Genesis 34 (BOICB)

1 Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ. 2 Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa. 3 Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro. 4 Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.” 5 Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara. 6 Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka. 7 Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme. 8 Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya. 9 Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị. 10 Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.” 11 Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu. 12 Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.” 13 Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị. 14 Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere. 15 Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu. 16 Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị. 17 Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.” 18 Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru. 19 Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu. 20 Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị. 21 “Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha. 22 Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu. 23 Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.” 24 Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu. 25 O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ. 26 Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha. 27 Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị. 28 Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere. 29 Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha. 30 Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.” 31 Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”

In Other Versions

Genesis 34 in the ANGEFD

Genesis 34 in the ANTPNG2D

Genesis 34 in the AS21

Genesis 34 in the BAGH

Genesis 34 in the BBPNG

Genesis 34 in the BBT1E

Genesis 34 in the BDS

Genesis 34 in the BEV

Genesis 34 in the BHAD

Genesis 34 in the BIB

Genesis 34 in the BLPT

Genesis 34 in the BNT

Genesis 34 in the BNTABOOT

Genesis 34 in the BNTLV

Genesis 34 in the BOATCB

Genesis 34 in the BOATCB2

Genesis 34 in the BOBCV

Genesis 34 in the BOCNT

Genesis 34 in the BOECS

Genesis 34 in the BOGWICC

Genesis 34 in the BOHCB

Genesis 34 in the BOHCV

Genesis 34 in the BOHLNT

Genesis 34 in the BOHNTLTAL

Genesis 34 in the BOILNTAP

Genesis 34 in the BOITCV

Genesis 34 in the BOKCV

Genesis 34 in the BOKCV2

Genesis 34 in the BOKHWOG

Genesis 34 in the BOKSSV

Genesis 34 in the BOLCB

Genesis 34 in the BOLCB2

Genesis 34 in the BOMCV

Genesis 34 in the BONAV

Genesis 34 in the BONCB

Genesis 34 in the BONLT

Genesis 34 in the BONUT2

Genesis 34 in the BOPLNT

Genesis 34 in the BOSCB

Genesis 34 in the BOSNC

Genesis 34 in the BOTLNT

Genesis 34 in the BOVCB

Genesis 34 in the BOYCB

Genesis 34 in the BPBB

Genesis 34 in the BPH

Genesis 34 in the BSB

Genesis 34 in the CCB

Genesis 34 in the CUV

Genesis 34 in the CUVS

Genesis 34 in the DBT

Genesis 34 in the DGDNT

Genesis 34 in the DHNT

Genesis 34 in the DNT

Genesis 34 in the ELBE

Genesis 34 in the EMTV

Genesis 34 in the ESV

Genesis 34 in the FBV

Genesis 34 in the FEB

Genesis 34 in the GGMNT

Genesis 34 in the GNT

Genesis 34 in the HARY

Genesis 34 in the HNT

Genesis 34 in the IRVA

Genesis 34 in the IRVB

Genesis 34 in the IRVG

Genesis 34 in the IRVH

Genesis 34 in the IRVK

Genesis 34 in the IRVM

Genesis 34 in the IRVM2

Genesis 34 in the IRVO

Genesis 34 in the IRVP

Genesis 34 in the IRVT

Genesis 34 in the IRVT2

Genesis 34 in the IRVU

Genesis 34 in the ISVN

Genesis 34 in the JSNT

Genesis 34 in the KAPI

Genesis 34 in the KBT1ETNIK

Genesis 34 in the KBV

Genesis 34 in the KJV

Genesis 34 in the KNFD

Genesis 34 in the LBA

Genesis 34 in the LBLA

Genesis 34 in the LNT

Genesis 34 in the LSV

Genesis 34 in the MAAL

Genesis 34 in the MBV

Genesis 34 in the MBV2

Genesis 34 in the MHNT

Genesis 34 in the MKNFD

Genesis 34 in the MNG

Genesis 34 in the MNT

Genesis 34 in the MNT2

Genesis 34 in the MRS1T

Genesis 34 in the NAA

Genesis 34 in the NASB

Genesis 34 in the NBLA

Genesis 34 in the NBS

Genesis 34 in the NBVTP

Genesis 34 in the NET2

Genesis 34 in the NIV11

Genesis 34 in the NNT

Genesis 34 in the NNT2

Genesis 34 in the NNT3

Genesis 34 in the PDDPT

Genesis 34 in the PFNT

Genesis 34 in the RMNT

Genesis 34 in the SBIAS

Genesis 34 in the SBIBS

Genesis 34 in the SBIBS2

Genesis 34 in the SBICS

Genesis 34 in the SBIDS

Genesis 34 in the SBIGS

Genesis 34 in the SBIHS

Genesis 34 in the SBIIS

Genesis 34 in the SBIIS2

Genesis 34 in the SBIIS3

Genesis 34 in the SBIKS

Genesis 34 in the SBIKS2

Genesis 34 in the SBIMS

Genesis 34 in the SBIOS

Genesis 34 in the SBIPS

Genesis 34 in the SBISS

Genesis 34 in the SBITS

Genesis 34 in the SBITS2

Genesis 34 in the SBITS3

Genesis 34 in the SBITS4

Genesis 34 in the SBIUS

Genesis 34 in the SBIVS

Genesis 34 in the SBT

Genesis 34 in the SBT1E

Genesis 34 in the SCHL

Genesis 34 in the SNT

Genesis 34 in the SUSU

Genesis 34 in the SUSU2

Genesis 34 in the SYNO

Genesis 34 in the TBIAOTANT

Genesis 34 in the TBT1E

Genesis 34 in the TBT1E2

Genesis 34 in the TFTIP

Genesis 34 in the TFTU

Genesis 34 in the TGNTATF3T

Genesis 34 in the THAI

Genesis 34 in the TNFD

Genesis 34 in the TNT

Genesis 34 in the TNTIK

Genesis 34 in the TNTIL

Genesis 34 in the TNTIN

Genesis 34 in the TNTIP

Genesis 34 in the TNTIZ

Genesis 34 in the TOMA

Genesis 34 in the TTENT

Genesis 34 in the UBG

Genesis 34 in the UGV

Genesis 34 in the UGV2

Genesis 34 in the UGV3

Genesis 34 in the VBL

Genesis 34 in the VDCC

Genesis 34 in the YALU

Genesis 34 in the YAPE

Genesis 34 in the YBVTP

Genesis 34 in the ZBP