Romans 5 (BOICB)
1 Ya mere, ebe e sitere nʼokwukwe mee ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume, udo dị ugbu a nʼetiti anyị na Chineke site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 2 Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara nke anyị na-eguzo nʼime ya ugbu a. Anyị nọ nʼọṅụ nweekwa olileanya na a ga-eme ka anyị keta oke nʼebube Chineke. 3 Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. 4 Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya. 5 Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ. 6 Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie. 7 A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ. 8 Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị. 9 Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke. 10 Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya. 11 Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a. 12 Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela. 13 Ma tupu e nye iwu, mmehie dị nʼụwa. Ma a dịghị agụkọta mmehie mgbe iwu na-adịghị. 14 Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa. 15 Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ. 16 Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị. 17 Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst. 18 Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume. 19 Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke. 20 Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa. 21 Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
In Other Versions
Romans 5 in the ANGEFD
Romans 5 in the ANTPNG2D
Romans 5 in the AS21
Romans 5 in the BAGH
Romans 5 in the BBPNG
Romans 5 in the BBT1E
Romans 5 in the BDS
Romans 5 in the BEV
Romans 5 in the BHAD
Romans 5 in the BIB
Romans 5 in the BLPT
Romans 5 in the BNT
Romans 5 in the BNTABOOT
Romans 5 in the BNTLV
Romans 5 in the BOATCB
Romans 5 in the BOATCB2
Romans 5 in the BOBCV
Romans 5 in the BOCNT
Romans 5 in the BOECS
Romans 5 in the BOGWICC
Romans 5 in the BOHCB
Romans 5 in the BOHCV
Romans 5 in the BOHLNT
Romans 5 in the BOHNTLTAL
Romans 5 in the BOILNTAP
Romans 5 in the BOITCV
Romans 5 in the BOKCV
Romans 5 in the BOKCV2
Romans 5 in the BOKHWOG
Romans 5 in the BOKSSV
Romans 5 in the BOLCB
Romans 5 in the BOLCB2
Romans 5 in the BOMCV
Romans 5 in the BONAV
Romans 5 in the BONCB
Romans 5 in the BONLT
Romans 5 in the BONUT2
Romans 5 in the BOPLNT
Romans 5 in the BOSCB
Romans 5 in the BOSNC
Romans 5 in the BOTLNT
Romans 5 in the BOVCB
Romans 5 in the BOYCB
Romans 5 in the BPBB
Romans 5 in the BPH
Romans 5 in the BSB
Romans 5 in the CCB
Romans 5 in the CUV
Romans 5 in the CUVS
Romans 5 in the DBT
Romans 5 in the DGDNT
Romans 5 in the DHNT
Romans 5 in the DNT
Romans 5 in the ELBE
Romans 5 in the EMTV
Romans 5 in the ESV
Romans 5 in the FBV
Romans 5 in the FEB
Romans 5 in the GGMNT
Romans 5 in the GNT
Romans 5 in the HARY
Romans 5 in the HNT
Romans 5 in the IRVA
Romans 5 in the IRVB
Romans 5 in the IRVG
Romans 5 in the IRVH
Romans 5 in the IRVK
Romans 5 in the IRVM
Romans 5 in the IRVM2
Romans 5 in the IRVO
Romans 5 in the IRVP
Romans 5 in the IRVT
Romans 5 in the IRVT2
Romans 5 in the IRVU
Romans 5 in the ISVN
Romans 5 in the JSNT
Romans 5 in the KAPI
Romans 5 in the KBT1ETNIK
Romans 5 in the KBV
Romans 5 in the KJV
Romans 5 in the KNFD
Romans 5 in the LBA
Romans 5 in the LBLA
Romans 5 in the LNT
Romans 5 in the LSV
Romans 5 in the MAAL
Romans 5 in the MBV
Romans 5 in the MBV2
Romans 5 in the MHNT
Romans 5 in the MKNFD
Romans 5 in the MNG
Romans 5 in the MNT
Romans 5 in the MNT2
Romans 5 in the MRS1T
Romans 5 in the NAA
Romans 5 in the NASB
Romans 5 in the NBLA
Romans 5 in the NBS
Romans 5 in the NBVTP
Romans 5 in the NET2
Romans 5 in the NIV11
Romans 5 in the NNT
Romans 5 in the NNT2
Romans 5 in the NNT3
Romans 5 in the PDDPT
Romans 5 in the PFNT
Romans 5 in the RMNT
Romans 5 in the SBIAS
Romans 5 in the SBIBS
Romans 5 in the SBIBS2
Romans 5 in the SBICS
Romans 5 in the SBIDS
Romans 5 in the SBIGS
Romans 5 in the SBIHS
Romans 5 in the SBIIS
Romans 5 in the SBIIS2
Romans 5 in the SBIIS3
Romans 5 in the SBIKS
Romans 5 in the SBIKS2
Romans 5 in the SBIMS
Romans 5 in the SBIOS
Romans 5 in the SBIPS
Romans 5 in the SBISS
Romans 5 in the SBITS
Romans 5 in the SBITS2
Romans 5 in the SBITS3
Romans 5 in the SBITS4
Romans 5 in the SBIUS
Romans 5 in the SBIVS
Romans 5 in the SBT
Romans 5 in the SBT1E
Romans 5 in the SCHL
Romans 5 in the SNT
Romans 5 in the SUSU
Romans 5 in the SUSU2
Romans 5 in the SYNO
Romans 5 in the TBIAOTANT
Romans 5 in the TBT1E
Romans 5 in the TBT1E2
Romans 5 in the TFTIP
Romans 5 in the TFTU
Romans 5 in the TGNTATF3T
Romans 5 in the THAI
Romans 5 in the TNFD
Romans 5 in the TNT
Romans 5 in the TNTIK
Romans 5 in the TNTIL
Romans 5 in the TNTIN
Romans 5 in the TNTIP
Romans 5 in the TNTIZ
Romans 5 in the TOMA
Romans 5 in the TTENT
Romans 5 in the UBG
Romans 5 in the UGV
Romans 5 in the UGV2
Romans 5 in the UGV3
Romans 5 in the VBL
Romans 5 in the VDCC
Romans 5 in the YALU
Romans 5 in the YAPE
Romans 5 in the YBVTP
Romans 5 in the ZBP