Genesis 46 (BOICB)

1 Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik. 2 Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!”Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 3 Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ. 4 Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.” 5 Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya. 6 Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so. 7 Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt. 8 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb 9 Ụmụ ndị ikom Ruben bụ,Hanok, na Palu, na Hezrọn na Kami. 10 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ,Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul. Nne Shaul bụ nwanyị Kenan. 11 Ụmụ ndị ikom Livayị bụ,Geshọn, na Kohat, na Merari. 12 Ụmụ ndị ikom Juda bụ,Ịa, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera. Ma Ịa na Onan nwụrụ nʼala Kenan.Ụmụ ndị ikom Perez bụ,Hezrọn na Hamul. 13 Ma ụmụ ndị ikom Isaka bụ,Tola, na Puva, na Jashub, na Shịmrọn. 14 Ụmụ ndị ikom Zebụlọn bụ,Sered, na Elọn, na Jaliil. 15 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Lịa mụụrụ Jekọb nʼala Padan Aram. Ọ mụtakwara otu nwanyị aha ya bụ Daịna. Ụmụ ndị ikom na ndị inyom ndị a dị iri atọ na atọ. 16 Ụmụ ndị ikom Gad bụ,Zefọn, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi na Areli. 17 Ụmụ ndị ikom Asha bụ,Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera.Ụmụ Beriya bụ,Heba na Malkiel. 18 Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ. 19 Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ,Josef na Benjamin. 20 Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On. 21 Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ,Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad. 22 Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ. 23 Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ,Hushim. 24 Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ,Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem. 25 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa. 26 Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii. 27 Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa. 28 Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen, 29 Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge. 30 Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.” 31 Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m. 32 Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’ 33 Ya mere, ọ bụrụ na Fero akpọ unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ ọrụ aka unu?’ 34 Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”

In Other Versions

Genesis 46 in the ANGEFD

Genesis 46 in the ANTPNG2D

Genesis 46 in the AS21

Genesis 46 in the BAGH

Genesis 46 in the BBPNG

Genesis 46 in the BBT1E

Genesis 46 in the BDS

Genesis 46 in the BEV

Genesis 46 in the BHAD

Genesis 46 in the BIB

Genesis 46 in the BLPT

Genesis 46 in the BNT

Genesis 46 in the BNTABOOT

Genesis 46 in the BNTLV

Genesis 46 in the BOATCB

Genesis 46 in the BOATCB2

Genesis 46 in the BOBCV

Genesis 46 in the BOCNT

Genesis 46 in the BOECS

Genesis 46 in the BOGWICC

Genesis 46 in the BOHCB

Genesis 46 in the BOHCV

Genesis 46 in the BOHLNT

Genesis 46 in the BOHNTLTAL

Genesis 46 in the BOILNTAP

Genesis 46 in the BOITCV

Genesis 46 in the BOKCV

Genesis 46 in the BOKCV2

Genesis 46 in the BOKHWOG

Genesis 46 in the BOKSSV

Genesis 46 in the BOLCB

Genesis 46 in the BOLCB2

Genesis 46 in the BOMCV

Genesis 46 in the BONAV

Genesis 46 in the BONCB

Genesis 46 in the BONLT

Genesis 46 in the BONUT2

Genesis 46 in the BOPLNT

Genesis 46 in the BOSCB

Genesis 46 in the BOSNC

Genesis 46 in the BOTLNT

Genesis 46 in the BOVCB

Genesis 46 in the BOYCB

Genesis 46 in the BPBB

Genesis 46 in the BPH

Genesis 46 in the BSB

Genesis 46 in the CCB

Genesis 46 in the CUV

Genesis 46 in the CUVS

Genesis 46 in the DBT

Genesis 46 in the DGDNT

Genesis 46 in the DHNT

Genesis 46 in the DNT

Genesis 46 in the ELBE

Genesis 46 in the EMTV

Genesis 46 in the ESV

Genesis 46 in the FBV

Genesis 46 in the FEB

Genesis 46 in the GGMNT

Genesis 46 in the GNT

Genesis 46 in the HARY

Genesis 46 in the HNT

Genesis 46 in the IRVA

Genesis 46 in the IRVB

Genesis 46 in the IRVG

Genesis 46 in the IRVH

Genesis 46 in the IRVK

Genesis 46 in the IRVM

Genesis 46 in the IRVM2

Genesis 46 in the IRVO

Genesis 46 in the IRVP

Genesis 46 in the IRVT

Genesis 46 in the IRVT2

Genesis 46 in the IRVU

Genesis 46 in the ISVN

Genesis 46 in the JSNT

Genesis 46 in the KAPI

Genesis 46 in the KBT1ETNIK

Genesis 46 in the KBV

Genesis 46 in the KJV

Genesis 46 in the KNFD

Genesis 46 in the LBA

Genesis 46 in the LBLA

Genesis 46 in the LNT

Genesis 46 in the LSV

Genesis 46 in the MAAL

Genesis 46 in the MBV

Genesis 46 in the MBV2

Genesis 46 in the MHNT

Genesis 46 in the MKNFD

Genesis 46 in the MNG

Genesis 46 in the MNT

Genesis 46 in the MNT2

Genesis 46 in the MRS1T

Genesis 46 in the NAA

Genesis 46 in the NASB

Genesis 46 in the NBLA

Genesis 46 in the NBS

Genesis 46 in the NBVTP

Genesis 46 in the NET2

Genesis 46 in the NIV11

Genesis 46 in the NNT

Genesis 46 in the NNT2

Genesis 46 in the NNT3

Genesis 46 in the PDDPT

Genesis 46 in the PFNT

Genesis 46 in the RMNT

Genesis 46 in the SBIAS

Genesis 46 in the SBIBS

Genesis 46 in the SBIBS2

Genesis 46 in the SBICS

Genesis 46 in the SBIDS

Genesis 46 in the SBIGS

Genesis 46 in the SBIHS

Genesis 46 in the SBIIS

Genesis 46 in the SBIIS2

Genesis 46 in the SBIIS3

Genesis 46 in the SBIKS

Genesis 46 in the SBIKS2

Genesis 46 in the SBIMS

Genesis 46 in the SBIOS

Genesis 46 in the SBIPS

Genesis 46 in the SBISS

Genesis 46 in the SBITS

Genesis 46 in the SBITS2

Genesis 46 in the SBITS3

Genesis 46 in the SBITS4

Genesis 46 in the SBIUS

Genesis 46 in the SBIVS

Genesis 46 in the SBT

Genesis 46 in the SBT1E

Genesis 46 in the SCHL

Genesis 46 in the SNT

Genesis 46 in the SUSU

Genesis 46 in the SUSU2

Genesis 46 in the SYNO

Genesis 46 in the TBIAOTANT

Genesis 46 in the TBT1E

Genesis 46 in the TBT1E2

Genesis 46 in the TFTIP

Genesis 46 in the TFTU

Genesis 46 in the TGNTATF3T

Genesis 46 in the THAI

Genesis 46 in the TNFD

Genesis 46 in the TNT

Genesis 46 in the TNTIK

Genesis 46 in the TNTIL

Genesis 46 in the TNTIN

Genesis 46 in the TNTIP

Genesis 46 in the TNTIZ

Genesis 46 in the TOMA

Genesis 46 in the TTENT

Genesis 46 in the UBG

Genesis 46 in the UGV

Genesis 46 in the UGV2

Genesis 46 in the UGV3

Genesis 46 in the VBL

Genesis 46 in the VDCC

Genesis 46 in the YALU

Genesis 46 in the YAPE

Genesis 46 in the YBVTP

Genesis 46 in the ZBP