Ezekiel 26 (BOICB)

1 Nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa, nʼafọ nke iri na otu, okwu nke ONYENWE ANYỊ rutere m ntị sị, 2 “Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’ 3 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Lee, ana m eguzo imegide gị Taịa. Aga m emekwa ka ọtụtụ mba bilie bịakwasị gị dịka ebili mmiri nke oke osimiri. 4 Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume. 5 Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha. 6 Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.” 7 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa. 8 Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu. 9 Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile. 10 Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya. 11 Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala. 12 Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri. 13 Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ. 14 Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 15 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị? 16 Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị. 17 Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị,“ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya,nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya.Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile,gị na ndị bi nʼime gị.Ị na-emenyekwandị bi nʼime ya egwu. 18 Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimirina-ama jijiji nʼihi ọdịda gị.Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obinʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’ 19 “Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị, 20 mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa. 21 Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe a ga-atụ egwu. Ị gaghị adịkwa. A ga-achọ gị, ma agaghị achọta gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.”

In Other Versions

Ezekiel 26 in the ANGEFD

Ezekiel 26 in the ANTPNG2D

Ezekiel 26 in the AS21

Ezekiel 26 in the BAGH

Ezekiel 26 in the BBPNG

Ezekiel 26 in the BBT1E

Ezekiel 26 in the BDS

Ezekiel 26 in the BEV

Ezekiel 26 in the BHAD

Ezekiel 26 in the BIB

Ezekiel 26 in the BLPT

Ezekiel 26 in the BNT

Ezekiel 26 in the BNTABOOT

Ezekiel 26 in the BNTLV

Ezekiel 26 in the BOATCB

Ezekiel 26 in the BOATCB2

Ezekiel 26 in the BOBCV

Ezekiel 26 in the BOCNT

Ezekiel 26 in the BOECS

Ezekiel 26 in the BOGWICC

Ezekiel 26 in the BOHCB

Ezekiel 26 in the BOHCV

Ezekiel 26 in the BOHLNT

Ezekiel 26 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 26 in the BOILNTAP

Ezekiel 26 in the BOITCV

Ezekiel 26 in the BOKCV

Ezekiel 26 in the BOKCV2

Ezekiel 26 in the BOKHWOG

Ezekiel 26 in the BOKSSV

Ezekiel 26 in the BOLCB

Ezekiel 26 in the BOLCB2

Ezekiel 26 in the BOMCV

Ezekiel 26 in the BONAV

Ezekiel 26 in the BONCB

Ezekiel 26 in the BONLT

Ezekiel 26 in the BONUT2

Ezekiel 26 in the BOPLNT

Ezekiel 26 in the BOSCB

Ezekiel 26 in the BOSNC

Ezekiel 26 in the BOTLNT

Ezekiel 26 in the BOVCB

Ezekiel 26 in the BOYCB

Ezekiel 26 in the BPBB

Ezekiel 26 in the BPH

Ezekiel 26 in the BSB

Ezekiel 26 in the CCB

Ezekiel 26 in the CUV

Ezekiel 26 in the CUVS

Ezekiel 26 in the DBT

Ezekiel 26 in the DGDNT

Ezekiel 26 in the DHNT

Ezekiel 26 in the DNT

Ezekiel 26 in the ELBE

Ezekiel 26 in the EMTV

Ezekiel 26 in the ESV

Ezekiel 26 in the FBV

Ezekiel 26 in the FEB

Ezekiel 26 in the GGMNT

Ezekiel 26 in the GNT

Ezekiel 26 in the HARY

Ezekiel 26 in the HNT

Ezekiel 26 in the IRVA

Ezekiel 26 in the IRVB

Ezekiel 26 in the IRVG

Ezekiel 26 in the IRVH

Ezekiel 26 in the IRVK

Ezekiel 26 in the IRVM

Ezekiel 26 in the IRVM2

Ezekiel 26 in the IRVO

Ezekiel 26 in the IRVP

Ezekiel 26 in the IRVT

Ezekiel 26 in the IRVT2

Ezekiel 26 in the IRVU

Ezekiel 26 in the ISVN

Ezekiel 26 in the JSNT

Ezekiel 26 in the KAPI

Ezekiel 26 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 26 in the KBV

Ezekiel 26 in the KJV

Ezekiel 26 in the KNFD

Ezekiel 26 in the LBA

Ezekiel 26 in the LBLA

Ezekiel 26 in the LNT

Ezekiel 26 in the LSV

Ezekiel 26 in the MAAL

Ezekiel 26 in the MBV

Ezekiel 26 in the MBV2

Ezekiel 26 in the MHNT

Ezekiel 26 in the MKNFD

Ezekiel 26 in the MNG

Ezekiel 26 in the MNT

Ezekiel 26 in the MNT2

Ezekiel 26 in the MRS1T

Ezekiel 26 in the NAA

Ezekiel 26 in the NASB

Ezekiel 26 in the NBLA

Ezekiel 26 in the NBS

Ezekiel 26 in the NBVTP

Ezekiel 26 in the NET2

Ezekiel 26 in the NIV11

Ezekiel 26 in the NNT

Ezekiel 26 in the NNT2

Ezekiel 26 in the NNT3

Ezekiel 26 in the PDDPT

Ezekiel 26 in the PFNT

Ezekiel 26 in the RMNT

Ezekiel 26 in the SBIAS

Ezekiel 26 in the SBIBS

Ezekiel 26 in the SBIBS2

Ezekiel 26 in the SBICS

Ezekiel 26 in the SBIDS

Ezekiel 26 in the SBIGS

Ezekiel 26 in the SBIHS

Ezekiel 26 in the SBIIS

Ezekiel 26 in the SBIIS2

Ezekiel 26 in the SBIIS3

Ezekiel 26 in the SBIKS

Ezekiel 26 in the SBIKS2

Ezekiel 26 in the SBIMS

Ezekiel 26 in the SBIOS

Ezekiel 26 in the SBIPS

Ezekiel 26 in the SBISS

Ezekiel 26 in the SBITS

Ezekiel 26 in the SBITS2

Ezekiel 26 in the SBITS3

Ezekiel 26 in the SBITS4

Ezekiel 26 in the SBIUS

Ezekiel 26 in the SBIVS

Ezekiel 26 in the SBT

Ezekiel 26 in the SBT1E

Ezekiel 26 in the SCHL

Ezekiel 26 in the SNT

Ezekiel 26 in the SUSU

Ezekiel 26 in the SUSU2

Ezekiel 26 in the SYNO

Ezekiel 26 in the TBIAOTANT

Ezekiel 26 in the TBT1E

Ezekiel 26 in the TBT1E2

Ezekiel 26 in the TFTIP

Ezekiel 26 in the TFTU

Ezekiel 26 in the TGNTATF3T

Ezekiel 26 in the THAI

Ezekiel 26 in the TNFD

Ezekiel 26 in the TNT

Ezekiel 26 in the TNTIK

Ezekiel 26 in the TNTIL

Ezekiel 26 in the TNTIN

Ezekiel 26 in the TNTIP

Ezekiel 26 in the TNTIZ

Ezekiel 26 in the TOMA

Ezekiel 26 in the TTENT

Ezekiel 26 in the UBG

Ezekiel 26 in the UGV

Ezekiel 26 in the UGV2

Ezekiel 26 in the UGV3

Ezekiel 26 in the VBL

Ezekiel 26 in the VDCC

Ezekiel 26 in the YALU

Ezekiel 26 in the YAPE

Ezekiel 26 in the YBVTP

Ezekiel 26 in the ZBP