Psalms 126 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Mgbe ONYENWE ANYỊ kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2 Ọchị juru anyị ọnụ,abụ ọṅụ jukwara anyị ire.Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,“ONYENWE ANYỊ emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3 ONYENWE ANYỊ emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o ONYENWE ANYỊ,dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6 Onye ji ịkwa akwaburu mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,mgbe ha bu ukwu ọka ha.