Matthew 9 (BOICB)

1 Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya. 2 Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.” 3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.” 4 Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? 5 Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’? 6 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!” 7 Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya. 8 Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a. 9 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya. 10 Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. 11 Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” 12 Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa. 13 Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.” 14 Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?” 15 Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. 16 “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. 17 Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.” 18 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.” 19 Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha. 20 Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. 21 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.” 22 Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ. 23 Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja. 24 Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị. 25 Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ. 26 Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ. 27 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!” 28 Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?”Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.” 29 O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.” 30 Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.” 31 Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ. 32 Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya. 33 Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.” 34 Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.” 35 Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche. 36 Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. 37 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole. 38 Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”

In Other Versions

Matthew 9 in the ANGEFD

Matthew 9 in the ANTPNG2D

Matthew 9 in the AS21

Matthew 9 in the BAGH

Matthew 9 in the BBPNG

Matthew 9 in the BBT1E

Matthew 9 in the BDS

Matthew 9 in the BEV

Matthew 9 in the BHAD

Matthew 9 in the BIB

Matthew 9 in the BLPT

Matthew 9 in the BNT

Matthew 9 in the BNTABOOT

Matthew 9 in the BNTLV

Matthew 9 in the BOATCB

Matthew 9 in the BOATCB2

Matthew 9 in the BOBCV

Matthew 9 in the BOCNT

Matthew 9 in the BOECS

Matthew 9 in the BOGWICC

Matthew 9 in the BOHCB

Matthew 9 in the BOHCV

Matthew 9 in the BOHLNT

Matthew 9 in the BOHNTLTAL

Matthew 9 in the BOILNTAP

Matthew 9 in the BOITCV

Matthew 9 in the BOKCV

Matthew 9 in the BOKCV2

Matthew 9 in the BOKHWOG

Matthew 9 in the BOKSSV

Matthew 9 in the BOLCB

Matthew 9 in the BOLCB2

Matthew 9 in the BOMCV

Matthew 9 in the BONAV

Matthew 9 in the BONCB

Matthew 9 in the BONLT

Matthew 9 in the BONUT2

Matthew 9 in the BOPLNT

Matthew 9 in the BOSCB

Matthew 9 in the BOSNC

Matthew 9 in the BOTLNT

Matthew 9 in the BOVCB

Matthew 9 in the BOYCB

Matthew 9 in the BPBB

Matthew 9 in the BPH

Matthew 9 in the BSB

Matthew 9 in the CCB

Matthew 9 in the CUV

Matthew 9 in the CUVS

Matthew 9 in the DBT

Matthew 9 in the DGDNT

Matthew 9 in the DHNT

Matthew 9 in the DNT

Matthew 9 in the ELBE

Matthew 9 in the EMTV

Matthew 9 in the ESV

Matthew 9 in the FBV

Matthew 9 in the FEB

Matthew 9 in the GGMNT

Matthew 9 in the GNT

Matthew 9 in the HARY

Matthew 9 in the HNT

Matthew 9 in the IRVA

Matthew 9 in the IRVB

Matthew 9 in the IRVG

Matthew 9 in the IRVH

Matthew 9 in the IRVK

Matthew 9 in the IRVM

Matthew 9 in the IRVM2

Matthew 9 in the IRVO

Matthew 9 in the IRVP

Matthew 9 in the IRVT

Matthew 9 in the IRVT2

Matthew 9 in the IRVU

Matthew 9 in the ISVN

Matthew 9 in the JSNT

Matthew 9 in the KAPI

Matthew 9 in the KBT1ETNIK

Matthew 9 in the KBV

Matthew 9 in the KJV

Matthew 9 in the KNFD

Matthew 9 in the LBA

Matthew 9 in the LBLA

Matthew 9 in the LNT

Matthew 9 in the LSV

Matthew 9 in the MAAL

Matthew 9 in the MBV

Matthew 9 in the MBV2

Matthew 9 in the MHNT

Matthew 9 in the MKNFD

Matthew 9 in the MNG

Matthew 9 in the MNT

Matthew 9 in the MNT2

Matthew 9 in the MRS1T

Matthew 9 in the NAA

Matthew 9 in the NASB

Matthew 9 in the NBLA

Matthew 9 in the NBS

Matthew 9 in the NBVTP

Matthew 9 in the NET2

Matthew 9 in the NIV11

Matthew 9 in the NNT

Matthew 9 in the NNT2

Matthew 9 in the NNT3

Matthew 9 in the PDDPT

Matthew 9 in the PFNT

Matthew 9 in the RMNT

Matthew 9 in the SBIAS

Matthew 9 in the SBIBS

Matthew 9 in the SBIBS2

Matthew 9 in the SBICS

Matthew 9 in the SBIDS

Matthew 9 in the SBIGS

Matthew 9 in the SBIHS

Matthew 9 in the SBIIS

Matthew 9 in the SBIIS2

Matthew 9 in the SBIIS3

Matthew 9 in the SBIKS

Matthew 9 in the SBIKS2

Matthew 9 in the SBIMS

Matthew 9 in the SBIOS

Matthew 9 in the SBIPS

Matthew 9 in the SBISS

Matthew 9 in the SBITS

Matthew 9 in the SBITS2

Matthew 9 in the SBITS3

Matthew 9 in the SBITS4

Matthew 9 in the SBIUS

Matthew 9 in the SBIVS

Matthew 9 in the SBT

Matthew 9 in the SBT1E

Matthew 9 in the SCHL

Matthew 9 in the SNT

Matthew 9 in the SUSU

Matthew 9 in the SUSU2

Matthew 9 in the SYNO

Matthew 9 in the TBIAOTANT

Matthew 9 in the TBT1E

Matthew 9 in the TBT1E2

Matthew 9 in the TFTIP

Matthew 9 in the TFTU

Matthew 9 in the TGNTATF3T

Matthew 9 in the THAI

Matthew 9 in the TNFD

Matthew 9 in the TNT

Matthew 9 in the TNTIK

Matthew 9 in the TNTIL

Matthew 9 in the TNTIN

Matthew 9 in the TNTIP

Matthew 9 in the TNTIZ

Matthew 9 in the TOMA

Matthew 9 in the TTENT

Matthew 9 in the UBG

Matthew 9 in the UGV

Matthew 9 in the UGV2

Matthew 9 in the UGV3

Matthew 9 in the VBL

Matthew 9 in the VDCC

Matthew 9 in the YALU

Matthew 9 in the YAPE

Matthew 9 in the YBVTP

Matthew 9 in the ZBP