Numbers 6 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ dịka onye Nazirait, 3 ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4 Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya. 5 “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too. 6 “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ, 7 ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi. 8 Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ ka ọ bụ. 9 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha. 10 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 11 Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ. 12 Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ. 13 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye ONYENWE ANYỊ zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 14 Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu ONYENWE ANYỊ: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo, 15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv. 16 “ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu ONYENWE ANYỊ, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ. 17 Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye ONYENWE ANYỊ, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ. 18 “ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye ONYENWE ANYỊ ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ. 19 “ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ. 20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu ONYENWE ANYỊ. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya. 21 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye ONYENWE ANYỊ dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ” 22 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha, 24 “ ‘ “ONYENWE ANYỊ gọzie unuma chebe unu, 25 ONYENWE ANYỊ mee ka ihu ya mụkwasị unu,ma meere unu amara, 26 ONYENWE ANYỊ chee ihu ya nʼebe unu nọ,nyekwa unu udo.” ’ 27 “Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”

In Other Versions

Numbers 6 in the ANGEFD

Numbers 6 in the ANTPNG2D

Numbers 6 in the AS21

Numbers 6 in the BAGH

Numbers 6 in the BBPNG

Numbers 6 in the BBT1E

Numbers 6 in the BDS

Numbers 6 in the BEV

Numbers 6 in the BHAD

Numbers 6 in the BIB

Numbers 6 in the BLPT

Numbers 6 in the BNT

Numbers 6 in the BNTABOOT

Numbers 6 in the BNTLV

Numbers 6 in the BOATCB

Numbers 6 in the BOATCB2

Numbers 6 in the BOBCV

Numbers 6 in the BOCNT

Numbers 6 in the BOECS

Numbers 6 in the BOGWICC

Numbers 6 in the BOHCB

Numbers 6 in the BOHCV

Numbers 6 in the BOHLNT

Numbers 6 in the BOHNTLTAL

Numbers 6 in the BOILNTAP

Numbers 6 in the BOITCV

Numbers 6 in the BOKCV

Numbers 6 in the BOKCV2

Numbers 6 in the BOKHWOG

Numbers 6 in the BOKSSV

Numbers 6 in the BOLCB

Numbers 6 in the BOLCB2

Numbers 6 in the BOMCV

Numbers 6 in the BONAV

Numbers 6 in the BONCB

Numbers 6 in the BONLT

Numbers 6 in the BONUT2

Numbers 6 in the BOPLNT

Numbers 6 in the BOSCB

Numbers 6 in the BOSNC

Numbers 6 in the BOTLNT

Numbers 6 in the BOVCB

Numbers 6 in the BOYCB

Numbers 6 in the BPBB

Numbers 6 in the BPH

Numbers 6 in the BSB

Numbers 6 in the CCB

Numbers 6 in the CUV

Numbers 6 in the CUVS

Numbers 6 in the DBT

Numbers 6 in the DGDNT

Numbers 6 in the DHNT

Numbers 6 in the DNT

Numbers 6 in the ELBE

Numbers 6 in the EMTV

Numbers 6 in the ESV

Numbers 6 in the FBV

Numbers 6 in the FEB

Numbers 6 in the GGMNT

Numbers 6 in the GNT

Numbers 6 in the HARY

Numbers 6 in the HNT

Numbers 6 in the IRVA

Numbers 6 in the IRVB

Numbers 6 in the IRVG

Numbers 6 in the IRVH

Numbers 6 in the IRVK

Numbers 6 in the IRVM

Numbers 6 in the IRVM2

Numbers 6 in the IRVO

Numbers 6 in the IRVP

Numbers 6 in the IRVT

Numbers 6 in the IRVT2

Numbers 6 in the IRVU

Numbers 6 in the ISVN

Numbers 6 in the JSNT

Numbers 6 in the KAPI

Numbers 6 in the KBT1ETNIK

Numbers 6 in the KBV

Numbers 6 in the KJV

Numbers 6 in the KNFD

Numbers 6 in the LBA

Numbers 6 in the LBLA

Numbers 6 in the LNT

Numbers 6 in the LSV

Numbers 6 in the MAAL

Numbers 6 in the MBV

Numbers 6 in the MBV2

Numbers 6 in the MHNT

Numbers 6 in the MKNFD

Numbers 6 in the MNG

Numbers 6 in the MNT

Numbers 6 in the MNT2

Numbers 6 in the MRS1T

Numbers 6 in the NAA

Numbers 6 in the NASB

Numbers 6 in the NBLA

Numbers 6 in the NBS

Numbers 6 in the NBVTP

Numbers 6 in the NET2

Numbers 6 in the NIV11

Numbers 6 in the NNT

Numbers 6 in the NNT2

Numbers 6 in the NNT3

Numbers 6 in the PDDPT

Numbers 6 in the PFNT

Numbers 6 in the RMNT

Numbers 6 in the SBIAS

Numbers 6 in the SBIBS

Numbers 6 in the SBIBS2

Numbers 6 in the SBICS

Numbers 6 in the SBIDS

Numbers 6 in the SBIGS

Numbers 6 in the SBIHS

Numbers 6 in the SBIIS

Numbers 6 in the SBIIS2

Numbers 6 in the SBIIS3

Numbers 6 in the SBIKS

Numbers 6 in the SBIKS2

Numbers 6 in the SBIMS

Numbers 6 in the SBIOS

Numbers 6 in the SBIPS

Numbers 6 in the SBISS

Numbers 6 in the SBITS

Numbers 6 in the SBITS2

Numbers 6 in the SBITS3

Numbers 6 in the SBITS4

Numbers 6 in the SBIUS

Numbers 6 in the SBIVS

Numbers 6 in the SBT

Numbers 6 in the SBT1E

Numbers 6 in the SCHL

Numbers 6 in the SNT

Numbers 6 in the SUSU

Numbers 6 in the SUSU2

Numbers 6 in the SYNO

Numbers 6 in the TBIAOTANT

Numbers 6 in the TBT1E

Numbers 6 in the TBT1E2

Numbers 6 in the TFTIP

Numbers 6 in the TFTU

Numbers 6 in the TGNTATF3T

Numbers 6 in the THAI

Numbers 6 in the TNFD

Numbers 6 in the TNT

Numbers 6 in the TNTIK

Numbers 6 in the TNTIL

Numbers 6 in the TNTIN

Numbers 6 in the TNTIP

Numbers 6 in the TNTIZ

Numbers 6 in the TOMA

Numbers 6 in the TTENT

Numbers 6 in the UBG

Numbers 6 in the UGV

Numbers 6 in the UGV2

Numbers 6 in the UGV3

Numbers 6 in the VBL

Numbers 6 in the VDCC

Numbers 6 in the YALU

Numbers 6 in the YAPE

Numbers 6 in the YBVTP

Numbers 6 in the ZBP