Revelation 22 (BOICB)

1 Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, 2 nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. 3 A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. 4 Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha. 5 Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 6 Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya. 7 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.” 8 Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. 9 Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.” 10 Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso. 11 Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.” 12 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka. 13 Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ. 14 “Ngọzị na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta oke na mkpụrụ si nʼosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nʼọnụ ụzọ ama ahụ baa nʼime obodo ahụ. 15 Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya. 16 “Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.” 17 Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla. 18 Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a. 19 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a. 20 Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.”Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs. 21 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.

In Other Versions

Revelation 22 in the ANGEFD

Revelation 22 in the ANTPNG2D

Revelation 22 in the AS21

Revelation 22 in the BAGH

Revelation 22 in the BBPNG

Revelation 22 in the BBT1E

Revelation 22 in the BDS

Revelation 22 in the BEV

Revelation 22 in the BHAD

Revelation 22 in the BIB

Revelation 22 in the BLPT

Revelation 22 in the BNT

Revelation 22 in the BNTABOOT

Revelation 22 in the BNTLV

Revelation 22 in the BOATCB

Revelation 22 in the BOATCB2

Revelation 22 in the BOBCV

Revelation 22 in the BOCNT

Revelation 22 in the BOECS

Revelation 22 in the BOGWICC

Revelation 22 in the BOHCB

Revelation 22 in the BOHCV

Revelation 22 in the BOHLNT

Revelation 22 in the BOHNTLTAL

Revelation 22 in the BOILNTAP

Revelation 22 in the BOITCV

Revelation 22 in the BOKCV

Revelation 22 in the BOKCV2

Revelation 22 in the BOKHWOG

Revelation 22 in the BOKSSV

Revelation 22 in the BOLCB

Revelation 22 in the BOLCB2

Revelation 22 in the BOMCV

Revelation 22 in the BONAV

Revelation 22 in the BONCB

Revelation 22 in the BONLT

Revelation 22 in the BONUT2

Revelation 22 in the BOPLNT

Revelation 22 in the BOSCB

Revelation 22 in the BOSNC

Revelation 22 in the BOTLNT

Revelation 22 in the BOVCB

Revelation 22 in the BOYCB

Revelation 22 in the BPBB

Revelation 22 in the BPH

Revelation 22 in the BSB

Revelation 22 in the CCB

Revelation 22 in the CUV

Revelation 22 in the CUVS

Revelation 22 in the DBT

Revelation 22 in the DGDNT

Revelation 22 in the DHNT

Revelation 22 in the DNT

Revelation 22 in the ELBE

Revelation 22 in the EMTV

Revelation 22 in the ESV

Revelation 22 in the FBV

Revelation 22 in the FEB

Revelation 22 in the GGMNT

Revelation 22 in the GNT

Revelation 22 in the HARY

Revelation 22 in the HNT

Revelation 22 in the IRVA

Revelation 22 in the IRVB

Revelation 22 in the IRVG

Revelation 22 in the IRVH

Revelation 22 in the IRVK

Revelation 22 in the IRVM

Revelation 22 in the IRVM2

Revelation 22 in the IRVO

Revelation 22 in the IRVP

Revelation 22 in the IRVT

Revelation 22 in the IRVT2

Revelation 22 in the IRVU

Revelation 22 in the ISVN

Revelation 22 in the JSNT

Revelation 22 in the KAPI

Revelation 22 in the KBT1ETNIK

Revelation 22 in the KBV

Revelation 22 in the KJV

Revelation 22 in the KNFD

Revelation 22 in the LBA

Revelation 22 in the LBLA

Revelation 22 in the LNT

Revelation 22 in the LSV

Revelation 22 in the MAAL

Revelation 22 in the MBV

Revelation 22 in the MBV2

Revelation 22 in the MHNT

Revelation 22 in the MKNFD

Revelation 22 in the MNG

Revelation 22 in the MNT

Revelation 22 in the MNT2

Revelation 22 in the MRS1T

Revelation 22 in the NAA

Revelation 22 in the NASB

Revelation 22 in the NBLA

Revelation 22 in the NBS

Revelation 22 in the NBVTP

Revelation 22 in the NET2

Revelation 22 in the NIV11

Revelation 22 in the NNT

Revelation 22 in the NNT2

Revelation 22 in the NNT3

Revelation 22 in the PDDPT

Revelation 22 in the PFNT

Revelation 22 in the RMNT

Revelation 22 in the SBIAS

Revelation 22 in the SBIBS

Revelation 22 in the SBIBS2

Revelation 22 in the SBICS

Revelation 22 in the SBIDS

Revelation 22 in the SBIGS

Revelation 22 in the SBIHS

Revelation 22 in the SBIIS

Revelation 22 in the SBIIS2

Revelation 22 in the SBIIS3

Revelation 22 in the SBIKS

Revelation 22 in the SBIKS2

Revelation 22 in the SBIMS

Revelation 22 in the SBIOS

Revelation 22 in the SBIPS

Revelation 22 in the SBISS

Revelation 22 in the SBITS

Revelation 22 in the SBITS2

Revelation 22 in the SBITS3

Revelation 22 in the SBITS4

Revelation 22 in the SBIUS

Revelation 22 in the SBIVS

Revelation 22 in the SBT

Revelation 22 in the SBT1E

Revelation 22 in the SCHL

Revelation 22 in the SNT

Revelation 22 in the SUSU

Revelation 22 in the SUSU2

Revelation 22 in the SYNO

Revelation 22 in the TBIAOTANT

Revelation 22 in the TBT1E

Revelation 22 in the TBT1E2

Revelation 22 in the TFTIP

Revelation 22 in the TFTU

Revelation 22 in the TGNTATF3T

Revelation 22 in the THAI

Revelation 22 in the TNFD

Revelation 22 in the TNT

Revelation 22 in the TNTIK

Revelation 22 in the TNTIL

Revelation 22 in the TNTIN

Revelation 22 in the TNTIP

Revelation 22 in the TNTIZ

Revelation 22 in the TOMA

Revelation 22 in the TTENT

Revelation 22 in the UBG

Revelation 22 in the UGV

Revelation 22 in the UGV2

Revelation 22 in the UGV3

Revelation 22 in the VBL

Revelation 22 in the VDCC

Revelation 22 in the YALU

Revelation 22 in the YAPE

Revelation 22 in the YBVTP

Revelation 22 in the ZBP