Exodus 35 (BOICB)

1 Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere nke unu na-aghaghị idebe. 2 Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye ONYENWE ANYỊ. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ. 3 Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.” 4 Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere, 5 sitenụ nʼihe unu nwere wetara ONYENWE ANYỊ onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara ONYENWE ANYỊ onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz, 6 ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha,na ajị ewu; 7 akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri,na osisi akashia; 8 mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ,ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; 9 nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi. 10 “Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile ONYENWE ANYỊ nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a: 11 “ụlọ nzute ahụ, na ihe mkpuchi ya, na nko ya niile, na mbudo ibo ya, na mkpọrọ osisi ya, na ogidi ya, na ụkwụ ya niile. 12 Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ, 13 na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu ONYENWE ANYỊ. 14 Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ; 15 nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee;akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ; 16 ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile,efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya. 17 Akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ na ogidi ha, na ihe ndọkwasị ya, nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; 18 ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha, 19 uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.” 20 Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ. 21 Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ. 22 Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara ONYENWE ANYỊ onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. 23 Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri. 24 Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere ONYENWE ANYỊ, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ. 25 Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye. 26 Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche. 27 Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ. 28 Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 29 Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere ONYENWE ANYỊ onyinye afọ ofufu. 30 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, ONYENWE ANYỊ ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda. 31 O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche. 32 Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 33 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche. 34 Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe. 35 O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”

In Other Versions

Exodus 35 in the ANGEFD

Exodus 35 in the ANTPNG2D

Exodus 35 in the AS21

Exodus 35 in the BAGH

Exodus 35 in the BBPNG

Exodus 35 in the BBT1E

Exodus 35 in the BDS

Exodus 35 in the BEV

Exodus 35 in the BHAD

Exodus 35 in the BIB

Exodus 35 in the BLPT

Exodus 35 in the BNT

Exodus 35 in the BNTABOOT

Exodus 35 in the BNTLV

Exodus 35 in the BOATCB

Exodus 35 in the BOATCB2

Exodus 35 in the BOBCV

Exodus 35 in the BOCNT

Exodus 35 in the BOECS

Exodus 35 in the BOGWICC

Exodus 35 in the BOHCB

Exodus 35 in the BOHCV

Exodus 35 in the BOHLNT

Exodus 35 in the BOHNTLTAL

Exodus 35 in the BOILNTAP

Exodus 35 in the BOITCV

Exodus 35 in the BOKCV

Exodus 35 in the BOKCV2

Exodus 35 in the BOKHWOG

Exodus 35 in the BOKSSV

Exodus 35 in the BOLCB

Exodus 35 in the BOLCB2

Exodus 35 in the BOMCV

Exodus 35 in the BONAV

Exodus 35 in the BONCB

Exodus 35 in the BONLT

Exodus 35 in the BONUT2

Exodus 35 in the BOPLNT

Exodus 35 in the BOSCB

Exodus 35 in the BOSNC

Exodus 35 in the BOTLNT

Exodus 35 in the BOVCB

Exodus 35 in the BOYCB

Exodus 35 in the BPBB

Exodus 35 in the BPH

Exodus 35 in the BSB

Exodus 35 in the CCB

Exodus 35 in the CUV

Exodus 35 in the CUVS

Exodus 35 in the DBT

Exodus 35 in the DGDNT

Exodus 35 in the DHNT

Exodus 35 in the DNT

Exodus 35 in the ELBE

Exodus 35 in the EMTV

Exodus 35 in the ESV

Exodus 35 in the FBV

Exodus 35 in the FEB

Exodus 35 in the GGMNT

Exodus 35 in the GNT

Exodus 35 in the HARY

Exodus 35 in the HNT

Exodus 35 in the IRVA

Exodus 35 in the IRVB

Exodus 35 in the IRVG

Exodus 35 in the IRVH

Exodus 35 in the IRVK

Exodus 35 in the IRVM

Exodus 35 in the IRVM2

Exodus 35 in the IRVO

Exodus 35 in the IRVP

Exodus 35 in the IRVT

Exodus 35 in the IRVT2

Exodus 35 in the IRVU

Exodus 35 in the ISVN

Exodus 35 in the JSNT

Exodus 35 in the KAPI

Exodus 35 in the KBT1ETNIK

Exodus 35 in the KBV

Exodus 35 in the KJV

Exodus 35 in the KNFD

Exodus 35 in the LBA

Exodus 35 in the LBLA

Exodus 35 in the LNT

Exodus 35 in the LSV

Exodus 35 in the MAAL

Exodus 35 in the MBV

Exodus 35 in the MBV2

Exodus 35 in the MHNT

Exodus 35 in the MKNFD

Exodus 35 in the MNG

Exodus 35 in the MNT

Exodus 35 in the MNT2

Exodus 35 in the MRS1T

Exodus 35 in the NAA

Exodus 35 in the NASB

Exodus 35 in the NBLA

Exodus 35 in the NBS

Exodus 35 in the NBVTP

Exodus 35 in the NET2

Exodus 35 in the NIV11

Exodus 35 in the NNT

Exodus 35 in the NNT2

Exodus 35 in the NNT3

Exodus 35 in the PDDPT

Exodus 35 in the PFNT

Exodus 35 in the RMNT

Exodus 35 in the SBIAS

Exodus 35 in the SBIBS

Exodus 35 in the SBIBS2

Exodus 35 in the SBICS

Exodus 35 in the SBIDS

Exodus 35 in the SBIGS

Exodus 35 in the SBIHS

Exodus 35 in the SBIIS

Exodus 35 in the SBIIS2

Exodus 35 in the SBIIS3

Exodus 35 in the SBIKS

Exodus 35 in the SBIKS2

Exodus 35 in the SBIMS

Exodus 35 in the SBIOS

Exodus 35 in the SBIPS

Exodus 35 in the SBISS

Exodus 35 in the SBITS

Exodus 35 in the SBITS2

Exodus 35 in the SBITS3

Exodus 35 in the SBITS4

Exodus 35 in the SBIUS

Exodus 35 in the SBIVS

Exodus 35 in the SBT

Exodus 35 in the SBT1E

Exodus 35 in the SCHL

Exodus 35 in the SNT

Exodus 35 in the SUSU

Exodus 35 in the SUSU2

Exodus 35 in the SYNO

Exodus 35 in the TBIAOTANT

Exodus 35 in the TBT1E

Exodus 35 in the TBT1E2

Exodus 35 in the TFTIP

Exodus 35 in the TFTU

Exodus 35 in the TGNTATF3T

Exodus 35 in the THAI

Exodus 35 in the TNFD

Exodus 35 in the TNT

Exodus 35 in the TNTIK

Exodus 35 in the TNTIL

Exodus 35 in the TNTIN

Exodus 35 in the TNTIP

Exodus 35 in the TNTIZ

Exodus 35 in the TOMA

Exodus 35 in the TTENT

Exodus 35 in the UBG

Exodus 35 in the UGV

Exodus 35 in the UGV2

Exodus 35 in the UGV3

Exodus 35 in the VBL

Exodus 35 in the VDCC

Exodus 35 in the YALU

Exodus 35 in the YAPE

Exodus 35 in the YBVTP

Exodus 35 in the ZBP