Numbers 24 (BOICB)

1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị ONYENWE ANYỊ ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara. 2 Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3 O buru amụma ndị a sị,“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chinekeonye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 5 “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6 “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,dịka osisi aloos nke ONYENWE ANYỊ kụrụ,dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 8 “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.Ha nwere ike dịka atụ.Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha. 9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma ONYENWE ANYỊ e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.” 12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụkwa naanị ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.” 15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:“Amụma Belam nwa Beoa,amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma, 16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 18 A ga-emeri Edọm,Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike. 19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.” 20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,ma ikpeazụ ya bụ mbibi!” 21 Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ! 22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.” 23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:“Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a? 24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha,ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.” 25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

In Other Versions

Numbers 24 in the ANGEFD

Numbers 24 in the ANTPNG2D

Numbers 24 in the AS21

Numbers 24 in the BAGH

Numbers 24 in the BBPNG

Numbers 24 in the BBT1E

Numbers 24 in the BDS

Numbers 24 in the BEV

Numbers 24 in the BHAD

Numbers 24 in the BIB

Numbers 24 in the BLPT

Numbers 24 in the BNT

Numbers 24 in the BNTABOOT

Numbers 24 in the BNTLV

Numbers 24 in the BOATCB

Numbers 24 in the BOATCB2

Numbers 24 in the BOBCV

Numbers 24 in the BOCNT

Numbers 24 in the BOECS

Numbers 24 in the BOGWICC

Numbers 24 in the BOHCB

Numbers 24 in the BOHCV

Numbers 24 in the BOHLNT

Numbers 24 in the BOHNTLTAL

Numbers 24 in the BOILNTAP

Numbers 24 in the BOITCV

Numbers 24 in the BOKCV

Numbers 24 in the BOKCV2

Numbers 24 in the BOKHWOG

Numbers 24 in the BOKSSV

Numbers 24 in the BOLCB

Numbers 24 in the BOLCB2

Numbers 24 in the BOMCV

Numbers 24 in the BONAV

Numbers 24 in the BONCB

Numbers 24 in the BONLT

Numbers 24 in the BONUT2

Numbers 24 in the BOPLNT

Numbers 24 in the BOSCB

Numbers 24 in the BOSNC

Numbers 24 in the BOTLNT

Numbers 24 in the BOVCB

Numbers 24 in the BOYCB

Numbers 24 in the BPBB

Numbers 24 in the BPH

Numbers 24 in the BSB

Numbers 24 in the CCB

Numbers 24 in the CUV

Numbers 24 in the CUVS

Numbers 24 in the DBT

Numbers 24 in the DGDNT

Numbers 24 in the DHNT

Numbers 24 in the DNT

Numbers 24 in the ELBE

Numbers 24 in the EMTV

Numbers 24 in the ESV

Numbers 24 in the FBV

Numbers 24 in the FEB

Numbers 24 in the GGMNT

Numbers 24 in the GNT

Numbers 24 in the HARY

Numbers 24 in the HNT

Numbers 24 in the IRVA

Numbers 24 in the IRVB

Numbers 24 in the IRVG

Numbers 24 in the IRVH

Numbers 24 in the IRVK

Numbers 24 in the IRVM

Numbers 24 in the IRVM2

Numbers 24 in the IRVO

Numbers 24 in the IRVP

Numbers 24 in the IRVT

Numbers 24 in the IRVT2

Numbers 24 in the IRVU

Numbers 24 in the ISVN

Numbers 24 in the JSNT

Numbers 24 in the KAPI

Numbers 24 in the KBT1ETNIK

Numbers 24 in the KBV

Numbers 24 in the KJV

Numbers 24 in the KNFD

Numbers 24 in the LBA

Numbers 24 in the LBLA

Numbers 24 in the LNT

Numbers 24 in the LSV

Numbers 24 in the MAAL

Numbers 24 in the MBV

Numbers 24 in the MBV2

Numbers 24 in the MHNT

Numbers 24 in the MKNFD

Numbers 24 in the MNG

Numbers 24 in the MNT

Numbers 24 in the MNT2

Numbers 24 in the MRS1T

Numbers 24 in the NAA

Numbers 24 in the NASB

Numbers 24 in the NBLA

Numbers 24 in the NBS

Numbers 24 in the NBVTP

Numbers 24 in the NET2

Numbers 24 in the NIV11

Numbers 24 in the NNT

Numbers 24 in the NNT2

Numbers 24 in the NNT3

Numbers 24 in the PDDPT

Numbers 24 in the PFNT

Numbers 24 in the RMNT

Numbers 24 in the SBIAS

Numbers 24 in the SBIBS

Numbers 24 in the SBIBS2

Numbers 24 in the SBICS

Numbers 24 in the SBIDS

Numbers 24 in the SBIGS

Numbers 24 in the SBIHS

Numbers 24 in the SBIIS

Numbers 24 in the SBIIS2

Numbers 24 in the SBIIS3

Numbers 24 in the SBIKS

Numbers 24 in the SBIKS2

Numbers 24 in the SBIMS

Numbers 24 in the SBIOS

Numbers 24 in the SBIPS

Numbers 24 in the SBISS

Numbers 24 in the SBITS

Numbers 24 in the SBITS2

Numbers 24 in the SBITS3

Numbers 24 in the SBITS4

Numbers 24 in the SBIUS

Numbers 24 in the SBIVS

Numbers 24 in the SBT

Numbers 24 in the SBT1E

Numbers 24 in the SCHL

Numbers 24 in the SNT

Numbers 24 in the SUSU

Numbers 24 in the SUSU2

Numbers 24 in the SYNO

Numbers 24 in the TBIAOTANT

Numbers 24 in the TBT1E

Numbers 24 in the TBT1E2

Numbers 24 in the TFTIP

Numbers 24 in the TFTU

Numbers 24 in the TGNTATF3T

Numbers 24 in the THAI

Numbers 24 in the TNFD

Numbers 24 in the TNT

Numbers 24 in the TNTIK

Numbers 24 in the TNTIL

Numbers 24 in the TNTIN

Numbers 24 in the TNTIP

Numbers 24 in the TNTIZ

Numbers 24 in the TOMA

Numbers 24 in the TTENT

Numbers 24 in the UBG

Numbers 24 in the UGV

Numbers 24 in the UGV2

Numbers 24 in the UGV3

Numbers 24 in the VBL

Numbers 24 in the VDCC

Numbers 24 in the YALU

Numbers 24 in the YAPE

Numbers 24 in the YBVTP

Numbers 24 in the ZBP