Ezekiel 30 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu,“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!” 3 Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,Ụbọchị nke ONYENWE ANYỊ abịala nso,ụbọchị igwe ojii,ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4 Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,ihe mgbu ga-adakwasị Kush.Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi. 5 Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha. 6 “ ‘Ọ bụ ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru:“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.Site na Migdol ruo nʼAswan,ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 7 Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi. 8 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ,mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka. 9 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu. 10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọnbibie igwe ndị agha Ijipt niile. 11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ. 12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. 13 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile. 14 Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.Aga m etinye ọkụ na Zoan,ma taa Tibs ahụhụ. 15 M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,bụ ebe siri ike nke Ijipt,m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16 Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.A ga-eji ike tipịa Tibs.Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile. 17 Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubastiga-anwụ site na mma agha.Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha. 18 Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhismgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.Igwe ojii ga-ekpuchi ya,a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19 Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.”

In Other Versions

Ezekiel 30 in the ANGEFD

Ezekiel 30 in the ANTPNG2D

Ezekiel 30 in the AS21

Ezekiel 30 in the BAGH

Ezekiel 30 in the BBPNG

Ezekiel 30 in the BBT1E

Ezekiel 30 in the BDS

Ezekiel 30 in the BEV

Ezekiel 30 in the BHAD

Ezekiel 30 in the BIB

Ezekiel 30 in the BLPT

Ezekiel 30 in the BNT

Ezekiel 30 in the BNTABOOT

Ezekiel 30 in the BNTLV

Ezekiel 30 in the BOATCB

Ezekiel 30 in the BOATCB2

Ezekiel 30 in the BOBCV

Ezekiel 30 in the BOCNT

Ezekiel 30 in the BOECS

Ezekiel 30 in the BOGWICC

Ezekiel 30 in the BOHCB

Ezekiel 30 in the BOHCV

Ezekiel 30 in the BOHLNT

Ezekiel 30 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 30 in the BOILNTAP

Ezekiel 30 in the BOITCV

Ezekiel 30 in the BOKCV

Ezekiel 30 in the BOKCV2

Ezekiel 30 in the BOKHWOG

Ezekiel 30 in the BOKSSV

Ezekiel 30 in the BOLCB

Ezekiel 30 in the BOLCB2

Ezekiel 30 in the BOMCV

Ezekiel 30 in the BONAV

Ezekiel 30 in the BONCB

Ezekiel 30 in the BONLT

Ezekiel 30 in the BONUT2

Ezekiel 30 in the BOPLNT

Ezekiel 30 in the BOSCB

Ezekiel 30 in the BOSNC

Ezekiel 30 in the BOTLNT

Ezekiel 30 in the BOVCB

Ezekiel 30 in the BOYCB

Ezekiel 30 in the BPBB

Ezekiel 30 in the BPH

Ezekiel 30 in the BSB

Ezekiel 30 in the CCB

Ezekiel 30 in the CUV

Ezekiel 30 in the CUVS

Ezekiel 30 in the DBT

Ezekiel 30 in the DGDNT

Ezekiel 30 in the DHNT

Ezekiel 30 in the DNT

Ezekiel 30 in the ELBE

Ezekiel 30 in the EMTV

Ezekiel 30 in the ESV

Ezekiel 30 in the FBV

Ezekiel 30 in the FEB

Ezekiel 30 in the GGMNT

Ezekiel 30 in the GNT

Ezekiel 30 in the HARY

Ezekiel 30 in the HNT

Ezekiel 30 in the IRVA

Ezekiel 30 in the IRVB

Ezekiel 30 in the IRVG

Ezekiel 30 in the IRVH

Ezekiel 30 in the IRVK

Ezekiel 30 in the IRVM

Ezekiel 30 in the IRVM2

Ezekiel 30 in the IRVO

Ezekiel 30 in the IRVP

Ezekiel 30 in the IRVT

Ezekiel 30 in the IRVT2

Ezekiel 30 in the IRVU

Ezekiel 30 in the ISVN

Ezekiel 30 in the JSNT

Ezekiel 30 in the KAPI

Ezekiel 30 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 30 in the KBV

Ezekiel 30 in the KJV

Ezekiel 30 in the KNFD

Ezekiel 30 in the LBA

Ezekiel 30 in the LBLA

Ezekiel 30 in the LNT

Ezekiel 30 in the LSV

Ezekiel 30 in the MAAL

Ezekiel 30 in the MBV

Ezekiel 30 in the MBV2

Ezekiel 30 in the MHNT

Ezekiel 30 in the MKNFD

Ezekiel 30 in the MNG

Ezekiel 30 in the MNT

Ezekiel 30 in the MNT2

Ezekiel 30 in the MRS1T

Ezekiel 30 in the NAA

Ezekiel 30 in the NASB

Ezekiel 30 in the NBLA

Ezekiel 30 in the NBS

Ezekiel 30 in the NBVTP

Ezekiel 30 in the NET2

Ezekiel 30 in the NIV11

Ezekiel 30 in the NNT

Ezekiel 30 in the NNT2

Ezekiel 30 in the NNT3

Ezekiel 30 in the PDDPT

Ezekiel 30 in the PFNT

Ezekiel 30 in the RMNT

Ezekiel 30 in the SBIAS

Ezekiel 30 in the SBIBS

Ezekiel 30 in the SBIBS2

Ezekiel 30 in the SBICS

Ezekiel 30 in the SBIDS

Ezekiel 30 in the SBIGS

Ezekiel 30 in the SBIHS

Ezekiel 30 in the SBIIS

Ezekiel 30 in the SBIIS2

Ezekiel 30 in the SBIIS3

Ezekiel 30 in the SBIKS

Ezekiel 30 in the SBIKS2

Ezekiel 30 in the SBIMS

Ezekiel 30 in the SBIOS

Ezekiel 30 in the SBIPS

Ezekiel 30 in the SBISS

Ezekiel 30 in the SBITS

Ezekiel 30 in the SBITS2

Ezekiel 30 in the SBITS3

Ezekiel 30 in the SBITS4

Ezekiel 30 in the SBIUS

Ezekiel 30 in the SBIVS

Ezekiel 30 in the SBT

Ezekiel 30 in the SBT1E

Ezekiel 30 in the SCHL

Ezekiel 30 in the SNT

Ezekiel 30 in the SUSU

Ezekiel 30 in the SUSU2

Ezekiel 30 in the SYNO

Ezekiel 30 in the TBIAOTANT

Ezekiel 30 in the TBT1E

Ezekiel 30 in the TBT1E2

Ezekiel 30 in the TFTIP

Ezekiel 30 in the TFTU

Ezekiel 30 in the TGNTATF3T

Ezekiel 30 in the THAI

Ezekiel 30 in the TNFD

Ezekiel 30 in the TNT

Ezekiel 30 in the TNTIK

Ezekiel 30 in the TNTIL

Ezekiel 30 in the TNTIN

Ezekiel 30 in the TNTIP

Ezekiel 30 in the TNTIZ

Ezekiel 30 in the TOMA

Ezekiel 30 in the TTENT

Ezekiel 30 in the UBG

Ezekiel 30 in the UGV

Ezekiel 30 in the UGV2

Ezekiel 30 in the UGV3

Ezekiel 30 in the VBL

Ezekiel 30 in the VDCC

Ezekiel 30 in the YALU

Ezekiel 30 in the YAPE

Ezekiel 30 in the YBVTP

Ezekiel 30 in the ZBP