Deuteronomy 32 (BOICB)

1 Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu!Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ. 2 Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzoka okwu m daa dịka igirigi,ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa,dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta. 3 Aga m eto aha ONYENWE ANYỊtoonu ịdị ukwuu Chineke anyị! 4 Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke,ụzọ ya niile ziri ezi.Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ,onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. 5 Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya,ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe 6 Ọ bụ otu a ka unu si emeso ONYENWE ANYỊunu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? ONYENWE ANYỊ ọ bụghị nna unu, onye kere unu,onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike? 7 Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,tulee ọgbọ ndị ahụ gara agajụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị.Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya. 8 Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,mgbe o kesara ụmụ mmadụ,mgbe o guzobere oke ala nye ndị niiledịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. 9 Nʼihi na oke ONYENWE ANYỊ nwetara bụ ndị yaJekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. 10 Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ.O kpuchitere ya, lezie ya anya,o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, 11 dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,nke na-ebu ha na nku ya, 12 ONYENWE ANYỊ naanị ya duru ya,chi ala ọzọ esokwaghị ya. 13 O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ,jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya.O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya,ya na mmanụ si nʼoke nkume, 14 na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ,na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba,na oke ebule Bashan dị ezi mma,tinyere ezi obi ọka wiiti.Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị. 15 Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya,ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya.Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya,jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya. 16 Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha. 17 Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,bụ chi ndị ha na-amaghị,chi ndị ka pụtara ọhụrụ,chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. 18 Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. 19 ONYENWE ANYỊ hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. 20 “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. 21 Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. 22 Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. 23 “Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,zipụ àkụ m niile megide ha. 24 Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. 25 Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. 26 Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ. 27 Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị,‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri,ọ bụghị ONYENWE ANYỊ mere ihe ndị a niile.’ ” 28 Ha bụ mba na-enweghị uche,ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha. 29 A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uchenakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ. 30 Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ,ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha,ma ọ bụghị na ONYENWE ANYỊ echepụla ihu ya nʼebe ha nọ? 31 Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị,dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo. 32 Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm,na nʼubi dị na Gọmọramkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi,ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu. 33 Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ,elo ajụala na-ebute ọnwụ. 34 “Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge,chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m? 35 Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi.Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ,ụbọchị mbibi ha na-abịa nso,ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.” 36 ONYENWE ANYỊ ga-ekpe ndị ya ikpe,ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya,mgbe ọ hụrụ na ike ha nwere agwụla,mgbe otu onye na-agaghị afọdụ, ohu na onye nwe onwe ya. 37 Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ,bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya, 38 chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha,ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ?Ha bilie bịa nyere unu aka!Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!” 39 “Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya!Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m.Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ.Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya,mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m. 40 Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị,dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, 41 mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma,mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe,aga m abọ ọbọ megide ndị iro,kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị. 42 Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ,ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ,ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha,na isi ndị ndu ndị iro.” 43 Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya,kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha. 44 Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel. 45 Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel, 46 ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. 47 Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.” 48 Nʼotu ụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 49 “Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha. 50 Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha. 51 Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel. 52 Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”

In Other Versions

Deuteronomy 32 in the ANGEFD

Deuteronomy 32 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 32 in the AS21

Deuteronomy 32 in the BAGH

Deuteronomy 32 in the BBPNG

Deuteronomy 32 in the BBT1E

Deuteronomy 32 in the BDS

Deuteronomy 32 in the BEV

Deuteronomy 32 in the BHAD

Deuteronomy 32 in the BIB

Deuteronomy 32 in the BLPT

Deuteronomy 32 in the BNT

Deuteronomy 32 in the BNTABOOT

Deuteronomy 32 in the BNTLV

Deuteronomy 32 in the BOATCB

Deuteronomy 32 in the BOATCB2

Deuteronomy 32 in the BOBCV

Deuteronomy 32 in the BOCNT

Deuteronomy 32 in the BOECS

Deuteronomy 32 in the BOGWICC

Deuteronomy 32 in the BOHCB

Deuteronomy 32 in the BOHCV

Deuteronomy 32 in the BOHLNT

Deuteronomy 32 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 32 in the BOILNTAP

