Psalms 22 (BOICB)
undefined Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. 1 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? 2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere. 3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;ị bụ otuto ndị Izrel. 4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha. 5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi. 6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ;onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. 7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. 8 “O na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi;ka ONYENWE ANYỊ bịa gbapụta ya.Ya napụta ya ebe ọ bụna ihe ya masịrị ya.” 9 Ma ONYENWE ANYỊ, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. 10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. 11 Anọla m ebe dị anya,nʼihi na nsogbu dị nso.Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. 12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu. 13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịaasaghepụla ọnụ ha megide m. 14 A wụpụla m dịka mmiri,ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.Obi m agbazela dịka mmanụ,obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. 16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,ha adupuola m aka m na ụkwụ m. 17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị 18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,ha sitere nʼife nza kee uwe m. 19 Ma gị, ONYENWE ANYỊ, anọla m ebe dị anya;gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. 20 Napụta ndụ m site na mma agha,site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. 21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,zọpụta m site na mpi atụ ndị a. 22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. 23 Toonu ONYENWE ANYỊ! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel! 24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anyamaọbụ kwaa ya emo;o lefughị ya anyakama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. 25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. 26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,ndị niile na-achọ ONYENWE ANYỊ ga-eto yaka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,ma laghachikwute ONYENWE ANYỊ.Ezinaụlọ nke mba niile dị iche ichega-akpọ isiala nʼihu ya. 28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke ONYENWE ANYỊ,ọ na-achịkwa mba niile. 29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. 31 Ha ga-ekwusa ezi omume yanye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghịnʼihi na o meela ya.
In Other Versions
Psalms 22 in the ANGEFD
Psalms 22 in the ANTPNG2D
Psalms 22 in the AS21
Psalms 22 in the BAGH
Psalms 22 in the BBPNG
Psalms 22 in the BBT1E
Psalms 22 in the BDS
Psalms 22 in the BEV
Psalms 22 in the BHAD
Psalms 22 in the BIB
Psalms 22 in the BLPT
Psalms 22 in the BNT
Psalms 22 in the BNTABOOT
Psalms 22 in the BNTLV
Psalms 22 in the BOATCB
Psalms 22 in the BOATCB2
Psalms 22 in the BOBCV
Psalms 22 in the BOCNT
Psalms 22 in the BOECS
Psalms 22 in the BOGWICC
Psalms 22 in the BOHCB
Psalms 22 in the BOHCV
Psalms 22 in the BOHLNT
Psalms 22 in the BOHNTLTAL
Psalms 22 in the BOILNTAP
Psalms 22 in the BOITCV
Psalms 22 in the BOKCV
Psalms 22 in the BOKCV2
Psalms 22 in the BOKHWOG
Psalms 22 in the BOKSSV
Psalms 22 in the BOLCB
Psalms 22 in the BOLCB2
Psalms 22 in the BOMCV
Psalms 22 in the BONAV
Psalms 22 in the BONCB
Psalms 22 in the BONLT
Psalms 22 in the BONUT2
Psalms 22 in the BOPLNT
Psalms 22 in the BOSCB
Psalms 22 in the BOSNC
Psalms 22 in the BOTLNT
Psalms 22 in the BOVCB
Psalms 22 in the BOYCB
Psalms 22 in the BPBB
Psalms 22 in the BPH
Psalms 22 in the BSB
Psalms 22 in the CCB
Psalms 22 in the CUV
Psalms 22 in the CUVS
Psalms 22 in the DBT
Psalms 22 in the DGDNT
Psalms 22 in the DHNT
Psalms 22 in the DNT
Psalms 22 in the ELBE
Psalms 22 in the EMTV
Psalms 22 in the ESV
Psalms 22 in the FBV
Psalms 22 in the FEB
Psalms 22 in the GGMNT
Psalms 22 in the GNT
Psalms 22 in the HARY
Psalms 22 in the HNT
Psalms 22 in the IRVA
Psalms 22 in the IRVB
Psalms 22 in the IRVG
Psalms 22 in the IRVH
Psalms 22 in the IRVK
Psalms 22 in the IRVM
Psalms 22 in the IRVM2
Psalms 22 in the IRVO
Psalms 22 in the IRVP
Psalms 22 in the IRVT
Psalms 22 in the IRVT2
Psalms 22 in the IRVU
Psalms 22 in the ISVN
Psalms 22 in the JSNT
Psalms 22 in the KAPI
Psalms 22 in the KBT1ETNIK
Psalms 22 in the KBV
Psalms 22 in the KJV
Psalms 22 in the KNFD
Psalms 22 in the LBA
Psalms 22 in the LBLA
Psalms 22 in the LNT
Psalms 22 in the LSV
Psalms 22 in the MAAL
Psalms 22 in the MBV
Psalms 22 in the MBV2
Psalms 22 in the MHNT
Psalms 22 in the MKNFD
Psalms 22 in the MNG
Psalms 22 in the MNT
Psalms 22 in the MNT2
Psalms 22 in the MRS1T
Psalms 22 in the NAA
Psalms 22 in the NASB
Psalms 22 in the NBLA
Psalms 22 in the NBS
Psalms 22 in the NBVTP
Psalms 22 in the NET2
Psalms 22 in the NIV11
Psalms 22 in the NNT
Psalms 22 in the NNT2
Psalms 22 in the NNT3
Psalms 22 in the PDDPT
Psalms 22 in the PFNT
Psalms 22 in the RMNT
Psalms 22 in the SBIAS
Psalms 22 in the SBIBS
Psalms 22 in the SBIBS2
Psalms 22 in the SBICS
Psalms 22 in the SBIDS
Psalms 22 in the SBIGS
Psalms 22 in the SBIHS
Psalms 22 in the SBIIS
Psalms 22 in the SBIIS2
Psalms 22 in the SBIIS3
Psalms 22 in the SBIKS
Psalms 22 in the SBIKS2
Psalms 22 in the SBIMS
Psalms 22 in the SBIOS
Psalms 22 in the SBIPS
Psalms 22 in the SBISS
Psalms 22 in the SBITS
Psalms 22 in the SBITS2
Psalms 22 in the SBITS3
Psalms 22 in the SBITS4
Psalms 22 in the SBIUS
Psalms 22 in the SBIVS
Psalms 22 in the SBT
Psalms 22 in the SBT1E
Psalms 22 in the SCHL
Psalms 22 in the SNT
Psalms 22 in the SUSU
Psalms 22 in the SUSU2
Psalms 22 in the SYNO
Psalms 22 in the TBIAOTANT
Psalms 22 in the TBT1E
Psalms 22 in the TBT1E2
Psalms 22 in the TFTIP
Psalms 22 in the TFTU
Psalms 22 in the TGNTATF3T
Psalms 22 in the THAI
Psalms 22 in the TNFD
Psalms 22 in the TNT
Psalms 22 in the TNTIK
Psalms 22 in the TNTIL
Psalms 22 in the TNTIN
Psalms 22 in the TNTIP
Psalms 22 in the TNTIZ
Psalms 22 in the TOMA
Psalms 22 in the TTENT
Psalms 22 in the UBG
Psalms 22 in the UGV
Psalms 22 in the UGV2
Psalms 22 in the UGV3
Psalms 22 in the VBL
Psalms 22 in the VDCC
Psalms 22 in the YALU
Psalms 22 in the YAPE
Psalms 22 in the YBVTP
Psalms 22 in the ZBP