Ezekiel 12 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi. 3 “Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi. 4 Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ. 5 Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ. 6 Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.” 7 Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya. 8 Nʼụtụtụ echi ya, okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere m, 9 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’ 10 “Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’ 11 Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’“Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha. 12 “Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ. 13 Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya. 14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ. 15 “Ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile. 16 Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.” 17 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 18 “Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19 Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 21 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 22 “Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’ 23 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu. 24 Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel. 25 Ma mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.’ ” 26 Okwu nke ONYENWE ANYỊ bịakwutere m, 27 “Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’ 28 “Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 12 in the ANGEFD

Ezekiel 12 in the ANTPNG2D

Ezekiel 12 in the AS21

Ezekiel 12 in the BAGH

Ezekiel 12 in the BBPNG

Ezekiel 12 in the BBT1E

Ezekiel 12 in the BDS

Ezekiel 12 in the BEV

Ezekiel 12 in the BHAD

Ezekiel 12 in the BIB

Ezekiel 12 in the BLPT

Ezekiel 12 in the BNT

Ezekiel 12 in the BNTABOOT

Ezekiel 12 in the BNTLV

Ezekiel 12 in the BOATCB

Ezekiel 12 in the BOATCB2

Ezekiel 12 in the BOBCV

Ezekiel 12 in the BOCNT

Ezekiel 12 in the BOECS

Ezekiel 12 in the BOGWICC

Ezekiel 12 in the BOHCB

Ezekiel 12 in the BOHCV

Ezekiel 12 in the BOHLNT

Ezekiel 12 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 12 in the BOILNTAP

Ezekiel 12 in the BOITCV

Ezekiel 12 in the BOKCV

Ezekiel 12 in the BOKCV2

Ezekiel 12 in the BOKHWOG

Ezekiel 12 in the BOKSSV

Ezekiel 12 in the BOLCB

Ezekiel 12 in the BOLCB2

Ezekiel 12 in the BOMCV

Ezekiel 12 in the BONAV

Ezekiel 12 in the BONCB

Ezekiel 12 in the BONLT

Ezekiel 12 in the BONUT2

Ezekiel 12 in the BOPLNT

Ezekiel 12 in the BOSCB

Ezekiel 12 in the BOSNC

Ezekiel 12 in the BOTLNT

Ezekiel 12 in the BOVCB

Ezekiel 12 in the BOYCB

Ezekiel 12 in the BPBB

Ezekiel 12 in the BPH

Ezekiel 12 in the BSB

Ezekiel 12 in the CCB

Ezekiel 12 in the CUV

Ezekiel 12 in the CUVS

Ezekiel 12 in the DBT

Ezekiel 12 in the DGDNT

Ezekiel 12 in the DHNT

Ezekiel 12 in the DNT

Ezekiel 12 in the ELBE

Ezekiel 12 in the EMTV

Ezekiel 12 in the ESV

Ezekiel 12 in the FBV

Ezekiel 12 in the FEB

Ezekiel 12 in the GGMNT

Ezekiel 12 in the GNT

Ezekiel 12 in the HARY

Ezekiel 12 in the HNT

Ezekiel 12 in the IRVA

Ezekiel 12 in the IRVB

Ezekiel 12 in the IRVG

Ezekiel 12 in the IRVH

Ezekiel 12 in the IRVK

Ezekiel 12 in the IRVM

Ezekiel 12 in the IRVM2

Ezekiel 12 in the IRVO

Ezekiel 12 in the IRVP

Ezekiel 12 in the IRVT

Ezekiel 12 in the IRVT2

Ezekiel 12 in the IRVU

Ezekiel 12 in the ISVN

Ezekiel 12 in the JSNT

Ezekiel 12 in the KAPI

Ezekiel 12 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 12 in the KBV

Ezekiel 12 in the KJV

Ezekiel 12 in the KNFD

Ezekiel 12 in the LBA

Ezekiel 12 in the LBLA

Ezekiel 12 in the LNT

Ezekiel 12 in the LSV

Ezekiel 12 in the MAAL

Ezekiel 12 in the MBV

Ezekiel 12 in the MBV2

Ezekiel 12 in the MHNT

Ezekiel 12 in the MKNFD

Ezekiel 12 in the MNG

Ezekiel 12 in the MNT

Ezekiel 12 in the MNT2

Ezekiel 12 in the MRS1T

Ezekiel 12 in the NAA

Ezekiel 12 in the NASB

Ezekiel 12 in the NBLA

Ezekiel 12 in the NBS

Ezekiel 12 in the NBVTP

Ezekiel 12 in the NET2

Ezekiel 12 in the NIV11

Ezekiel 12 in the NNT

Ezekiel 12 in the NNT2

Ezekiel 12 in the NNT3

Ezekiel 12 in the PDDPT

Ezekiel 12 in the PFNT

Ezekiel 12 in the RMNT

Ezekiel 12 in the SBIAS

Ezekiel 12 in the SBIBS

Ezekiel 12 in the SBIBS2

Ezekiel 12 in the SBICS

Ezekiel 12 in the SBIDS

Ezekiel 12 in the SBIGS

Ezekiel 12 in the SBIHS

Ezekiel 12 in the SBIIS

Ezekiel 12 in the SBIIS2

Ezekiel 12 in the SBIIS3

Ezekiel 12 in the SBIKS

Ezekiel 12 in the SBIKS2

Ezekiel 12 in the SBIMS

Ezekiel 12 in the SBIOS

Ezekiel 12 in the SBIPS

Ezekiel 12 in the SBISS

Ezekiel 12 in the SBITS

Ezekiel 12 in the SBITS2

Ezekiel 12 in the SBITS3

Ezekiel 12 in the SBITS4

Ezekiel 12 in the SBIUS

Ezekiel 12 in the SBIVS

Ezekiel 12 in the SBT

Ezekiel 12 in the SBT1E

Ezekiel 12 in the SCHL

Ezekiel 12 in the SNT

Ezekiel 12 in the SUSU

Ezekiel 12 in the SUSU2

Ezekiel 12 in the SYNO

Ezekiel 12 in the TBIAOTANT

Ezekiel 12 in the TBT1E

Ezekiel 12 in the TBT1E2

Ezekiel 12 in the TFTIP

Ezekiel 12 in the TFTU

Ezekiel 12 in the TGNTATF3T

Ezekiel 12 in the THAI

Ezekiel 12 in the TNFD

Ezekiel 12 in the TNT

Ezekiel 12 in the TNTIK

Ezekiel 12 in the TNTIL

Ezekiel 12 in the TNTIN

Ezekiel 12 in the TNTIP

Ezekiel 12 in the TNTIZ

Ezekiel 12 in the TOMA

Ezekiel 12 in the TTENT

Ezekiel 12 in the UBG

Ezekiel 12 in the UGV

Ezekiel 12 in the UGV2

Ezekiel 12 in the UGV3

Ezekiel 12 in the VBL

Ezekiel 12 in the VDCC

Ezekiel 12 in the YALU

Ezekiel 12 in the YAPE

Ezekiel 12 in the YBVTP

Ezekiel 12 in the ZBP