Psalms 129 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,ka Izrel kwuo. 2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,ma ha enweghị ike merie m. 3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo. 4 Ma ONYENWE ANYỊ bụ onye ezi omume;ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.” 5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asịbụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere. 6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọnke na-akpọnwụ tupu o pupụta; 7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya. 8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,“Ngọzị ONYENWE ANYỊ dịrị unu.Anyị na-agọzi unu nʼaha ONYENWE ANYỊ.”