1 Samuel 12 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze. 2 Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa. 3 Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu ONYENWE ANYỊ na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.” 4 Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.” 5 Samuel zara sị ha, “ONYENWE ANYỊ bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.”Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!” 6 Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ ONYENWE ANYỊ họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta. 7 Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu ONYENWE ANYỊ ka m chetara unu ihe ọma niile ONYENWE ANYỊ meere unu na nna nna unu ha. 8 “Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru ONYENWE ANYỊ ka o nyere ha aka. ONYENWE ANYỊ zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a. 9 “Ma ha chefuru ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ. 10 Ha tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtala ONYENWE ANYỊ azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’ 11 ONYENWE ANYỊ zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo. 12 “Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ eze unu. 13 Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ ONYENWE ANYỊ ka o nye unu ya; ONYENWE ANYỊ azakwala arịrịọ unu. 14 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu ONYENWE ANYỊ, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ihe niile ga-adị mma. 15 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha. 16 “Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile ONYENWE ANYỊ na-aga ịrụ. 17 Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka ONYENWE ANYỊ zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya ONYENWE ANYỊ mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.” 18 Mgbe ahụ Samuel kpọkuru ONYENWE ANYỊ, ONYENWE ANYỊ zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ ONYENWE ANYỊ na Samuel egwu. 19 Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.” 20 Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee ONYENWE ANYỊ ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla. 21 Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu. 22 ONYENWE ANYỊ agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ ONYENWE ANYỊ ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya. 23 Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide ONYENWE ANYỊ site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi. 24 Naanị tụọnụ egwu ONYENWE ANYỊ, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu. 25 Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”

