Habakkuk 1 (BOICB)
1 Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara. 2 ONYENWE ANYỊ, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpuma ị dịghị ege ntị?Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!”ma ị dịghị azọpụta? 3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?Gịnị mere i ji anagide mmegbu?Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. 4 Nʼihi ya, iwu na-ada mba,ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 5 “Legide mba niile anya, ka i hụ.Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,nke unu na-agaghị ekwenye,ọ bụladị ma akọọrọ unu ya. 6 Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha. 7 Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu. 8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri. 9 Ha niile na-abịa ime ihe ike.Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu. 10 Ha na-akwa ndị eze emo,jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha. 11 Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwandị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.” 12 ONYENWE ANYỊ, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.Gị, ONYENWE ANYỊ, họpụtara ha maka ikpe ikpe.Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13 Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;ị naghị anabatakwa mmegbu.Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-elodandị bụ ndị ezi omume karịa ha? 14 I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 15 Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 16 Nʼihi nke a, ọ na-achụ ajana-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,na-erikwa nri kachasị mma 17 Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbutena-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
In Other Versions
Habakkuk 1 in the ANGEFD
Habakkuk 1 in the ANTPNG2D
Habakkuk 1 in the AS21
Habakkuk 1 in the BAGH
Habakkuk 1 in the BBPNG
Habakkuk 1 in the BBT1E
Habakkuk 1 in the BDS
Habakkuk 1 in the BEV
Habakkuk 1 in the BHAD
Habakkuk 1 in the BIB
Habakkuk 1 in the BLPT
Habakkuk 1 in the BNT
Habakkuk 1 in the BNTABOOT
Habakkuk 1 in the BNTLV
Habakkuk 1 in the BOATCB
Habakkuk 1 in the BOATCB2
Habakkuk 1 in the BOBCV
Habakkuk 1 in the BOCNT
Habakkuk 1 in the BOECS
Habakkuk 1 in the BOGWICC
Habakkuk 1 in the BOHCB
Habakkuk 1 in the BOHCV
Habakkuk 1 in the BOHLNT
Habakkuk 1 in the BOHNTLTAL
Habakkuk 1 in the BOILNTAP
Habakkuk 1 in the BOITCV
Habakkuk 1 in the BOKCV
Habakkuk 1 in the BOKCV2
Habakkuk 1 in the BOKHWOG
Habakkuk 1 in the BOKSSV
Habakkuk 1 in the BOLCB
Habakkuk 1 in the BOLCB2
Habakkuk 1 in the BOMCV
Habakkuk 1 in the BONAV
Habakkuk 1 in the BONCB
Habakkuk 1 in the BONLT
Habakkuk 1 in the BONUT2
Habakkuk 1 in the BOPLNT
Habakkuk 1 in the BOSCB
Habakkuk 1 in the BOSNC
Habakkuk 1 in the BOTLNT
Habakkuk 1 in the BOVCB
