Proverbs 3 (BOICB)
1 Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.Ma debe iwu m nʼobi gị. 2 Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,wetakwara gị udo na ọganihu. 3 Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị,kekwasị ha nʼolu gị,deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. 4 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi ahanʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. 5 Tụkwasị ONYENWE ANYỊ obi gị niile,adaberekwala na nghọta gị. 6 Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. 7 A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.Tụọ ONYENWE ANYỊ egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. 8 Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ikegbaakwa ọkpụkpụ gị ume. 9 Sọpụrụ ONYENWE ANYỊ site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. 10 Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke,ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. 11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYỊ,ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. 12 Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,onye nwetara nghọta. 14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. 16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya;nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. 17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mmabụrụkwa ụzọ udo. 18 Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka,e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma. 19 Ọ bụ site nʼamamihe ka ONYENWE ANYỊ ji tọọ ntọala ụwa;ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. 20 Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile,igwe ojii na-atụdakwa igirigi. 21 Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha:amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, 22 nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ,ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. 23 Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwumaọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. 24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. 25 Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụlamaọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. 26 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ ebe ndabere gị,ọ ga-echebekwa gị. 27 Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọmgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. 28 A sịkwala onye agbataobi gị laa,bịaghachi azụ echimgbe i nwere ike ime ya taa. 29 Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị,nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. 30 Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi,mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. 31 Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworomaọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. 32 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ,ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. 33 Ọbụbụ ọnụ ONYENWE ANYỊ dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume,ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. 34 Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo,ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara. 35 Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ,ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
In Other Versions
Proverbs 3 in the ANGEFD
Proverbs 3 in the ANTPNG2D
Proverbs 3 in the AS21
Proverbs 3 in the BAGH
Proverbs 3 in the BBPNG
Proverbs 3 in the BBT1E
Proverbs 3 in the BDS
Proverbs 3 in the BEV
Proverbs 3 in the BHAD
Proverbs 3 in the BIB
