Proverbs 10 (BOICB)

1 Ilu dị iche iche nke Solomọn:Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ. 2 Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ. 3 ONYENWE ANYỊ agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma. 4 Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba. 5 Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere. 6 Onye ezi omume na-anata ngọzị,ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,ma aha onye ajọ omume ga-ere ure. 8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi. 9 Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta. 10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi. 11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile. 13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku. 15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye. 16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ. 17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo. 18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asịna onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu. 19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsịma ndị nwere uche na-ejide ire ha. 20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta. 21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. 22 Ngọzị ONYENWE ANYỊ na-eme mmadụ ọgaranya,ọ naghị atụkwasị ya nsogbu. 23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta. 24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya. 25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi. 26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze. 27 Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ na-enye ogologo ndụ,ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ. 28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu. 29 Ụzọ ONYENWE ANYỊ bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe. 30 A pụghị iwezuga onye ezi omume,ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide. 31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.

In Other Versions

Proverbs 10 in the ANGEFD

Proverbs 10 in the ANTPNG2D

Proverbs 10 in the AS21

Proverbs 10 in the BAGH

Proverbs 10 in the BBPNG

Proverbs 10 in the BBT1E

Proverbs 10 in the BDS

Proverbs 10 in the BEV

Proverbs 10 in the BHAD

Proverbs 10 in the BIB

Proverbs 10 in the BLPT

Proverbs 10 in the BNT

Proverbs 10 in the BNTABOOT

Proverbs 10 in the BNTLV

Proverbs 10 in the BOATCB

Proverbs 10 in the BOATCB2

Proverbs 10 in the BOBCV

Proverbs 10 in the BOCNT

Proverbs 10 in the BOECS

Proverbs 10 in the BOGWICC

Proverbs 10 in the BOHCB

Proverbs 10 in the BOHCV

Proverbs 10 in the BOHLNT

Proverbs 10 in the BOHNTLTAL

Proverbs 10 in the BOILNTAP

Proverbs 10 in the BOITCV

Proverbs 10 in the BOKCV

Proverbs 10 in the BOKCV2

Proverbs 10 in the BOKHWOG

Proverbs 10 in the BOKSSV

Proverbs 10 in the BOLCB

Proverbs 10 in the BOLCB2

Proverbs 10 in the BOMCV

Proverbs 10 in the BONAV

Proverbs 10 in the BONCB

Proverbs 10 in the BONLT

Proverbs 10 in the BONUT2

Proverbs 10 in the BOPLNT

Proverbs 10 in the BOSCB

Proverbs 10 in the BOSNC

Proverbs 10 in the BOTLNT

Proverbs 10 in the BOVCB

Proverbs 10 in the BOYCB

Proverbs 10 in the BPBB

Proverbs 10 in the BPH

Proverbs 10 in the BSB

Proverbs 10 in the CCB

Proverbs 10 in the CUV

Proverbs 10 in the CUVS

Proverbs 10 in the DBT

Proverbs 10 in the DGDNT

Proverbs 10 in the DHNT

Proverbs 10 in the DNT

Proverbs 10 in the ELBE

Proverbs 10 in the EMTV

Proverbs 10 in the ESV

Proverbs 10 in the FBV

Proverbs 10 in the FEB

Proverbs 10 in the GGMNT

Proverbs 10 in the GNT

Proverbs 10 in the HARY

Proverbs 10 in the HNT

Proverbs 10 in the IRVA

Proverbs 10 in the IRVB

Proverbs 10 in the IRVG

Proverbs 10 in the IRVH

Proverbs 10 in the IRVK

Proverbs 10 in the IRVM

Proverbs 10 in the IRVM2

Proverbs 10 in the IRVO

Proverbs 10 in the IRVP

Proverbs 10 in the IRVT

Proverbs 10 in the IRVT2

Proverbs 10 in the IRVU

Proverbs 10 in the ISVN

Proverbs 10 in the JSNT

Proverbs 10 in the KAPI

Proverbs 10 in the KBT1ETNIK

Proverbs 10 in the KBV

Proverbs 10 in the KJV

Proverbs 10 in the KNFD

Proverbs 10 in the LBA

Proverbs 10 in the LBLA

Proverbs 10 in the LNT

Proverbs 10 in the LSV

Proverbs 10 in the MAAL

Proverbs 10 in the MBV

Proverbs 10 in the MBV2

Proverbs 10 in the MHNT

Proverbs 10 in the MKNFD

Proverbs 10 in the MNG

Proverbs 10 in the MNT

Proverbs 10 in the MNT2

Proverbs 10 in the MRS1T

Proverbs 10 in the NAA

Proverbs 10 in the NASB

Proverbs 10 in the NBLA

Proverbs 10 in the NBS

Proverbs 10 in the NBVTP

Proverbs 10 in the NET2

Proverbs 10 in the NIV11

Proverbs 10 in the NNT

Proverbs 10 in the NNT2

Proverbs 10 in the NNT3

Proverbs 10 in the PDDPT

Proverbs 10 in the PFNT

Proverbs 10 in the RMNT

Proverbs 10 in the SBIAS

Proverbs 10 in the SBIBS

Proverbs 10 in the SBIBS2

Proverbs 10 in the SBICS

Proverbs 10 in the SBIDS

Proverbs 10 in the SBIGS

Proverbs 10 in the SBIHS

Proverbs 10 in the SBIIS

Proverbs 10 in the SBIIS2

Proverbs 10 in the SBIIS3

Proverbs 10 in the SBIKS

Proverbs 10 in the SBIKS2

Proverbs 10 in the SBIMS

Proverbs 10 in the SBIOS

Proverbs 10 in the SBIPS

Proverbs 10 in the SBISS

Proverbs 10 in the SBITS

Proverbs 10 in the SBITS2

Proverbs 10 in the SBITS3

Proverbs 10 in the SBITS4

Proverbs 10 in the SBIUS

Proverbs 10 in the SBIVS

Proverbs 10 in the SBT

Proverbs 10 in the SBT1E

Proverbs 10 in the SCHL

Proverbs 10 in the SNT

Proverbs 10 in the SUSU

Proverbs 10 in the SUSU2

Proverbs 10 in the SYNO

Proverbs 10 in the TBIAOTANT

Proverbs 10 in the TBT1E

Proverbs 10 in the TBT1E2

Proverbs 10 in the TFTIP

Proverbs 10 in the TFTU

Proverbs 10 in the TGNTATF3T

Proverbs 10 in the THAI

Proverbs 10 in the TNFD

Proverbs 10 in the TNT

Proverbs 10 in the TNTIK

Proverbs 10 in the TNTIL

Proverbs 10 in the TNTIN

Proverbs 10 in the TNTIP

Proverbs 10 in the TNTIZ

Proverbs 10 in the TOMA

Proverbs 10 in the TTENT

Proverbs 10 in the UBG

Proverbs 10 in the UGV

Proverbs 10 in the UGV2

Proverbs 10 in the UGV3

Proverbs 10 in the VBL

Proverbs 10 in the VDCC

Proverbs 10 in the YALU

Proverbs 10 in the YAPE

Proverbs 10 in the YBVTP

Proverbs 10 in the ZBP