Habakkuk 1 in the BOYCB
Habakkuk 1 in the BPBB
Habakkuk 1 in the BPH
Habakkuk 1 in the BSB
Habakkuk 1 in the CCB
Habakkuk 1 in the CUV
Habakkuk 1 in the CUVS
Habakkuk 1 in the DBT
Habakkuk 1 in the DGDNT
Habakkuk 1 in the DHNT
Habakkuk 1 in the DNT
Habakkuk 1 in the ELBE
Habakkuk 1 in the EMTV
Habakkuk 1 in the ESV
Habakkuk 1 in the FBV
Habakkuk 1 in the FEB
Habakkuk 1 in the GGMNT
Habakkuk 1 in the GNT
Habakkuk 1 in the HARY
Habakkuk 1 in the HNT
Habakkuk 1 in the IRVA
Habakkuk 1 in the IRVB
Habakkuk 1 in the IRVG
Habakkuk 1 in the IRVH
Habakkuk 1 in the IRVK
Habakkuk 1 in the IRVM
Habakkuk 1 in the IRVM2
Habakkuk 1 in the IRVO
Habakkuk 1 in the IRVP
Habakkuk 1 in the IRVT
Habakkuk 1 in the IRVT2
Habakkuk 1 in the IRVU
Habakkuk 1 in the ISVN
Habakkuk 1 in the JSNT
Habakkuk 1 in the KAPI
Habakkuk 1 in the KBT1ETNIK
Habakkuk 1 in the KBV
Habakkuk 1 in the KJV
Habakkuk 1 in the KNFD
Habakkuk 1 in the LBA
Habakkuk 1 in the LBLA
Habakkuk 1 in the LNT
Habakkuk 1 in the LSV
Habakkuk 1 in the MAAL
Habakkuk 1 in the MBV
Habakkuk 1 in the MBV2
Habakkuk 1 in the MHNT
Habakkuk 1 in the MKNFD
Habakkuk 1 in the MNG
Habakkuk 1 in the MNT
Habakkuk 1 in the MNT2
Habakkuk 1 in the MRS1T
Habakkuk 1 in the NAA
Habakkuk 1 in the NASB
Habakkuk 1 in the NBLA
Habakkuk 1 in the NBS
Habakkuk 1 in the NBVTP
Habakkuk 1 in the NET2
Habakkuk 1 in the NIV11
Habakkuk 1 in the NNT
Habakkuk 1 in the NNT2
Habakkuk 1 in the NNT3
Habakkuk 1 in the PDDPT
Habakkuk 1 in the PFNT
Habakkuk 1 in the RMNT
Habakkuk 1 in the SBIAS
Habakkuk 1 in the SBIBS
Habakkuk 1 in the SBIBS2
Habakkuk 1 in the SBICS
Habakkuk 1 in the SBIDS
Habakkuk 1 in the SBIGS
Habakkuk 1 in the SBIHS
Habakkuk 1 in the SBIIS
Habakkuk 1 in the SBIIS2
Habakkuk 1 in the SBIIS3
Habakkuk 1 in the SBIKS
Habakkuk 1 in the SBIKS2
Habakkuk 1 in the SBIMS
Habakkuk 1 in the SBIOS
Habakkuk 1 in the SBIPS
Habakkuk 1 in the SBISS
Habakkuk 1 in the SBITS
Habakkuk 1 in the SBITS2
Habakkuk 1 in the SBITS3
Habakkuk 1 in the SBITS4
Habakkuk 1 in the SBIUS
Habakkuk 1 in the SBIVS
Habakkuk 1 in the SBT
Habakkuk 1 in the SBT1E
Habakkuk 1 in the SCHL
Habakkuk 1 in the SNT
Habakkuk 1 in the SUSU
Habakkuk 1 in the SUSU2
Habakkuk 1 in the SYNO
Habakkuk 1 in the TBIAOTANT
Habakkuk 1 in the TBT1E
Habakkuk 1 in the TBT1E2
Habakkuk 1 in the TFTIP
Habakkuk 1 in the TFTU
Habakkuk 1 in the TGNTATF3T
Habakkuk 1 in the THAI
Habakkuk 1 in the TNFD
Habakkuk 1 in the TNT
Habakkuk 1 in the TNTIK
Habakkuk 1 in the TNTIL
Habakkuk 1 in the TNTIN
Habakkuk 1 in the TNTIP
Habakkuk 1 in the TNTIZ
Habakkuk 1 in the TOMA
Habakkuk 1 in the TTENT
Habakkuk 1 in the UBG
Habakkuk 1 in the UGV
Habakkuk 1 in the UGV2
Habakkuk 1 in the UGV3
Habakkuk 1 in the VBL
Habakkuk 1 in the VDCC
Habakkuk 1 in the YALU
Habakkuk 1 in the YAPE
Habakkuk 1 in the YBVTP
Habakkuk 1 in the ZBP