In Other Versions

1 Samuel 12 in the ANGEFD

1 Samuel 12 in the ANTPNG2D

1 Samuel 12 in the AS21

1 Samuel 12 in the BAGH

1 Samuel 12 in the BBPNG

1 Samuel 12 in the BBT1E

1 Samuel 12 in the BDS

1 Samuel 12 in the BEV

1 Samuel 12 in the BHAD

1 Samuel 12 in the BIB

1 Samuel 12 in the BLPT

1 Samuel 12 in the BNT

1 Samuel 12 in the BNTABOOT

1 Samuel 12 in the BNTLV

1 Samuel 12 in the BOATCB

1 Samuel 12 in the BOATCB2

1 Samuel 12 in the BOBCV

1 Samuel 12 in the BOCNT

1 Samuel 12 in the BOECS

1 Samuel 12 in the BOGWICC

1 Samuel 12 in the BOHCB

1 Samuel 12 in the BOHCV

1 Samuel 12 in the BOHLNT

1 Samuel 12 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 12 in the BOILNTAP

1 Samuel 12 in the BOITCV

1 Samuel 12 in the BOKCV

1 Samuel 12 in the BOKCV2

1 Samuel 12 in the BOKHWOG

1 Samuel 12 in the BOKSSV

1 Samuel 12 in the BOLCB

1 Samuel 12 in the BOLCB2

1 Samuel 12 in the BOMCV

1 Samuel 12 in the BONAV

1 Samuel 12 in the BONCB

1 Samuel 12 in the BONLT

1 Samuel 12 in the BONUT2

1 Samuel 12 in the BOPLNT

1 Samuel 12 in the BOSCB

1 Samuel 12 in the BOSNC

1 Samuel 12 in the BOTLNT

1 Samuel 12 in the BOVCB

1 Samuel 12 in the BOYCB

1 Samuel 12 in the BPBB

1 Samuel 12 in the BPH

1 Samuel 12 in the BSB

1 Samuel 12 in the CCB

1 Samuel 12 in the CUV

1 Samuel 12 in the CUVS

1 Samuel 12 in the DBT

1 Samuel 12 in the DGDNT

1 Samuel 12 in the DHNT

1 Samuel 12 in the DNT

1 Samuel 12 in the ELBE

1 Samuel 12 in the EMTV

1 Samuel 12 in the ESV

1 Samuel 12 in the FBV

1 Samuel 12 in the FEB

1 Samuel 12 in the GGMNT

1 Samuel 12 in the GNT

1 Samuel 12 in the HARY

1 Samuel 12 in the HNT

1 Samuel 12 in the IRVA

1 Samuel 12 in the IRVB

1 Samuel 12 in the IRVG

1 Samuel 12 in the IRVH

1 Samuel 12 in the IRVK

1 Samuel 12 in the IRVM

1 Samuel 12 in the IRVM2

1 Samuel 12 in the IRVO

1 Samuel 12 in the IRVP

1 Samuel 12 in the IRVT

1 Samuel 12 in the IRVT2

1 Samuel 12 in the IRVU

1 Samuel 12 in the ISVN

1 Samuel 12 in the JSNT

1 Samuel 12 in the KAPI

1 Samuel 12 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 12 in the KBV

1 Samuel 12 in the KJV

1 Samuel 12 in the KNFD

1 Samuel 12 in the LBA

1 Samuel 12 in the LBLA

1 Samuel 12 in the LNT

1 Samuel 12 in the LSV

1 Samuel 12 in the MAAL

1 Samuel 12 in the MBV

1 Samuel 12 in the MBV2

1 Samuel 12 in the MHNT

1 Samuel 12 in the MKNFD

1 Samuel 12 in the MNG

1 Samuel 12 in the MNT

1 Samuel 12 in the MNT2

1 Samuel 12 in the MRS1T

1 Samuel 12 in the NAA

1 Samuel 12 in the NASB

1 Samuel 12 in the NBLA

1 Samuel 12 in the NBS

1 Samuel 12 in the NBVTP

1 Samuel 12 in the NET2

1 Samuel 12 in the NIV11

1 Samuel 12 in the NNT

1 Samuel 12 in the NNT2

1 Samuel 12 in the NNT3

1 Samuel 12 in the PDDPT

1 Samuel 12 in the PFNT

1 Samuel 12 in the RMNT

1 Samuel 12 in the SBIAS

1 Samuel 12 in the SBIBS

1 Samuel 12 in the SBIBS2

1 Samuel 12 in the SBICS

1 Samuel 12 in the SBIDS

1 Samuel 12 in the SBIGS

1 Samuel 12 in the SBIHS

1 Samuel 12 in the SBIIS

1 Samuel 12 in the SBIIS2

1 Samuel 12 in the SBIIS3

1 Samuel 12 in the SBIKS

1 Samuel 12 in the SBIKS2

1 Samuel 12 in the SBIMS

1 Samuel 12 in the SBIOS

1 Samuel 12 in the SBIPS

1 Samuel 12 in the SBISS

1 Samuel 12 in the SBITS

1 Samuel 12 in the SBITS2

1 Samuel 12 in the SBITS3

1 Samuel 12 in the SBITS4

1 Samuel 12 in the SBIUS

1 Samuel 12 in the SBIVS

1 Samuel 12 in the SBT

1 Samuel 12 in the SBT1E

1 Samuel 12 in the SCHL

1 Samuel 12 in the SNT

1 Samuel 12 in the SUSU

1 Samuel 12 in the SUSU2

1 Samuel 12 in the SYNO

1 Samuel 12 in the TBIAOTANT

1 Samuel 12 in the TBT1E

1 Samuel 12 in the TBT1E2

1 Samuel 12 in the TFTIP

1 Samuel 12 in the TFTU

1 Samuel 12 in the TGNTATF3T

1 Samuel 12 in the THAI

1 Samuel 12 in the TNFD

1 Samuel 12 in the TNT

1 Samuel 12 in the TNTIK

1 Samuel 12 in the TNTIL

1 Samuel 12 in the TNTIN

1 Samuel 12 in the TNTIP

1 Samuel 12 in the TNTIZ

1 Samuel 12 in the TOMA

1 Samuel 12 in the TTENT

1 Samuel 12 in the UBG

1 Samuel 12 in the UGV

1 Samuel 12 in the UGV2

1 Samuel 12 in the UGV3

1 Samuel 12 in the VBL

1 Samuel 12 in the VDCC

1 Samuel 12 in the YALU

1 Samuel 12 in the YAPE

1 Samuel 12 in the YBVTP

1 Samuel 12 in the ZBP