1 Corinthians 1 (BOICB)

1 Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis, 2 Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị: 3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4 Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. 5 Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. 6 Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. 7 Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 8 Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9 Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi. 10 Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu. 11 Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu. 12 Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.” 13 Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl? 14 Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs. 15 Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m. 16 (Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.) 17 Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu. 18 Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke. 19 E dere ya,“Aga m emebi amamihe ndị maara ihe.Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.” 20 Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? 21 Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere. 22 Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. 23 Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. 24 Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. 25 Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ. 26 Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. 27 Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. 28 Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. 29 Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ. 30 Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị. 31 Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”

In Other Versions

1 Corinthians 1 in the ANGEFD

1 Corinthians 1 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 1 in the AS21

1 Corinthians 1 in the BAGH

1 Corinthians 1 in the BBPNG

1 Corinthians 1 in the BBT1E

1 Corinthians 1 in the BDS

1 Corinthians 1 in the BEV

1 Corinthians 1 in the BHAD

1 Corinthians 1 in the BIB

1 Corinthians 1 in the BLPT

1 Corinthians 1 in the BNT

1 Corinthians 1 in the BNTABOOT

1 Corinthians 1 in the BNTLV

1 Corinthians 1 in the BOATCB

1 Corinthians 1 in the BOATCB2

1 Corinthians 1 in the BOBCV

1 Corinthians 1 in the BOCNT

1 Corinthians 1 in the BOECS

1 Corinthians 1 in the BOGWICC

1 Corinthians 1 in the BOHCB

1 Corinthians 1 in the BOHCV

1 Corinthians 1 in the BOHLNT

1 Corinthians 1 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 1 in the BOILNTAP

1 Corinthians 1 in the BOITCV

1 Corinthians 1 in the BOKCV

1 Corinthians 1 in the BOKCV2

1 Corinthians 1 in the BOKHWOG

1 Corinthians 1 in the BOKSSV

1 Corinthians 1 in the BOLCB

1 Corinthians 1 in the BOLCB2

1 Corinthians 1 in the BOMCV

1 Corinthians 1 in the BONAV

1 Corinthians 1 in the BONCB

1 Corinthians 1 in the BONLT

1 Corinthians 1 in the BONUT2

1 Corinthians 1 in the BOPLNT

1 Corinthians 1 in the BOSCB

1 Corinthians 1 in the BOSNC

1 Corinthians 1 in the BOTLNT

1 Corinthians 1 in the BOVCB

1 Corinthians 1 in the BOYCB

1 Corinthians 1 in the BPBB

1 Corinthians 1 in the BPH

1 Corinthians 1 in the BSB

1 Corinthians 1 in the CCB

1 Corinthians 1 in the CUV

1 Corinthians 1 in the CUVS

1 Corinthians 1 in the DBT

1 Corinthians 1 in the DGDNT

1 Corinthians 1 in the DHNT

1 Corinthians 1 in the DNT

1 Corinthians 1 in the ELBE

1 Corinthians 1 in the EMTV

1 Corinthians 1 in the ESV

1 Corinthians 1 in the FBV

1 Corinthians 1 in the FEB

1 Corinthians 1 in the GGMNT

1 Corinthians 1 in the GNT

1 Corinthians 1 in the HARY

1 Corinthians 1 in the HNT

1 Corinthians 1 in the IRVA

1 Corinthians 1 in the IRVB

1 Corinthians 1 in the IRVG

1 Corinthians 1 in the IRVH

1 Corinthians 1 in the IRVK

1 Corinthians 1 in the IRVM

1 Corinthians 1 in the IRVM2

1 Corinthians 1 in the IRVO

1 Corinthians 1 in the IRVP

1 Corinthians 1 in the IRVT

1 Corinthians 1 in the IRVT2

1 Corinthians 1 in the IRVU

1 Corinthians 1 in the ISVN

1 Corinthians 1 in the JSNT

1 Corinthians 1 in the KAPI

1 Corinthians 1 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 1 in the KBV

1 Corinthians 1 in the KJV

1 Corinthians 1 in the KNFD

1 Corinthians 1 in the LBA

1 Corinthians 1 in the LBLA

1 Corinthians 1 in the LNT

1 Corinthians 1 in the LSV

1 Corinthians 1 in the MAAL

1 Corinthians 1 in the MBV

1 Corinthians 1 in the MBV2

1 Corinthians 1 in the MHNT

1 Corinthians 1 in the MKNFD

1 Corinthians 1 in the MNG

1 Corinthians 1 in the MNT

1 Corinthians 1 in the MNT2

1 Corinthians 1 in the MRS1T

1 Corinthians 1 in the NAA

1 Corinthians 1 in the NASB

1 Corinthians 1 in the NBLA

1 Corinthians 1 in the NBS

1 Corinthians 1 in the NBVTP

1 Corinthians 1 in the NET2

1 Corinthians 1 in the NIV11

1 Corinthians 1 in the NNT

1 Corinthians 1 in the NNT2

1 Corinthians 1 in the NNT3

1 Corinthians 1 in the PDDPT

1 Corinthians 1 in the PFNT

1 Corinthians 1 in the RMNT

1 Corinthians 1 in the SBIAS

1 Corinthians 1 in the SBIBS

1 Corinthians 1 in the SBIBS2

1 Corinthians 1 in the SBICS

1 Corinthians 1 in the SBIDS

1 Corinthians 1 in the SBIGS

1 Corinthians 1 in the SBIHS

1 Corinthians 1 in the SBIIS

1 Corinthians 1 in the SBIIS2

1 Corinthians 1 in the SBIIS3

1 Corinthians 1 in the SBIKS

1 Corinthians 1 in the SBIKS2

1 Corinthians 1 in the SBIMS

1 Corinthians 1 in the SBIOS

1 Corinthians 1 in the SBIPS

1 Corinthians 1 in the SBISS

1 Corinthians 1 in the SBITS

1 Corinthians 1 in the SBITS2

1 Corinthians 1 in the SBITS3

1 Corinthians 1 in the SBITS4

1 Corinthians 1 in the SBIUS

1 Corinthians 1 in the SBIVS

1 Corinthians 1 in the SBT

1 Corinthians 1 in the SBT1E

1 Corinthians 1 in the SCHL

1 Corinthians 1 in the SNT

1 Corinthians 1 in the SUSU

1 Corinthians 1 in the SUSU2

1 Corinthians 1 in the SYNO

1 Corinthians 1 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 1 in the TBT1E

1 Corinthians 1 in the TBT1E2

1 Corinthians 1 in the TFTIP

1 Corinthians 1 in the TFTU

1 Corinthians 1 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 1 in the THAI

1 Corinthians 1 in the TNFD

1 Corinthians 1 in the TNT

1 Corinthians 1 in the TNTIK

1 Corinthians 1 in the TNTIL

1 Corinthians 1 in the TNTIN

1 Corinthians 1 in the TNTIP

1 Corinthians 1 in the TNTIZ

1 Corinthians 1 in the TOMA

1 Corinthians 1 in the TTENT

1 Corinthians 1 in the UBG

1 Corinthians 1 in the UGV

1 Corinthians 1 in the UGV2

1 Corinthians 1 in the UGV3

1 Corinthians 1 in the VBL

1 Corinthians 1 in the VDCC

1 Corinthians 1 in the YALU

1 Corinthians 1 in the YAPE

1 Corinthians 1 in the YBVTP

1 Corinthians 1 in the ZBP