Proverbs 3 in the BLPT
Proverbs 3 in the BNT
Proverbs 3 in the BNTABOOT
Proverbs 3 in the BNTLV
Proverbs 3 in the BOATCB
Proverbs 3 in the BOATCB2
Proverbs 3 in the BOBCV
Proverbs 3 in the BOCNT
Proverbs 3 in the BOECS
Proverbs 3 in the BOGWICC
Proverbs 3 in the BOHCB
Proverbs 3 in the BOHCV
Proverbs 3 in the BOHLNT
Proverbs 3 in the BOHNTLTAL
Proverbs 3 in the BOILNTAP
Proverbs 3 in the BOITCV
Proverbs 3 in the BOKCV
Proverbs 3 in the BOKCV2
Proverbs 3 in the BOKHWOG
Proverbs 3 in the BOKSSV
Proverbs 3 in the BOLCB
Proverbs 3 in the BOLCB2
Proverbs 3 in the BOMCV
Proverbs 3 in the BONAV
Proverbs 3 in the BONCB
Proverbs 3 in the BONLT
Proverbs 3 in the BONUT2
Proverbs 3 in the BOPLNT
Proverbs 3 in the BOSCB
Proverbs 3 in the BOSNC
Proverbs 3 in the BOTLNT
Proverbs 3 in the BOVCB
Proverbs 3 in the BOYCB
Proverbs 3 in the BPBB
Proverbs 3 in the BPH
Proverbs 3 in the BSB
Proverbs 3 in the CCB
Proverbs 3 in the CUV
Proverbs 3 in the CUVS
Proverbs 3 in the DBT
Proverbs 3 in the DGDNT
Proverbs 3 in the DHNT
Proverbs 3 in the DNT
Proverbs 3 in the ELBE
Proverbs 3 in the EMTV
Proverbs 3 in the ESV
Proverbs 3 in the FBV
Proverbs 3 in the FEB
Proverbs 3 in the GGMNT
Proverbs 3 in the GNT
Proverbs 3 in the HARY
Proverbs 3 in the HNT
Proverbs 3 in the IRVA
Proverbs 3 in the IRVB
Proverbs 3 in the IRVG
Proverbs 3 in the IRVH
Proverbs 3 in the IRVK
Proverbs 3 in the IRVM
Proverbs 3 in the IRVM2
Proverbs 3 in the IRVO
Proverbs 3 in the IRVP
Proverbs 3 in the IRVT
Proverbs 3 in the IRVT2
Proverbs 3 in the IRVU
Proverbs 3 in the ISVN
Proverbs 3 in the JSNT
Proverbs 3 in the KAPI
Proverbs 3 in the KBT1ETNIK
Proverbs 3 in the KBV
Proverbs 3 in the KJV
Proverbs 3 in the KNFD
Proverbs 3 in the LBA
Proverbs 3 in the LBLA
Proverbs 3 in the LNT
Proverbs 3 in the LSV
Proverbs 3 in the MAAL
Proverbs 3 in the MBV
Proverbs 3 in the MBV2
Proverbs 3 in the MHNT
Proverbs 3 in the MKNFD
Proverbs 3 in the MNG
Proverbs 3 in the MNT
Proverbs 3 in the MNT2
Proverbs 3 in the MRS1T
Proverbs 3 in the NAA
Proverbs 3 in the NASB
Proverbs 3 in the NBLA
Proverbs 3 in the NBS
Proverbs 3 in the NBVTP
Proverbs 3 in the NET2
Proverbs 3 in the NIV11
Proverbs 3 in the NNT
Proverbs 3 in the NNT2
Proverbs 3 in the NNT3
Proverbs 3 in the PDDPT
Proverbs 3 in the PFNT
Proverbs 3 in the RMNT
Proverbs 3 in the SBIAS
Proverbs 3 in the SBIBS
Proverbs 3 in the SBIBS2
Proverbs 3 in the SBICS
Proverbs 3 in the SBIDS
Proverbs 3 in the SBIGS
Proverbs 3 in the SBIHS
Proverbs 3 in the SBIIS
Proverbs 3 in the SBIIS2
Proverbs 3 in the SBIIS3
Proverbs 3 in the SBIKS
Proverbs 3 in the SBIKS2
Proverbs 3 in the SBIMS
Proverbs 3 in the SBIOS
Proverbs 3 in the SBIPS
Proverbs 3 in the SBISS
Proverbs 3 in the SBITS
Proverbs 3 in the SBITS2
Proverbs 3 in the SBITS3
Proverbs 3 in the SBITS4
Proverbs 3 in the SBIUS
Proverbs 3 in the SBIVS
Proverbs 3 in the SBT
Proverbs 3 in the SBT1E
Proverbs 3 in the SCHL
Proverbs 3 in the SNT
Proverbs 3 in the SUSU
Proverbs 3 in the SUSU2
Proverbs 3 in the SYNO
Proverbs 3 in the TBIAOTANT
Proverbs 3 in the TBT1E
Proverbs 3 in the TBT1E2
Proverbs 3 in the TFTIP
Proverbs 3 in the TFTU
Proverbs 3 in the TGNTATF3T
Proverbs 3 in the THAI
Proverbs 3 in the TNFD
Proverbs 3 in the TNT
Proverbs 3 in the TNTIK
Proverbs 3 in the TNTIL
Proverbs 3 in the TNTIN
Proverbs 3 in the TNTIP
Proverbs 3 in the TNTIZ
Proverbs 3 in the TOMA
Proverbs 3 in the TTENT
Proverbs 3 in the UBG
Proverbs 3 in the UGV
Proverbs 3 in the UGV2
Proverbs 3 in the UGV3
Proverbs 3 in the VBL
Proverbs 3 in the VDCC
Proverbs 3 in the YALU
Proverbs 3 in the YAPE
Proverbs 3 in the YBVTP
Proverbs 3 in the ZBP