Psalms 69 (BOICB)

undefined Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid. 1 O Chineke, zọpụta m,nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu. 2 Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m. 3 Akpịrị akpọọla m nkụ;ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.Anya m agbaala ọchịchịrịebe m na-ele anya Chineke. 4 Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuukarịa agịrị isi dị m nʼisi.Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachiihe m na-ezughị nʼohi. 5 Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị. 6 Ekwela ka ihere mee ndịna-atụkwasị gị obi nʼihi m,O Onyenwe m, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile;ka ndị na-achọ gịghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,O Chineke nke Izrel. 7 Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,ihere ekpuchiela m ihu. 8 Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ. 9 Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. 10 Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a. 11 Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị. 12 Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ. 13 O ONYENWE ANYỊ, ana m akpọku gị nʼekpere,nʼoge ihuọma gị;na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. 14 Dọpụta m site nʼụrụrọ,ekwela ka m mikpuo;zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,site na mmiri miri emi. 15 Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,maọbụ ka ebe dị omimi loda m,ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. 16 O ONYENWE ANYỊ, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. 17 Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m! 18 Bịa m nso zọpụta m.Gbapụta m site nʼaka ndị iro m. 19 Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. 20 Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. 21 Ha tinyere oluilu nʼime nri m,nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. 22 Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu. 23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile. 24 Wụkwasị ha oke iwe gị,ka iwe gị dị ọkụ zute ha. 25 Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu,ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha. 26 Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ,na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ. 27 Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume,ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị. 28 Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ,ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume. 29 Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu,O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m. 30 Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,jirikwa ekele bulie ya elu. 31 Nke a ga-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ karịa oke ehi,karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị. 32 Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ;unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ. 33 ONYENWE ANYỊ na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa,ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya. 34 Ka eluigwe na ụwa too ya,osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha. 35 Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn;ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda.Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha. 36 Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya,ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.

