in the BBT1E

Matthew 11 in the BDS

Matthew 11 in the BEV

Matthew 11 in the BHAD

Matthew 11 in the BIB

Matthew 11 in the BLPT

Matthew 11 in the BNT

Matthew 11 in the BNTABOOT

Matthew 11 in the BNTLV

Matthew 11 in the BOATCB

Matthew 11 in the BOATCB2

Matthew 11 in the BOBCV

Matthew 11 in the BOCNT

Matthew 11 in the BOECS

Matthew 11 in the BOGWICC

Matthew 11 in the BOHCB

Matthew 11 in the BOHCV

Matthew 11 in the BOHLNT

Matthew 11 in the BOHNTLTAL

Matthew 11 in the BOILNTAP

Matthew 11 in the BOITCV

Matthew 11 in the BOKCV

Matthew 11 in the BOKCV2

Matthew 11 in the BOKHWOG

Matthew 11 in the BOKSSV

Matthew 11 in the BOLCB

Matthew 11 in the BOLCB2

Matthew 11 in the BOMCV

Matthew 11 in the BONAV

Matthew 11 in the BONCB

Matthew 11 in the BONLT

Matthew 11 in the BONUT2

Matthew 11 in the BOPLNT

Matthew 11 in the BOSCB

Matthew 11 in the BOSNC

Matthew 11 in the BOTLNT

Matthew 11 in the BOVCB

Matthew 11 in the BOYCB

Matthew 11 in the BPBB

Matthew 11 in the BPH

Matthew 11 in the BSB

Matthew 11 in the CCB

Matthew 11 in the CUV

Matthew 11 in the CUVS

Matthew 11 in the DBT

Matthew 11 in the DGDNT

Matthew 11 in the DHNT

Matthew 11 in the DNT

Matthew 11 in the ELBE

Matthew 11 in the EMTV

Matthew 11 in the ESV

Matthew 11 in the FBV

Matthew 11 in the FEB

Matthew 11 in the GGMNT

Matthew 11 in the GNT

Matthew 11 in the HARY

Matthew 11 in the HNT

Matthew 11 in the IRVA

Matthew 11 in the IRVB

Matthew 11 in the IRVG

Matthew 11 in the IRVH

Matthew 11 in the IRVK

Matthew 11 in the IRVM

Matthew 11 in the IRVM2

Matthew 11 in the IRVO

Matthew 11 in the IRVP

Matthew 11 in the IRVT

Matthew 11 in the IRVT2

Matthew 11 in the IRVU

Matthew 11 in the ISVN

Matthew 11 in the JSNT

Matthew 11 in the KAPI

Matthew 11 in the KBT1ETNIK

Matthew 11 in the KBV

Matthew 11 in the KJV

Matthew 11 in the KNFD

Matthew 11 in the LBA

Matthew 11 in the LBLA

Matthew 11 in the LNT

Matthew 11 in the LSV

Matthew 11 in the MAAL

Matthew 11 in the MBV

Matthew 11 in the MBV2

Matthew 11 in the MHNT

Matthew 11 in the MKNFD

Matthew 11 in the MNG

Matthew 11 in the MNT

Matthew 11 in the MNT2

Matthew 11 in the MRS1T

Matthew 11 in the NAA

Matthew 11 in the NASB

Matthew 11 in the NBLA

Matthew 11 in the NBS

Matthew 11 in the NBVTP

Matthew 11 in the NET2

Matthew 11 in the NIV11

Matthew 11 in the NNT

Matthew 11 in the NNT2

Matthew 11 in the NNT3

Matthew 11 in the PDDPT

Matthew 11 in the PFNT

Matthew 11 in the RMNT

Matthew 11 in the SBIAS

Matthew 11 in the SBIBS

Matthew 11 in the SBIBS2

Matthew 11 in the SBICS

Matthew 11 in the SBIDS

Matthew 11 in the SBIGS

Matthew 11 in the SBIHS

Matthew 11 in the SBIIS

Matthew 11 in the SBIIS2

Matthew 11 in the SBIIS3

Matthew 11 in the SBIKS

Matthew 11 in the SBIKS2

Matthew 11 in the SBIMS

Matthew 11 in the SBIOS

Matthew 11 in the SBIPS

Matthew 11 in the SBISS

Matthew 11 in the SBITS

Matthew 11 in the SBITS2

Matthew 11 in the SBITS3

Matthew 11 in the SBITS4

Matthew 11 in the SBIUS

Matthew 11 in the SBIVS

Matthew 11 in the SBT

Matthew 11 in the SBT1E

Matthew 11 in the SCHL

Matthew 11 in the SNT

Matthew 11 in the SUSU

Matthew 11 in the SUSU2

Matthew 11 in the SYNO

Matthew 11 in the TBIAOTANT

Matthew 11 in the TBT1E

Matthew 11 in the TBT1E2

Matthew 11 in the TFTIP

Matthew 11 in the TFTU

Matthew 11 in the TGNTATF3T

Matthew 11 in the THAI

Matthew 11 in the TNFD

Matthew 11 in the TNT

Matthew 11 in the TNTIK

Matthew 11 in the TNTIL

Matthew 11 in the TNTIN

Matthew 11 in the TNTIP

Matthew 11 in the TNTIZ

Matthew 11 in the TOMA

Matthew 11 in the TTENT

Matthew 11 in the UBG

Matthew 11 in the UGV

Matthew 11 in the UGV2

Matthew 11 in the UGV3

Matthew 11 in the VBL

Matthew 11 in the VDCC

Matthew 11 in the YALU

Matthew 11 in the YAPE

Matthew 11 in the YBVTP

Matthew 11 in the ZBP