Philippians 3 (BOICB)
1 Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile. 2 Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha. 3 Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ. 4 Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a.Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: 5 e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; 6 igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke. 7 Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. 8 E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru. 9 Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe. 10 Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ. 11 Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ. 12 Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya. 13 Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. 14 Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst. 15 Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a. 16 Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela. 17 Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu. 18 Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie. 19 Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa. 20 Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa. 21 Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.
In Other Versions
Philippians 3 in the ANGEFD
Philippians 3 in the ANTPNG2D
Philippians 3 in the AS21
Philippians 3 in the BAGH
Philippians 3 in the BBPNG
Philippians 3 in the BBT1E
Philippians 3 in the BDS
Philippians 3 in the BEV
Philippians 3 in the BHAD
Philippians 3 in the BIB
Philippians 3 in the BLPT
Philippians 3 in the BNT
Philippians 3 in the BNTABOOT
Philippians 3 in the BNTLV
Philippians 3 in the BOATCB
Philippians 3 in the BOATCB2
Philippians 3 in the BOBCV
Philippians 3 in the BOCNT
Philippians 3 in the BOECS
Philippians 3 in the BOGWICC
Philippians 3 in the BOHCB
Philippians 3 in the BOHCV
Philippians 3 in the BOHLNT
Philippians 3 in the BOHNTLTAL
Philippians 3 in the BOILNTAP
Philippians 3 in the BOITCV
Philippians 3 in the BOKCV
Philippians 3 in the BOKCV2
Philippians 3 in the BOKHWOG
Philippians 3 in the BOKSSV
Philippians 3 in the BOLCB
Philippians 3 in the BOLCB2
Philippians 3 in the BOMCV
Philippians 3 in the BONAV
Philippians 3 in the BONCB
Philippians 3 in the BONLT
Philippians 3 in the BONUT2
Philippians 3 in the BOPLNT
Philippians 3 in the BOSCB
Philippians 3 in the BOSNC
Philippians 3 in the BOTLNT
Philippians 3 in the BOVCB
Philippians 3 in the BOYCB
Philippians 3 in the BPBB
Philippians 3 in the BPH
Philippians 3 in the BSB
Philippians 3 in the CCB
Philippians 3 in the CUV
Philippians 3 in the CUVS
Philippians 3 in the DBT
Philippians 3 in the DGDNT
Philippians 3 in the DHNT
Philippians 3 in the DNT
Philippians 3 in the ELBE
Philippians 3 in the EMTV
Philippians 3 in the ESV
Philippians 3 in the FBV
Philippians 3 in the FEB
Philippians 3 in the GGMNT
Philippians 3 in the GNT
Philippians 3 in the HARY
Philippians 3 in the HNT
Philippians 3 in the IRVA
Philippians 3 in the IRVB
Philippians 3 in the IRVG
Philippians 3 in the IRVH
Philippians 3 in the IRVK
Philippians 3 in the IRVM
Philippians 3 in the IRVM2
Philippians 3 in the IRVO
Philippians 3 in the IRVP
Philippians 3 in the IRVT
Philippians 3 in the IRVT2
Philippians 3 in the IRVU
Philippians 3 in the ISVN
Philippians 3 in the JSNT
Philippians 3 in the KAPI
Philippians 3 in the KBT1ETNIK
Philippians 3 in the KBV
Philippians 3 in the KJV
Philippians 3 in the KNFD
Philippians 3 in the LBA
Philippians 3 in the LBLA
Philippians 3 in the LNT
Philippians 3 in the LSV
Philippians 3 in the MAAL
Philippians 3 in the MBV
Philippians 3 in the MBV2
Philippians 3 in the MHNT
Philippians 3 in the MKNFD
Philippians 3 in the MNG
Philippians 3 in the MNT
Philippians 3 in the MNT2
Philippians 3 in the MRS1T
Philippians 3 in the NAA
Philippians 3 in the NASB
Philippians 3 in the NBLA
Philippians 3 in the NBS
Philippians 3 in the NBVTP
Philippians 3 in the NET2
Philippians 3 in the NIV11
Philippians 3 in the NNT
Philippians 3 in the NNT2
Philippians 3 in the NNT3
Philippians 3 in the PDDPT
Philippians 3 in the PFNT
Philippians 3 in the RMNT
Philippians 3 in the SBIAS
Philippians 3 in the SBIBS
Philippians 3 in the SBIBS2
Philippians 3 in the SBICS
Philippians 3 in the SBIDS
Philippians 3 in the SBIGS
Philippians 3 in the SBIHS
Philippians 3 in the SBIIS
Philippians 3 in the SBIIS2
Philippians 3 in the SBIIS3
Philippians 3 in the SBIKS
Philippians 3 in the SBIKS2
Philippians 3 in the SBIMS
Philippians 3 in the SBIOS
Philippians 3 in the SBIPS
Philippians 3 in the SBISS
Philippians 3 in the SBITS
Philippians 3 in the SBITS2
Philippians 3 in the SBITS3
Philippians 3 in the SBITS4
Philippians 3 in the SBIUS
Philippians 3 in the SBIVS
Philippians 3 in the SBT
Philippians 3 in the SBT1E
Philippians 3 in the SCHL
Philippians 3 in the SNT
Philippians 3 in the SUSU
Philippians 3 in the SUSU2
Philippians 3 in the SYNO
Philippians 3 in the TBIAOTANT
Philippians 3 in the TBT1E
Philippians 3 in the TBT1E2
Philippians 3 in the TFTIP
Philippians 3 in the TFTU
Philippians 3 in the TGNTATF3T
Philippians 3 in the THAI
Philippians 3 in the TNFD
Philippians 3 in the TNT
Philippians 3 in the TNTIK
Philippians 3 in the TNTIL
Philippians 3 in the TNTIN
Philippians 3 in the TNTIP
Philippians 3 in the TNTIZ
Philippians 3 in the TOMA
Philippians 3 in the TTENT
Philippians 3 in the UBG
Philippians 3 in the UGV
Philippians 3 in the UGV2
Philippians 3 in the UGV3
Philippians 3 in the VBL
Philippians 3 in the VDCC
Philippians 3 in the YALU
Philippians 3 in the YAPE
Philippians 3 in the YBVTP
Philippians 3 in the ZBP