Deuteronomy 32 in the BOITCV

Deuteronomy 32 in the BOKCV

Deuteronomy 32 in the BOKCV2

Deuteronomy 32 in the BOKHWOG

Deuteronomy 32 in the BOKSSV

Deuteronomy 32 in the BOLCB

Deuteronomy 32 in the BOLCB2

Deuteronomy 32 in the BOMCV

Deuteronomy 32 in the BONAV

Deuteronomy 32 in the BONCB

Deuteronomy 32 in the BONLT

Deuteronomy 32 in the BONUT2

Deuteronomy 32 in the BOPLNT

Deuteronomy 32 in the BOSCB

Deuteronomy 32 in the BOSNC

Deuteronomy 32 in the BOTLNT

Deuteronomy 32 in the BOVCB

Deuteronomy 32 in the BOYCB

Deuteronomy 32 in the BPBB

Deuteronomy 32 in the BPH

Deuteronomy 32 in the BSB

Deuteronomy 32 in the CCB

Deuteronomy 32 in the CUV

Deuteronomy 32 in the CUVS

Deuteronomy 32 in the DBT

Deuteronomy 32 in the DGDNT

Deuteronomy 32 in the DHNT

Deuteronomy 32 in the DNT

Deuteronomy 32 in the ELBE

Deuteronomy 32 in the EMTV

Deuteronomy 32 in the ESV

Deuteronomy 32 in the FBV

Deuteronomy 32 in the FEB

Deuteronomy 32 in the GGMNT

Deuteronomy 32 in the GNT

Deuteronomy 32 in the HARY

Deuteronomy 32 in the HNT

Deuteronomy 32 in the IRVA

Deuteronomy 32 in the IRVB

Deuteronomy 32 in the IRVG

Deuteronomy 32 in the IRVH

Deuteronomy 32 in the IRVK

Deuteronomy 32 in the IRVM

Deuteronomy 32 in the IRVM2

Deuteronomy 32 in the IRVO

Deuteronomy 32 in the IRVP

Deuteronomy 32 in the IRVT

Deuteronomy 32 in the IRVT2

Deuteronomy 32 in the IRVU

Deuteronomy 32 in the ISVN

Deuteronomy 32 in the JSNT

Deuteronomy 32 in the KAPI

Deuteronomy 32 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 32 in the KBV

Deuteronomy 32 in the KJV

Deuteronomy 32 in the KNFD

Deuteronomy 32 in the LBA

Deuteronomy 32 in the LBLA

Deuteronomy 32 in the LNT

Deuteronomy 32 in the LSV

Deuteronomy 32 in the MAAL

Deuteronomy 32 in the MBV

Deuteronomy 32 in the MBV2

Deuteronomy 32 in the MHNT

Deuteronomy 32 in the MKNFD

Deuteronomy 32 in the MNG

Deuteronomy 32 in the MNT

Deuteronomy 32 in the MNT2

Deuteronomy 32 in the MRS1T

Deuteronomy 32 in the NAA

Deuteronomy 32 in the NASB

Deuteronomy 32 in the NBLA

Deuteronomy 32 in the NBS

Deuteronomy 32 in the NBVTP

Deuteronomy 32 in the NET2

Deuteronomy 32 in the NIV11

Deuteronomy 32 in the NNT

Deuteronomy 32 in the NNT2

Deuteronomy 32 in the NNT3

Deuteronomy 32 in the PDDPT

Deuteronomy 32 in the PFNT

Deuteronomy 32 in the RMNT

Deuteronomy 32 in the SBIAS

Deuteronomy 32 in the SBIBS

Deuteronomy 32 in the SBIBS2

Deuteronomy 32 in the SBICS

Deuteronomy 32 in the SBIDS

Deuteronomy 32 in the SBIGS

Deuteronomy 32 in the SBIHS

Deuteronomy 32 in the SBIIS

Deuteronomy 32 in the SBIIS2

Deuteronomy 32 in the SBIIS3

Deuteronomy 32 in the SBIKS

Deuteronomy 32 in the SBIKS2

Deuteronomy 32 in the SBIMS

Deuteronomy 32 in the SBIOS

Deuteronomy 32 in the SBIPS

Deuteronomy 32 in the SBISS

Deuteronomy 32 in the SBITS

Deuteronomy 32 in the SBITS2

Deuteronomy 32 in the SBITS3

Deuteronomy 32 in the SBITS4

Deuteronomy 32 in the SBIUS

Deuteronomy 32 in the SBIVS

Deuteronomy 32 in the SBT

Deuteronomy 32 in the SBT1E

Deuteronomy 32 in the SCHL

Deuteronomy 32 in the SNT

Deuteronomy 32 in the SUSU

Deuteronomy 32 in the SUSU2

Deuteronomy 32 in the SYNO

Deuteronomy 32 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 32 in the TBT1E

Deuteronomy 32 in the TBT1E2

Deuteronomy 32 in the TFTIP

Deuteronomy 32 in the TFTU

Deuteronomy 32 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 32 in the THAI

Deuteronomy 32 in the TNFD

Deuteronomy 32 in the TNT

Deuteronomy 32 in the TNTIK

Deuteronomy 32 in the TNTIL

Deuteronomy 32 in the TNTIN

Deuteronomy 32 in the TNTIP

Deuteronomy 32 in the TNTIZ

Deuteronomy 32 in the TOMA

Deuteronomy 32 in the TTENT

Deuteronomy 32 in the UBG

Deuteronomy 32 in the UGV

Deuteronomy 32 in the UGV2

Deuteronomy 32 in the UGV3

Deuteronomy 32 in the VBL

Deuteronomy 32 in the VDCC

Deuteronomy 32 in the YALU

Deuteronomy 32 in the YAPE

Deuteronomy 32 in the YBVTP

Deuteronomy 32 in the ZBP