In Other Versions

Psalms 69 in the ANGEFD

Psalms 69 in the ANTPNG2D

Psalms 69 in the AS21

Psalms 69 in the BAGH

Psalms 69 in the BBPNG

Psalms 69 in the BBT1E

Psalms 69 in the BDS

Psalms 69 in the BEV

Psalms 69 in the BHAD

Psalms 69 in the BIB

Psalms 69 in the BLPT

Psalms 69 in the BNT

Psalms 69 in the BNTABOOT

Psalms 69 in the BNTLV

Psalms 69 in the BOATCB

Psalms 69 in the BOATCB2

Psalms 69 in the BOBCV

Psalms 69 in the BOCNT

Psalms 69 in the BOECS

Psalms 69 in the BOGWICC

Psalms 69 in the BOHCB

Psalms 69 in the BOHCV

Psalms 69 in the BOHLNT

Psalms 69 in the BOHNTLTAL

Psalms 69 in the BOILNTAP

Psalms 69 in the BOITCV

Psalms 69 in the BOKCV

Psalms 69 in the BOKCV2

Psalms 69 in the BOKHWOG

Psalms 69 in the BOKSSV

Psalms 69 in the BOLCB

Psalms 69 in the BOLCB2

Psalms 69 in the BOMCV

Psalms 69 in the BONAV

Psalms 69 in the BONCB

Psalms 69 in the BONLT

Psalms 69 in the BONUT2

Psalms 69 in the BOPLNT

Psalms 69 in the BOSCB

Psalms 69 in the BOSNC

Psalms 69 in the BOTLNT

Psalms 69 in the BOVCB

Psalms 69 in the BOYCB

Psalms 69 in the BPBB

Psalms 69 in the BPH

Psalms 69 in the BSB

Psalms 69 in the CCB

Psalms 69 in the CUV

Psalms 69 in the CUVS

Psalms 69 in the DBT

Psalms 69 in the DGDNT

Psalms 69 in the DHNT

Psalms 69 in the DNT

Psalms 69 in the ELBE

Psalms 69 in the EMTV

Psalms 69 in the ESV

Psalms 69 in the FBV

Psalms 69 in the FEB

Psalms 69 in the GGMNT

Psalms 69 in the GNT

Psalms 69 in the HARY

Psalms 69 in the HNT

Psalms 69 in the IRVA

Psalms 69 in the IRVB

Psalms 69 in the IRVG

Psalms 69 in the IRVH

Psalms 69 in the IRVK

Psalms 69 in the IRVM

Psalms 69 in the IRVM2

Psalms 69 in the IRVO

Psalms 69 in the IRVP

Psalms 69 in the IRVT

Psalms 69 in the IRVT2

Psalms 69 in the IRVU

Psalms 69 in the ISVN

Psalms 69 in the JSNT

Psalms 69 in the KAPI

Psalms 69 in the KBT1ETNIK

Psalms 69 in the KBV

Psalms 69 in the KJV

Psalms 69 in the KNFD

Psalms 69 in the LBA

Psalms 69 in the LBLA

Psalms 69 in the LNT

Psalms 69 in the LSV

Psalms 69 in the MAAL

Psalms 69 in the MBV

Psalms 69 in the MBV2

Psalms 69 in the MHNT

Psalms 69 in the MKNFD

Psalms 69 in the MNG

Psalms 69 in the MNT

Psalms 69 in the MNT2

Psalms 69 in the MRS1T

Psalms 69 in the NAA

Psalms 69 in the NASB

Psalms 69 in the NBLA

Psalms 69 in the NBS

Psalms 69 in the NBVTP

Psalms 69 in the NET2

Psalms 69 in the NIV11

Psalms 69 in the NNT

Psalms 69 in the NNT2

Psalms 69 in the NNT3

Psalms 69 in the PDDPT

Psalms 69 in the PFNT

Psalms 69 in the RMNT

Psalms 69 in the SBIAS

Psalms 69 in the SBIBS

Psalms 69 in the SBIBS2

Psalms 69 in the SBICS

Psalms 69 in the SBIDS

Psalms 69 in the SBIGS

Psalms 69 in the SBIHS

Psalms 69 in the SBIIS

Psalms 69 in the SBIIS2

Psalms 69 in the SBIIS3

Psalms 69 in the SBIKS

Psalms 69 in the SBIKS2

Psalms 69 in the SBIMS

Psalms 69 in the SBIOS

Psalms 69 in the SBIPS

Psalms 69 in the SBISS

Psalms 69 in the SBITS

Psalms 69 in the SBITS2

Psalms 69 in the SBITS3

Psalms 69 in the SBITS4

Psalms 69 in the SBIUS

Psalms 69 in the SBIVS

Psalms 69 in the SBT

Psalms 69 in the SBT1E

Psalms 69 in the SCHL

Psalms 69 in the SNT

Psalms 69 in the SUSU

Psalms 69 in the SUSU2

Psalms 69 in the SYNO

Psalms 69 in the TBIAOTANT

Psalms 69 in the TBT1E

Psalms 69 in the TBT1E2

Psalms 69 in the TFTIP

Psalms 69 in the TFTU

Psalms 69 in the TGNTATF3T

Psalms 69 in the THAI

Psalms 69 in the TNFD

Psalms 69 in the TNT

Psalms 69 in the TNTIK

Psalms 69 in the TNTIL

Psalms 69 in the TNTIN

Psalms 69 in the TNTIP

Psalms 69 in the TNTIZ

Psalms 69 in the TOMA

Psalms 69 in the TTENT

Psalms 69 in the UBG

Psalms 69 in the UGV

Psalms 69 in the UGV2

Psalms 69 in the UGV3

Psalms 69 in the VBL

Psalms 69 in the VDCC

Psalms 69 in the YALU

Psalms 69 in the YAPE

Psalms 69 in the YBVTP

Psalms 69 in the ZBP