Nehemiah 8 (BOICB)

1 Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke ONYENWE ANYỊ nyere ndị Izrel nʼiwu. 2 Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara. 3 O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ. 4 Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam. 5 Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya. 6 Mgbe ahụ, Ezra gọziri ONYENWE ANYỊ Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ. 7 Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ. 8 Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma. 9 Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ. 10 Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ ONYENWE ANYỊ bụ ike unu.” 11 Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.” 12 Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha. 13 Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ. 14 Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ. 15 O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.” 16 Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem. 17 Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a. 18 Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.

In Other Versions

Nehemiah 8 in the ANGEFD

Nehemiah 8 in the ANTPNG2D

Nehemiah 8 in the AS21

Nehemiah 8 in the BAGH

Nehemiah 8 in the BBPNG

Nehemiah 8 in the BBT1E

Nehemiah 8 in the BDS

Nehemiah 8 in the BEV

Nehemiah 8 in the BHAD

Nehemiah 8 in the BIB

Nehemiah 8 in the BLPT

Nehemiah 8 in the BNT

Nehemiah 8 in the BNTABOOT

Nehemiah 8 in the BNTLV

Nehemiah 8 in the BOATCB

Nehemiah 8 in the BOATCB2

Nehemiah 8 in the BOBCV

Nehemiah 8 in the BOCNT

Nehemiah 8 in the BOECS

Nehemiah 8 in the BOGWICC

Nehemiah 8 in the BOHCB

Nehemiah 8 in the BOHCV

Nehemiah 8 in the BOHLNT

Nehemiah 8 in the BOHNTLTAL

Nehemiah 8 in the BOILNTAP

Nehemiah 8 in the BOITCV

Nehemiah 8 in the BOKCV

Nehemiah 8 in the BOKCV2

Nehemiah 8 in the BOKHWOG

Nehemiah 8 in the BOKSSV

Nehemiah 8 in the BOLCB

Nehemiah 8 in the BOLCB2

Nehemiah 8 in the BOMCV

Nehemiah 8 in the BONAV

Nehemiah 8 in the BONCB

Nehemiah 8 in the BONLT

Nehemiah 8 in the BONUT2

Nehemiah 8 in the BOPLNT

Nehemiah 8 in the BOSCB

Nehemiah 8 in the BOSNC

Nehemiah 8 in the BOTLNT

Nehemiah 8 in the BOVCB

Nehemiah 8 in the BOYCB

Nehemiah 8 in the BPBB

Nehemiah 8 in the BPH

Nehemiah 8 in the BSB

Nehemiah 8 in the CCB

Nehemiah 8 in the CUV

Nehemiah 8 in the CUVS

Nehemiah 8 in the DBT

Nehemiah 8 in the DGDNT

Nehemiah 8 in the DHNT

Nehemiah 8 in the DNT

Nehemiah 8 in the ELBE

Nehemiah 8 in the EMTV

Nehemiah 8 in the ESV

Nehemiah 8 in the FBV

Nehemiah 8 in the FEB

Nehemiah 8 in the GGMNT

Nehemiah 8 in the GNT

Nehemiah 8 in the HARY

Nehemiah 8 in the HNT

Nehemiah 8 in the IRVA

Nehemiah 8 in the IRVB

Nehemiah 8 in the IRVG

Nehemiah 8 in the IRVH

Nehemiah 8 in the IRVK

Nehemiah 8 in the IRVM

Nehemiah 8 in the IRVM2

Nehemiah 8 in the IRVO

Nehemiah 8 in the IRVP

Nehemiah 8 in the IRVT

Nehemiah 8 in the IRVT2

Nehemiah 8 in the IRVU

Nehemiah 8 in the ISVN

Nehemiah 8 in the JSNT

Nehemiah 8 in the KAPI

Nehemiah 8 in the KBT1ETNIK

Nehemiah 8 in the KBV

Nehemiah 8 in the KJV

Nehemiah 8 in the KNFD

Nehemiah 8 in the LBA

Nehemiah 8 in the LBLA

Nehemiah 8 in the LNT

Nehemiah 8 in the LSV

Nehemiah 8 in the MAAL

Nehemiah 8 in the MBV

Nehemiah 8 in the MBV2

Nehemiah 8 in the MHNT

Nehemiah 8 in the MKNFD

Nehemiah 8 in the MNG

Nehemiah 8 in the MNT

Nehemiah 8 in the MNT2

Nehemiah 8 in the MRS1T

Nehemiah 8 in the NAA

Nehemiah 8 in the NASB

Nehemiah 8 in the NBLA

Nehemiah 8 in the NBS

Nehemiah 8 in the NBVTP

Nehemiah 8 in the NET2

Nehemiah 8 in the NIV11

Nehemiah 8 in the NNT

Nehemiah 8 in the NNT2

Nehemiah 8 in the NNT3

Nehemiah 8 in the PDDPT

Nehemiah 8 in the PFNT

Nehemiah 8 in the RMNT

Nehemiah 8 in the SBIAS

Nehemiah 8 in the SBIBS

Nehemiah 8 in the SBIBS2

Nehemiah 8 in the SBICS

Nehemiah 8 in the SBIDS

Nehemiah 8 in the SBIGS

Nehemiah 8 in the SBIHS

Nehemiah 8 in the SBIIS

Nehemiah 8 in the SBIIS2

Nehemiah 8 in the SBIIS3

Nehemiah 8 in the SBIKS

Nehemiah 8 in the SBIKS2

Nehemiah 8 in the SBIMS

Nehemiah 8 in the SBIOS

Nehemiah 8 in the SBIPS

Nehemiah 8 in the SBISS

Nehemiah 8 in the SBITS

Nehemiah 8 in the SBITS2

Nehemiah 8 in the SBITS3

Nehemiah 8 in the SBITS4

Nehemiah 8 in the SBIUS

Nehemiah 8 in the SBIVS

Nehemiah 8 in the SBT

Nehemiah 8 in the SBT1E

Nehemiah 8 in the SCHL

Nehemiah 8 in the SNT

Nehemiah 8 in the SUSU

Nehemiah 8 in the SUSU2

Nehemiah 8 in the SYNO

Nehemiah 8 in the TBIAOTANT

Nehemiah 8 in the TBT1E

Nehemiah 8 in the TBT1E2

Nehemiah 8 in the TFTIP

Nehemiah 8 in the TFTU

Nehemiah 8 in the TGNTATF3T

Nehemiah 8 in the THAI

Nehemiah 8 in the TNFD

Nehemiah 8 in the TNT

Nehemiah 8 in the TNTIK

Nehemiah 8 in the TNTIL

Nehemiah 8 in the TNTIN

Nehemiah 8 in the TNTIP

Nehemiah 8 in the TNTIZ

Nehemiah 8 in the TOMA

Nehemiah 8 in the TTENT

Nehemiah 8 in the UBG

Nehemiah 8 in the UGV

Nehemiah 8 in the UGV2

Nehemiah 8 in the UGV3

Nehemiah 8 in the VBL

Nehemiah 8 in the VDCC

Nehemiah 8 in the YALU

Nehemiah 8 in the YAPE

Nehemiah 8 in the YBVTP

Nehemiah 8 in the ZBP