Philippians 4 (BOICB)
1 Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị. 2 Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị. 3 E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ. 4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! 5 Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 6 Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. 7 Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs. 8 Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. 9 Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu. 10 Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. 11 Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. 12 Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. 13 Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike. 14 Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 15 Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. 16 Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. 17 Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. 18 Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. 19 Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs. 20 Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 21 Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs.Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu. 22 Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza. 23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
In Other Versions
Philippians 4 in the ANGEFD
Philippians 4 in the ANTPNG2D
Philippians 4 in the AS21
Philippians 4 in the BAGH
Philippians 4 in the BBPNG
Philippians 4 in the BBT1E
Philippians 4 in the BDS
Philippians 4 in the BEV
Philippians 4 in the BHAD
Philippians 4 in the BIB
Philippians 4 in the BLPT
Philippians 4 in the BNT
Philippians 4 in the BNTABOOT
Philippians 4 in the BNTLV
Philippians 4 in the BOATCB
Philippians 4 in the BOATCB2
Philippians 4 in the BOBCV
Philippians 4 in the BOCNT
Philippians 4 in the BOECS
Philippians 4 in the BOGWICC
Philippians 4 in the BOHCB
Philippians 4 in the BOHCV
Philippians 4 in the BOHLNT
Philippians 4 in the BOHNTLTAL
Philippians 4 in the BOILNTAP
Philippians 4 in the BOITCV
Philippians 4 in the BOKCV
Philippians 4 in the BOKCV2
Philippians 4 in the BOKHWOG
Philippians 4 in the BOKSSV
Philippians 4 in the BOLCB
Philippians 4 in the BOLCB2
Philippians 4 in the BOMCV
Philippians 4 in the BONAV
Philippians 4 in the BONCB
Philippians 4 in the BONLT
Philippians 4 in the BONUT2
Philippians 4 in the BOPLNT
Philippians 4 in the BOSCB
Philippians 4 in the BOSNC
Philippians 4 in the BOTLNT
Philippians 4 in the BOVCB
Philippians 4 in the BOYCB
Philippians 4 in the BPBB
Philippians 4 in the BPH
Philippians 4 in the BSB
Philippians 4 in the CCB
Philippians 4 in the CUV
Philippians 4 in the CUVS
Philippians 4 in the DBT
Philippians 4 in the DGDNT
Philippians 4 in the DHNT
Philippians 4 in the DNT
Philippians 4 in the ELBE
Philippians 4 in the EMTV
Philippians 4 in the ESV
Philippians 4 in the FBV
Philippians 4 in the FEB
Philippians 4 in the GGMNT
Philippians 4 in the GNT
Philippians 4 in the HARY
Philippians 4 in the HNT
Philippians 4 in the IRVA
Philippians 4 in the IRVB
Philippians 4 in the IRVG
Philippians 4 in the IRVH
Philippians 4 in the IRVK
Philippians 4 in the IRVM
Philippians 4 in the IRVM2
Philippians 4 in the IRVO
Philippians 4 in the IRVP
Philippians 4 in the IRVT
Philippians 4 in the IRVT2
Philippians 4 in the IRVU
Philippians 4 in the ISVN
Philippians 4 in the JSNT
Philippians 4 in the KAPI
Philippians 4 in the KBT1ETNIK
Philippians 4 in the KBV
Philippians 4 in the KJV
Philippians 4 in the KNFD
Philippians 4 in the LBA
Philippians 4 in the LBLA
Philippians 4 in the LNT
Philippians 4 in the LSV
Philippians 4 in the MAAL
Philippians 4 in the MBV
Philippians 4 in the MBV2
Philippians 4 in the MHNT
Philippians 4 in the MKNFD
Philippians 4 in the MNG
Philippians 4 in the MNT
Philippians 4 in the MNT2
Philippians 4 in the MRS1T
Philippians 4 in the NAA
Philippians 4 in the NASB
Philippians 4 in the NBLA
Philippians 4 in the NBS
Philippians 4 in the NBVTP
Philippians 4 in the NET2
Philippians 4 in the NIV11
Philippians 4 in the NNT
Philippians 4 in the NNT2
Philippians 4 in the NNT3
Philippians 4 in the PDDPT
Philippians 4 in the PFNT
Philippians 4 in the RMNT
Philippians 4 in the SBIAS
Philippians 4 in the SBIBS
Philippians 4 in the SBIBS2
Philippians 4 in the SBICS
Philippians 4 in the SBIDS
Philippians 4 in the SBIGS
Philippians 4 in the SBIHS
Philippians 4 in the SBIIS
Philippians 4 in the SBIIS2
Philippians 4 in the SBIIS3
Philippians 4 in the SBIKS
Philippians 4 in the SBIKS2
Philippians 4 in the SBIMS
Philippians 4 in the SBIOS
Philippians 4 in the SBIPS
Philippians 4 in the SBISS
Philippians 4 in the SBITS
Philippians 4 in the SBITS2
Philippians 4 in the SBITS3
Philippians 4 in the SBITS4
Philippians 4 in the SBIUS
Philippians 4 in the SBIVS
Philippians 4 in the SBT
Philippians 4 in the SBT1E
Philippians 4 in the SCHL
Philippians 4 in the SNT
Philippians 4 in the SUSU
Philippians 4 in the SUSU2
Philippians 4 in the SYNO
Philippians 4 in the TBIAOTANT
Philippians 4 in the TBT1E
Philippians 4 in the TBT1E2
Philippians 4 in the TFTIP
Philippians 4 in the TFTU
Philippians 4 in the TGNTATF3T
Philippians 4 in the THAI
Philippians 4 in the TNFD
Philippians 4 in the TNT
Philippians 4 in the TNTIK
Philippians 4 in the TNTIL
Philippians 4 in the TNTIN
Philippians 4 in the TNTIP
Philippians 4 in the TNTIZ
Philippians 4 in the TOMA
Philippians 4 in the TTENT
Philippians 4 in the UBG
Philippians 4 in the UGV
Philippians 4 in the UGV2
Philippians 4 in the UGV3
Philippians 4 in the VBL
Philippians 4 in the VDCC
Philippians 4 in the YALU
Philippians 4 in the YAPE
Philippians 4 in the YBVTP
Philippians 4 in the ZBP