Ezekiel 14 (BOICB)

1 Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m. 2 Mgbe ahụ okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, 3 “Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla? 4 Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị. 5 Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’ 6 “Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ. 7 “ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ga-azaghachi ha. 8 Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 9 “ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel. 10 Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ. 11 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara ya.’ ” 12 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 13 “Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa, 14 a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼetiti ya, ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 15 “Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ, 16 dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu. 17 “Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya, 18 dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta. 19 “Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile, 20 dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. 21 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya. 22 Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem. 23 A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.

In Other Versions

Ezekiel 14 in the ANGEFD

Ezekiel 14 in the ANTPNG2D

Ezekiel 14 in the AS21

Ezekiel 14 in the BAGH

Ezekiel 14 in the BBPNG

Ezekiel 14 in the BBT1E

Ezekiel 14 in the BDS

Ezekiel 14 in the BEV

Ezekiel 14 in the BHAD

Ezekiel 14 in the BIB

Ezekiel 14 in the BLPT

Ezekiel 14 in the BNT

Ezekiel 14 in the BNTABOOT

Ezekiel 14 in the BNTLV

Ezekiel 14 in the BOATCB

Ezekiel 14 in the BOATCB2

Ezekiel 14 in the BOBCV

Ezekiel 14 in the BOCNT

Ezekiel 14 in the BOECS

Ezekiel 14 in the BOGWICC

Ezekiel 14 in the BOHCB

Ezekiel 14 in the BOHCV

Ezekiel 14 in the BOHLNT

Ezekiel 14 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 14 in the BOILNTAP

Ezekiel 14 in the BOITCV

Ezekiel 14 in the BOKCV

Ezekiel 14 in the BOKCV2

Ezekiel 14 in the BOKHWOG

Ezekiel 14 in the BOKSSV

Ezekiel 14 in the BOLCB

Ezekiel 14 in the BOLCB2

Ezekiel 14 in the BOMCV

Ezekiel 14 in the BONAV

Ezekiel 14 in the BONCB

Ezekiel 14 in the BONLT

Ezekiel 14 in the BONUT2

Ezekiel 14 in the BOPLNT

Ezekiel 14 in the BOSCB

Ezekiel 14 in the BOSNC

Ezekiel 14 in the BOTLNT

Ezekiel 14 in the BOVCB

Ezekiel 14 in the BOYCB

Ezekiel 14 in the BPBB

Ezekiel 14 in the BPH

Ezekiel 14 in the BSB

Ezekiel 14 in the CCB

Ezekiel 14 in the CUV

Ezekiel 14 in the CUVS

Ezekiel 14 in the DBT

Ezekiel 14 in the DGDNT

Ezekiel 14 in the DHNT

Ezekiel 14 in the DNT

Ezekiel 14 in the ELBE

Ezekiel 14 in the EMTV

Ezekiel 14 in the ESV

Ezekiel 14 in the FBV

Ezekiel 14 in the FEB

Ezekiel 14 in the GGMNT

Ezekiel 14 in the GNT

Ezekiel 14 in the HARY

Ezekiel 14 in the HNT

Ezekiel 14 in the IRVA

Ezekiel 14 in the IRVB

Ezekiel 14 in the IRVG

Ezekiel 14 in the IRVH

Ezekiel 14 in the IRVK

Ezekiel 14 in the IRVM

Ezekiel 14 in the IRVM2

Ezekiel 14 in the IRVO

Ezekiel 14 in the IRVP

Ezekiel 14 in the IRVT

Ezekiel 14 in the IRVT2

Ezekiel 14 in the IRVU

Ezekiel 14 in the ISVN

Ezekiel 14 in the JSNT

Ezekiel 14 in the KAPI

Ezekiel 14 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 14 in the KBV

Ezekiel 14 in the KJV

Ezekiel 14 in the KNFD

Ezekiel 14 in the LBA

Ezekiel 14 in the LBLA

Ezekiel 14 in the LNT

Ezekiel 14 in the LSV

Ezekiel 14 in the MAAL

Ezekiel 14 in the MBV

Ezekiel 14 in the MBV2

Ezekiel 14 in the MHNT

Ezekiel 14 in the MKNFD

Ezekiel 14 in the MNG

Ezekiel 14 in the MNT

Ezekiel 14 in the MNT2

Ezekiel 14 in the MRS1T

Ezekiel 14 in the NAA

Ezekiel 14 in the NASB

Ezekiel 14 in the NBLA

Ezekiel 14 in the NBS

Ezekiel 14 in the NBVTP

Ezekiel 14 in the NET2

Ezekiel 14 in the NIV11

Ezekiel 14 in the NNT

Ezekiel 14 in the NNT2

Ezekiel 14 in the NNT3

Ezekiel 14 in the PDDPT

Ezekiel 14 in the PFNT

Ezekiel 14 in the RMNT

Ezekiel 14 in the SBIAS

Ezekiel 14 in the SBIBS

Ezekiel 14 in the SBIBS2

Ezekiel 14 in the SBICS

Ezekiel 14 in the SBIDS

Ezekiel 14 in the SBIGS

Ezekiel 14 in the SBIHS

Ezekiel 14 in the SBIIS

Ezekiel 14 in the SBIIS2

Ezekiel 14 in the SBIIS3

Ezekiel 14 in the SBIKS

Ezekiel 14 in the SBIKS2

Ezekiel 14 in the SBIMS

Ezekiel 14 in the SBIOS

Ezekiel 14 in the SBIPS

Ezekiel 14 in the SBISS

Ezekiel 14 in the SBITS

Ezekiel 14 in the SBITS2

Ezekiel 14 in the SBITS3

Ezekiel 14 in the SBITS4

Ezekiel 14 in the SBIUS

Ezekiel 14 in the SBIVS

Ezekiel 14 in the SBT

Ezekiel 14 in the SBT1E

Ezekiel 14 in the SCHL

Ezekiel 14 in the SNT

Ezekiel 14 in the SUSU

Ezekiel 14 in the SUSU2

Ezekiel 14 in the SYNO

Ezekiel 14 in the TBIAOTANT

Ezekiel 14 in the TBT1E

Ezekiel 14 in the TBT1E2

Ezekiel 14 in the TFTIP

Ezekiel 14 in the TFTU

Ezekiel 14 in the TGNTATF3T

Ezekiel 14 in the THAI

Ezekiel 14 in the TNFD

Ezekiel 14 in the TNT

Ezekiel 14 in the TNTIK

Ezekiel 14 in the TNTIL

Ezekiel 14 in the TNTIN

Ezekiel 14 in the TNTIP

Ezekiel 14 in the TNTIZ

Ezekiel 14 in the TOMA

Ezekiel 14 in the TTENT

Ezekiel 14 in the UBG

Ezekiel 14 in the UGV

Ezekiel 14 in the UGV2

Ezekiel 14 in the UGV3

Ezekiel 14 in the VBL

Ezekiel 14 in the VDCC

Ezekiel 14 in the YALU

Ezekiel 14 in the YAPE

Ezekiel 14 in the YBVTP

Ezekiel 14 in the ZBP