Revelation 6 (BOICB)

1 Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!” 2 Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile. 3 Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!” 4 Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu. 5 Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya. 6 Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.” 7 Mgbe o meghere akara nke anọ, anụrụ m ka anụ nke anọ dị ndụ sịrị, “Bịa!” 8 Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha. 9 Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike. 10 Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?” 11 E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu. 12 Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara. 13 Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya. 14 Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha. 15 Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu, 16 ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị. 17 Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”

In Other Versions

Revelation 6 in the ANGEFD

Revelation 6 in the ANTPNG2D

Revelation 6 in the AS21

Revelation 6 in the BAGH

Revelation 6 in the BBPNG

Revelation 6 in the BBT1E

Revelation 6 in the BDS

Revelation 6 in the BEV

Revelation 6 in the BHAD

Revelation 6 in the BIB

Revelation 6 in the BLPT

Revelation 6 in the BNT

Revelation 6 in the BNTABOOT

Revelation 6 in the BNTLV

Revelation 6 in the BOATCB

Revelation 6 in the BOATCB2

Revelation 6 in the BOBCV

Revelation 6 in the BOCNT

Revelation 6 in the BOECS

Revelation 6 in the BOGWICC

Revelation 6 in the BOHCB

Revelation 6 in the BOHCV

Revelation 6 in the BOHLNT

Revelation 6 in the BOHNTLTAL

Revelation 6 in the BOILNTAP

Revelation 6 in the BOITCV

Revelation 6 in the BOKCV

Revelation 6 in the BOKCV2

Revelation 6 in the BOKHWOG

Revelation 6 in the BOKSSV

Revelation 6 in the BOLCB

Revelation 6 in the BOLCB2

Revelation 6 in the BOMCV

Revelation 6 in the BONAV

Revelation 6 in the BONCB

Revelation 6 in the BONLT

Revelation 6 in the BONUT2

Revelation 6 in the BOPLNT

Revelation 6 in the BOSCB

Revelation 6 in the BOSNC

Revelation 6 in the BOTLNT

Revelation 6 in the BOVCB

Revelation 6 in the BOYCB

Revelation 6 in the BPBB

Revelation 6 in the BPH

Revelation 6 in the BSB

Revelation 6 in the CCB

Revelation 6 in the CUV

Revelation 6 in the CUVS

Revelation 6 in the DBT

Revelation 6 in the DGDNT

Revelation 6 in the DHNT

Revelation 6 in the DNT

Revelation 6 in the ELBE

Revelation 6 in the EMTV

Revelation 6 in the ESV

Revelation 6 in the FBV

Revelation 6 in the FEB

Revelation 6 in the GGMNT

Revelation 6 in the GNT

Revelation 6 in the HARY

Revelation 6 in the HNT

Revelation 6 in the IRVA

Revelation 6 in the IRVB

Revelation 6 in the IRVG

Revelation 6 in the IRVH

Revelation 6 in the IRVK

Revelation 6 in the IRVM

Revelation 6 in the IRVM2

Revelation 6 in the IRVO

Revelation 6 in the IRVP

Revelation 6 in the IRVT

Revelation 6 in the IRVT2

Revelation 6 in the IRVU

Revelation 6 in the ISVN

Revelation 6 in the JSNT

Revelation 6 in the KAPI

Revelation 6 in the KBT1ETNIK

Revelation 6 in the KBV

Revelation 6 in the KJV

Revelation 6 in the KNFD

Revelation 6 in the LBA

Revelation 6 in the LBLA

Revelation 6 in the LNT

Revelation 6 in the LSV

Revelation 6 in the MAAL

Revelation 6 in the MBV

Revelation 6 in the MBV2

Revelation 6 in the MHNT

Revelation 6 in the MKNFD

Revelation 6 in the MNG

Revelation 6 in the MNT

Revelation 6 in the MNT2

Revelation 6 in the MRS1T

Revelation 6 in the NAA

Revelation 6 in the NASB

Revelation 6 in the NBLA

Revelation 6 in the NBS

Revelation 6 in the NBVTP

Revelation 6 in the NET2

Revelation 6 in the NIV11

Revelation 6 in the NNT

Revelation 6 in the NNT2

Revelation 6 in the NNT3

Revelation 6 in the PDDPT

Revelation 6 in the PFNT

Revelation 6 in the RMNT

Revelation 6 in the SBIAS

Revelation 6 in the SBIBS

Revelation 6 in the SBIBS2

Revelation 6 in the SBICS

Revelation 6 in the SBIDS

Revelation 6 in the SBIGS

Revelation 6 in the SBIHS

Revelation 6 in the SBIIS

Revelation 6 in the SBIIS2

Revelation 6 in the SBIIS3

Revelation 6 in the SBIKS

Revelation 6 in the SBIKS2

Revelation 6 in the SBIMS

Revelation 6 in the SBIOS

Revelation 6 in the SBIPS

Revelation 6 in the SBISS

Revelation 6 in the SBITS

Revelation 6 in the SBITS2

Revelation 6 in the SBITS3

Revelation 6 in the SBITS4

Revelation 6 in the SBIUS

Revelation 6 in the SBIVS

Revelation 6 in the SBT

Revelation 6 in the SBT1E

Revelation 6 in the SCHL

Revelation 6 in the SNT

Revelation 6 in the SUSU

Revelation 6 in the SUSU2

Revelation 6 in the SYNO

Revelation 6 in the TBIAOTANT

Revelation 6 in the TBT1E

Revelation 6 in the TBT1E2

Revelation 6 in the TFTIP

Revelation 6 in the TFTU

Revelation 6 in the TGNTATF3T

Revelation 6 in the THAI

Revelation 6 in the TNFD

Revelation 6 in the TNT

Revelation 6 in the TNTIK

Revelation 6 in the TNTIL

Revelation 6 in the TNTIN

Revelation 6 in the TNTIP

Revelation 6 in the TNTIZ

Revelation 6 in the TOMA

Revelation 6 in the TTENT

Revelation 6 in the UBG

Revelation 6 in the UGV

Revelation 6 in the UGV2

Revelation 6 in the UGV3

Revelation 6 in the VBL

Revelation 6 in the VDCC

Revelation 6 in the YALU

Revelation 6 in the YAPE

Revelation 6 in the YBVTP

Revelation 6 in the ZBP