Psalms 13 (BOICB)
undefined Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 1 Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m ONYENWE ANYỊ?Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị? 2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgbanọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? 3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O ONYENWE ANYỊ Chineke m.Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; 4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. 5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 6 Aga m abụku ONYENWE ANYỊ abụ,nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.