Isaiah 13 (BOICB)

1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ. 2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.Kpọkuonụ ndị agha.Feerenụ ha aka,ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi. 3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m. 4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niilena-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha. 5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anyana nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe ONYENWE ANYỊna-abịa imebi ala ahụ niile. 6 Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị ONYENWE ANYỊ dị nso,ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. 7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. 8 Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.Ahụ mgbu ga-abịakwasị hamee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. 9 Nʼihi na lee, ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa,ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.A ga-ekpochapụ ala ahụ,ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburuagaghị egosipụta ìhè ha.Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa yaọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. 12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa. 13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,nʼihi oke iwe ga-ewe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile.Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ. 14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka hadịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha. 15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo. 16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha. 17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;ọ dịkwaghị ọlaedomaọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya. 18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere. 19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,ịma mma na ebube ndị Kaldịa,mgbe Chineke ga-akwatu yaọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra. 20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ. 21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,na ikwighịkwighị,nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị. 22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.Lee na oge ha ji emezu adịla nso,a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.

In Other Versions

Isaiah 13 in the ANGEFD

Isaiah 13 in the ANTPNG2D

Isaiah 13 in the AS21

Isaiah 13 in the BAGH

Isaiah 13 in the BBPNG

Isaiah 13 in the BBT1E

Isaiah 13 in the BDS

Isaiah 13 in the BEV

Isaiah 13 in the BHAD

Isaiah 13 in the BIB

Isaiah 13 in the BLPT

Isaiah 13 in the BNT

Isaiah 13 in the BNTABOOT

Isaiah 13 in the BNTLV

Isaiah 13 in the BOATCB

Isaiah 13 in the BOATCB2

Isaiah 13 in the BOBCV

Isaiah 13 in the BOCNT

Isaiah 13 in the BOECS

Isaiah 13 in the BOGWICC

Isaiah 13 in the BOHCB

Isaiah 13 in the BOHCV

Isaiah 13 in the BOHLNT

Isaiah 13 in the BOHNTLTAL

Isaiah 13 in the BOILNTAP

Isaiah 13 in the BOITCV

Isaiah 13 in the BOKCV

Isaiah 13 in the BOKCV2

Isaiah 13 in the BOKHWOG

Isaiah 13 in the BOKSSV

Isaiah 13 in the BOLCB

Isaiah 13 in the BOLCB2

Isaiah 13 in the BOMCV

Isaiah 13 in the BONAV

Isaiah 13 in the BONCB

Isaiah 13 in the BONLT

Isaiah 13 in the BONUT2

Isaiah 13 in the BOPLNT

Isaiah 13 in the BOSCB

Isaiah 13 in the BOSNC

Isaiah 13 in the BOTLNT

Isaiah 13 in the BOVCB

Isaiah 13 in the BOYCB

Isaiah 13 in the BPBB

Isaiah 13 in the BPH

Isaiah 13 in the BSB

Isaiah 13 in the CCB

Isaiah 13 in the CUV

Isaiah 13 in the CUVS

Isaiah 13 in the DBT

Isaiah 13 in the DGDNT

Isaiah 13 in the DHNT

Isaiah 13 in the DNT

Isaiah 13 in the ELBE

Isaiah 13 in the EMTV

Isaiah 13 in the ESV

Isaiah 13 in the FBV

Isaiah 13 in the FEB

Isaiah 13 in the GGMNT

Isaiah 13 in the GNT

Isaiah 13 in the HARY

Isaiah 13 in the HNT

Isaiah 13 in the IRVA

Isaiah 13 in the IRVB

Isaiah 13 in the IRVG

Isaiah 13 in the IRVH

Isaiah 13 in the IRVK

Isaiah 13 in the IRVM

Isaiah 13 in the IRVM2

Isaiah 13 in the IRVO

Isaiah 13 in the IRVP

Isaiah 13 in the IRVT

Isaiah 13 in the IRVT2

Isaiah 13 in the IRVU

Isaiah 13 in the ISVN

Isaiah 13 in the JSNT

Isaiah 13 in the KAPI

Isaiah 13 in the KBT1ETNIK

Isaiah 13 in the KBV

Isaiah 13 in the KJV

Isaiah 13 in the KNFD

Isaiah 13 in the LBA

Isaiah 13 in the LBLA

Isaiah 13 in the LNT

Isaiah 13 in the LSV

Isaiah 13 in the MAAL

Isaiah 13 in the MBV

Isaiah 13 in the MBV2

Isaiah 13 in the MHNT

Isaiah 13 in the MKNFD

Isaiah 13 in the MNG

Isaiah 13 in the MNT

Isaiah 13 in the MNT2

Isaiah 13 in the MRS1T

Isaiah 13 in the NAA

Isaiah 13 in the NASB

Isaiah 13 in the NBLA

Isaiah 13 in the NBS

Isaiah 13 in the NBVTP

Isaiah 13 in the NET2

Isaiah 13 in the NIV11

Isaiah 13 in the NNT

Isaiah 13 in the NNT2

Isaiah 13 in the NNT3

Isaiah 13 in the PDDPT

Isaiah 13 in the PFNT

Isaiah 13 in the RMNT

Isaiah 13 in the SBIAS

Isaiah 13 in the SBIBS

Isaiah 13 in the SBIBS2

Isaiah 13 in the SBICS

Isaiah 13 in the SBIDS

Isaiah 13 in the SBIGS

Isaiah 13 in the SBIHS

Isaiah 13 in the SBIIS

Isaiah 13 in the SBIIS2

Isaiah 13 in the SBIIS3

Isaiah 13 in the SBIKS

Isaiah 13 in the SBIKS2

Isaiah 13 in the SBIMS

Isaiah 13 in the SBIOS

Isaiah 13 in the SBIPS

Isaiah 13 in the SBISS

Isaiah 13 in the SBITS

Isaiah 13 in the SBITS2

Isaiah 13 in the SBITS3

Isaiah 13 in the SBITS4

Isaiah 13 in the SBIUS

Isaiah 13 in the SBIVS

Isaiah 13 in the SBT

Isaiah 13 in the SBT1E

Isaiah 13 in the SCHL

Isaiah 13 in the SNT

Isaiah 13 in the SUSU

Isaiah 13 in the SUSU2

Isaiah 13 in the SYNO

Isaiah 13 in the TBIAOTANT

Isaiah 13 in the TBT1E

Isaiah 13 in the TBT1E2

Isaiah 13 in the TFTIP

Isaiah 13 in the TFTU

Isaiah 13 in the TGNTATF3T

Isaiah 13 in the THAI

Isaiah 13 in the TNFD

Isaiah 13 in the TNT

Isaiah 13 in the TNTIK

Isaiah 13 in the TNTIL

Isaiah 13 in the TNTIN

Isaiah 13 in the TNTIP

Isaiah 13 in the TNTIZ

Isaiah 13 in the TOMA

Isaiah 13 in the TTENT

Isaiah 13 in the UBG

Isaiah 13 in the UGV

Isaiah 13 in the UGV2

Isaiah 13 in the UGV3

Isaiah 13 in the VBL

Isaiah 13 in the VDCC

Isaiah 13 in the YALU

Isaiah 13 in the YAPE

Isaiah 13 in the YBVTP

Isaiah 13 in the ZBP