Mark 14 (BOICB)

1 Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. 2 Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.” 3 Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi. 4 Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a? 5 A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike. 6 Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ. 7 Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. 8 O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya. 9 Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.” 10 Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka. 11 Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha. 12 Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?” 13 O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. 14 Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? 15 Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” 16 Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. 17 Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. 18 Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” 19 Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?” 20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. 21 Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 22 Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.” 23 Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ. 24 Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. 25 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.” 26 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. 27 Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’ 28 Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.” 29 Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.” 30 Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 31 O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru. 32 Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” 33 Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. 34 Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.” 35 Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. 36 O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” 37 Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa? 38 Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.” 39 Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 40 Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya. 41 Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 42 Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.” 43 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 44 Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” 45 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 46 Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47 Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 48 Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m? 49 Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.” 50 Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga. 51 Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya, 52 ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga. 53 Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54 Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55 Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56 Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu. 57 Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58 “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ” 59 Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu. 60 Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?” 61 Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla.Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?” 62 Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” 63 Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ? 64 Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?”Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” 65 Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe. 66 Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ. 67 Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.” 68 Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 69 Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.” 70 Ma ọ gọkwara agọ ọzọ.Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.” 71 Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.” 72 Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.

In Other Versions

Mark 14 in the ANGEFD

Mark 14 in the ANTPNG2D

Mark 14 in the AS21

Mark 14 in the BAGH

Mark 14 in the BBPNG

Mark 14 in the BBT1E

Mark 14 in the BDS

Mark 14 in the BEV

Mark 14 in the BHAD

Mark 14 in the BIB

Mark 14 in the BLPT

Mark 14 in the BNT

Mark 14 in the BNTABOOT

Mark 14 in the BNTLV

Mark 14 in the BOATCB

Mark 14 in the BOATCB2

Mark 14 in the BOBCV

Mark 14 in the BOCNT

Mark 14 in the BOECS

Mark 14 in the BOGWICC

Mark 14 in the BOHCB

Mark 14 in the BOHCV

Mark 14 in the BOHLNT

Mark 14 in the BOHNTLTAL

Mark 14 in the BOILNTAP

Mark 14 in the BOITCV

Mark 14 in the BOKCV

Mark 14 in the BOKCV2

Mark 14 in the BOKHWOG

Mark 14 in the BOKSSV

Mark 14 in the BOLCB

Mark 14 in the BOLCB2

Mark 14 in the BOMCV

Mark 14 in the BONAV

Mark 14 in the BONCB

Mark 14 in the BONLT

Mark 14 in the BONUT2

Mark 14 in the BOPLNT

Mark 14 in the BOSCB

Mark 14 in the BOSNC

Mark 14 in the BOTLNT

Mark 14 in the BOVCB

Mark 14 in the BOYCB

Mark 14 in the BPBB

Mark 14 in the BPH

Mark 14 in the BSB

Mark 14 in the CCB

Mark 14 in the CUV

Mark 14 in the CUVS

Mark 14 in the DBT

Mark 14 in the DGDNT

Mark 14 in the DHNT

Mark 14 in the DNT

Mark 14 in the ELBE

Mark 14 in the EMTV

Mark 14 in the ESV

Mark 14 in the FBV

Mark 14 in the FEB

Mark 14 in the GGMNT

Mark 14 in the GNT

Mark 14 in the HARY

Mark 14 in the HNT

Mark 14 in the IRVA

Mark 14 in the IRVB

Mark 14 in the IRVG

Mark 14 in the IRVH

Mark 14 in the IRVK

Mark 14 in the IRVM

Mark 14 in the IRVM2

Mark 14 in the IRVO

Mark 14 in the IRVP

Mark 14 in the IRVT

Mark 14 in the IRVT2

Mark 14 in the IRVU

Mark 14 in the ISVN

Mark 14 in the JSNT

Mark 14 in the KAPI

Mark 14 in the KBT1ETNIK

Mark 14 in the KBV

Mark 14 in the KJV

Mark 14 in the KNFD

Mark 14 in the LBA

Mark 14 in the LBLA

Mark 14 in the LNT

Mark 14 in the LSV

Mark 14 in the MAAL

Mark 14 in the MBV

Mark 14 in the MBV2

Mark 14 in the MHNT

Mark 14 in the MKNFD

Mark 14 in the MNG

Mark 14 in the MNT

Mark 14 in the MNT2

Mark 14 in the MRS1T

Mark 14 in the NAA

Mark 14 in the NASB

Mark 14 in the NBLA

Mark 14 in the NBS

Mark 14 in the NBVTP

Mark 14 in the NET2

Mark 14 in the NIV11

Mark 14 in the NNT

Mark 14 in the NNT2

Mark 14 in the NNT3

Mark 14 in the PDDPT

Mark 14 in the PFNT

Mark 14 in the RMNT

Mark 14 in the SBIAS

Mark 14 in the SBIBS

Mark 14 in the SBIBS2

Mark 14 in the SBICS

Mark 14 in the SBIDS

Mark 14 in the SBIGS

Mark 14 in the SBIHS

Mark 14 in the SBIIS

Mark 14 in the SBIIS2

Mark 14 in the SBIIS3

Mark 14 in the SBIKS

Mark 14 in the SBIKS2

Mark 14 in the SBIMS

Mark 14 in the SBIOS

Mark 14 in the SBIPS

Mark 14 in the SBISS

Mark 14 in the SBITS

Mark 14 in the SBITS2

Mark 14 in the SBITS3

Mark 14 in the SBITS4

Mark 14 in the SBIUS

Mark 14 in the SBIVS

Mark 14 in the SBT

Mark 14 in the SBT1E

Mark 14 in the SCHL

Mark 14 in the SNT

Mark 14 in the SUSU

Mark 14 in the SUSU2

Mark 14 in the SYNO

Mark 14 in the TBIAOTANT

Mark 14 in the TBT1E

Mark 14 in the TBT1E2

Mark 14 in the TFTIP

Mark 14 in the TFTU

Mark 14 in the TGNTATF3T

Mark 14 in the THAI

Mark 14 in the TNFD

Mark 14 in the TNT

Mark 14 in the TNTIK

Mark 14 in the TNTIL

Mark 14 in the TNTIN

Mark 14 in the TNTIP

Mark 14 in the TNTIZ

Mark 14 in the TOMA

Mark 14 in the TTENT

Mark 14 in the UBG

Mark 14 in the UGV

Mark 14 in the UGV2

Mark 14 in the UGV3

Mark 14 in the VBL

Mark 14 in the VDCC

Mark 14 in the YALU

Mark 14 in the YAPE

Mark 14 in the YBVTP

Mark 14 in the ZBP