Numbers 20 (BOICB)

1 Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya. 2 Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn. 3 Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. 4 Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke ONYENWE ANYỊ nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a? 5 Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.” 6 Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube ONYENWE ANYỊ anya. 7 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 8 “Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.” 9 Ya mere Mosis sitere nʼihu ONYENWE ANYỊ weere mkpara ahụ dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere ya si dị. 10 Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” 11 Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri. 12 Ma ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.” 13 A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro ONYENWE ANYỊ iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya. 14 Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya,“Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị. 15 Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ. 16 Ma mgbe anyị tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt.“Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị. 17 Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.” 18 Ma eze Edọm zara sị,“Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.” 19 Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya,“Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.” 20 Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị,“Unu agaghị esite nʼala gabiga.”Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha. 21 Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ. 22 Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor. 23 Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 24 “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba. 25 Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor. 26 Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.” 27 Ya mere Mosis mere dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya. 28 Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi. 29 Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.

In Other Versions

Numbers 20 in the ANGEFD

Numbers 20 in the ANTPNG2D

Numbers 20 in the AS21

Numbers 20 in the BAGH

Numbers 20 in the BBPNG

Numbers 20 in the BBT1E

Numbers 20 in the BDS

Numbers 20 in the BEV

Numbers 20 in the BHAD

Numbers 20 in the BIB

Numbers 20 in the BLPT

Numbers 20 in the BNT

Numbers 20 in the BNTABOOT

Numbers 20 in the BNTLV

Numbers 20 in the BOATCB

Numbers 20 in the BOATCB2

Numbers 20 in the BOBCV

Numbers 20 in the BOCNT

Numbers 20 in the BOECS

Numbers 20 in the BOGWICC

Numbers 20 in the BOHCB

Numbers 20 in the BOHCV

Numbers 20 in the BOHLNT

Numbers 20 in the BOHNTLTAL

Numbers 20 in the BOILNTAP

Numbers 20 in the BOITCV

Numbers 20 in the BOKCV

Numbers 20 in the BOKCV2

Numbers 20 in the BOKHWOG

Numbers 20 in the BOKSSV

Numbers 20 in the BOLCB

Numbers 20 in the BOLCB2

Numbers 20 in the BOMCV

Numbers 20 in the BONAV

Numbers 20 in the BONCB

Numbers 20 in the BONLT

Numbers 20 in the BONUT2

Numbers 20 in the BOPLNT

Numbers 20 in the BOSCB

Numbers 20 in the BOSNC

Numbers 20 in the BOTLNT

Numbers 20 in the BOVCB

Numbers 20 in the BOYCB

Numbers 20 in the BPBB

Numbers 20 in the BPH

Numbers 20 in the BSB

Numbers 20 in the CCB

Numbers 20 in the CUV

Numbers 20 in the CUVS

Numbers 20 in the DBT

Numbers 20 in the DGDNT

Numbers 20 in the DHNT

Numbers 20 in the DNT

Numbers 20 in the ELBE

Numbers 20 in the EMTV

Numbers 20 in the ESV

Numbers 20 in the FBV

Numbers 20 in the FEB

Numbers 20 in the GGMNT

Numbers 20 in the GNT

Numbers 20 in the HARY

Numbers 20 in the HNT

Numbers 20 in the IRVA

Numbers 20 in the IRVB

Numbers 20 in the IRVG

Numbers 20 in the IRVH

Numbers 20 in the IRVK

Numbers 20 in the IRVM

Numbers 20 in the IRVM2

Numbers 20 in the IRVO

Numbers 20 in the IRVP

Numbers 20 in the IRVT

Numbers 20 in the IRVT2

Numbers 20 in the IRVU

Numbers 20 in the ISVN

Numbers 20 in the JSNT

Numbers 20 in the KAPI

Numbers 20 in the KBT1ETNIK

Numbers 20 in the KBV

Numbers 20 in the KJV

Numbers 20 in the KNFD

Numbers 20 in the LBA

Numbers 20 in the LBLA

Numbers 20 in the LNT

Numbers 20 in the LSV

Numbers 20 in the MAAL

Numbers 20 in the MBV

Numbers 20 in the MBV2

Numbers 20 in the MHNT

Numbers 20 in the MKNFD

Numbers 20 in the MNG

Numbers 20 in the MNT

Numbers 20 in the MNT2

Numbers 20 in the MRS1T

Numbers 20 in the NAA

Numbers 20 in the NASB

Numbers 20 in the NBLA

Numbers 20 in the NBS

Numbers 20 in the NBVTP

Numbers 20 in the NET2

Numbers 20 in the NIV11

Numbers 20 in the NNT

Numbers 20 in the NNT2

Numbers 20 in the NNT3

Numbers 20 in the PDDPT

Numbers 20 in the PFNT

Numbers 20 in the RMNT

Numbers 20 in the SBIAS

Numbers 20 in the SBIBS

Numbers 20 in the SBIBS2

Numbers 20 in the SBICS

Numbers 20 in the SBIDS

Numbers 20 in the SBIGS

Numbers 20 in the SBIHS

Numbers 20 in the SBIIS

Numbers 20 in the SBIIS2

Numbers 20 in the SBIIS3

Numbers 20 in the SBIKS

Numbers 20 in the SBIKS2

Numbers 20 in the SBIMS

Numbers 20 in the SBIOS

Numbers 20 in the SBIPS

Numbers 20 in the SBISS

Numbers 20 in the SBITS

Numbers 20 in the SBITS2

Numbers 20 in the SBITS3

Numbers 20 in the SBITS4

Numbers 20 in the SBIUS

Numbers 20 in the SBIVS

Numbers 20 in the SBT

Numbers 20 in the SBT1E

Numbers 20 in the SCHL

Numbers 20 in the SNT

Numbers 20 in the SUSU

Numbers 20 in the SUSU2

Numbers 20 in the SYNO

Numbers 20 in the TBIAOTANT

Numbers 20 in the TBT1E

Numbers 20 in the TBT1E2

Numbers 20 in the TFTIP

Numbers 20 in the TFTU

Numbers 20 in the TGNTATF3T

Numbers 20 in the THAI

Numbers 20 in the TNFD

Numbers 20 in the TNT

Numbers 20 in the TNTIK

Numbers 20 in the TNTIL

Numbers 20 in the TNTIN

Numbers 20 in the TNTIP

Numbers 20 in the TNTIZ

Numbers 20 in the TOMA

Numbers 20 in the TTENT

Numbers 20 in the UBG

Numbers 20 in the UGV

Numbers 20 in the UGV2

Numbers 20 in the UGV3

Numbers 20 in the VBL

Numbers 20 in the VDCC

Numbers 20 in the YALU

Numbers 20 in the YAPE

Numbers 20 in the YBVTP

Numbers 20 in the ZBP