Isaiah 14 (BOICB)

1 Ma ONYENWE ANYỊ ga-emekwara Jekọb ebere;ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ,meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha.Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha,soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ. 2 Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha,nke Onyenwe anyị nyere ha.Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel,ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị.Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ,ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga. 3 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu, 4 unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị.Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ.Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa! 5 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe,meekwa ka mkpara ndị na-achị achị, 6 nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụna-esepụghị aka nʼiti ha ihe,nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche icheya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi. 7 Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike,ha na-etipụ olu ịbụ abụ. 8 Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọnna-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị,“Agbajiela ike gị;ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.” 9 Ala mmụọ na-eme mkpọtụ,na-eche izute gị nʼọbịbịa gị;ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị,bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa,ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile biliebụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. 10 Ha niile ga-eji otu olu zaa,ha ga-asị gị,“Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike;Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” 11 Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị,ka a na-elikọta nʼaja.Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina;ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12 Lee ka i si site nʼeluigwe daa,gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. 13 Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị,“Aga m arịgoro nʼeluigwe,doo ocheeze mnʼelu kpakpando niile Chineke kere;aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ,na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14 Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15 Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16 Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya,na-atule banyere ndụ gị, sị,“Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji,onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17 Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara?Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile,jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18 Ndị eze mba niile dị iche ichena-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha. 19 Ma ozu gị ka a tụpụrụdịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji.Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha,na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ,ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị.E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ. 20 A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ,nʼihi na i bibiela ala gị.I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụndị na-emebi iwu ọzọ. 21 Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom,nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha.Ha agaghị ebili nweta ala ahụ,mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile. 22 Nʼihi na mụ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị,“Aga m ebili megide ha;aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ,na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha.Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 23 Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị,na ebe mmiri ga na-adọkọ.M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 24 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị,“Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa.Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya. 25 M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.” 26 Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile;nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche. 27 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya?O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ? 28 Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ: 29 Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia,maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela;Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala,mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile. 30 Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri,ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo.Ma aga m eji agụụ na ụnwụlaa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi. 31 Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo!Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia.Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị.Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha. 32 Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enyendị ozi si na mba ahụ?Gwa ha na ONYENWE ANYỊ emeela ka Zayọn guzosie ike.Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.

In Other Versions

Isaiah 14 in the ANGEFD

Isaiah 14 in the ANTPNG2D

Isaiah 14 in the AS21

Isaiah 14 in the BAGH

Isaiah 14 in the BBPNG

Isaiah 14 in the BBT1E

Isaiah 14 in the BDS

Isaiah 14 in the BEV

Isaiah 14 in the BHAD

Isaiah 14 in the BIB

Isaiah 14 in the BLPT

Isaiah 14 in the BNT

Isaiah 14 in the BNTABOOT

Isaiah 14 in the BNTLV

Isaiah 14 in the BOATCB

Isaiah 14 in the BOATCB2

Isaiah 14 in the BOBCV

Isaiah 14 in the BOCNT

Isaiah 14 in the BOECS

Isaiah 14 in the BOGWICC

Isaiah 14 in the BOHCB

Isaiah 14 in the BOHCV

Isaiah 14 in the BOHLNT

Isaiah 14 in the BOHNTLTAL

Isaiah 14 in the BOILNTAP

Isaiah 14 in the BOITCV

Isaiah 14 in the BOKCV

Isaiah 14 in the BOKCV2

Isaiah 14 in the BOKHWOG

Isaiah 14 in the BOKSSV

Isaiah 14 in the BOLCB

Isaiah 14 in the BOLCB2

Isaiah 14 in the BOMCV

Isaiah 14 in the BONAV

Isaiah 14 in the BONCB

Isaiah 14 in the BONLT

Isaiah 14 in the BONUT2

Isaiah 14 in the BOPLNT

Isaiah 14 in the BOSCB

Isaiah 14 in the BOSNC

Isaiah 14 in the BOTLNT

Isaiah 14 in the BOVCB

Isaiah 14 in the BOYCB

Isaiah 14 in the BPBB

Isaiah 14 in the BPH

Isaiah 14 in the BSB

Isaiah 14 in the CCB

Isaiah 14 in the CUV

Isaiah 14 in the CUVS

Isaiah 14 in the DBT

Isaiah 14 in the DGDNT

Isaiah 14 in the DHNT

Isaiah 14 in the DNT

Isaiah 14 in the ELBE

Isaiah 14 in the EMTV

Isaiah 14 in the ESV

Isaiah 14 in the FBV

Isaiah 14 in the FEB

Isaiah 14 in the GGMNT

Isaiah 14 in the GNT

Isaiah 14 in the HARY

Isaiah 14 in the HNT

Isaiah 14 in the IRVA

Isaiah 14 in the IRVB

Isaiah 14 in the IRVG

Isaiah 14 in the IRVH

Isaiah 14 in the IRVK

Isaiah 14 in the IRVM

Isaiah 14 in the IRVM2

Isaiah 14 in the IRVO

Isaiah 14 in the IRVP

Isaiah 14 in the IRVT

Isaiah 14 in the IRVT2

Isaiah 14 in the IRVU

Isaiah 14 in the ISVN

Isaiah 14 in the JSNT

Isaiah 14 in the KAPI

Isaiah 14 in the KBT1ETNIK

Isaiah 14 in the KBV

Isaiah 14 in the KJV

Isaiah 14 in the KNFD

Isaiah 14 in the LBA

Isaiah 14 in the LBLA

Isaiah 14 in the LNT

Isaiah 14 in the LSV

Isaiah 14 in the MAAL

Isaiah 14 in the MBV

Isaiah 14 in the MBV2

Isaiah 14 in the MHNT

Isaiah 14 in the MKNFD

Isaiah 14 in the MNG

Isaiah 14 in the MNT

Isaiah 14 in the MNT2

Isaiah 14 in the MRS1T

Isaiah 14 in the NAA

Isaiah 14 in the NASB

Isaiah 14 in the NBLA

Isaiah 14 in the NBS

Isaiah 14 in the NBVTP

Isaiah 14 in the NET2

Isaiah 14 in the NIV11

Isaiah 14 in the NNT

Isaiah 14 in the NNT2

Isaiah 14 in the NNT3

Isaiah 14 in the PDDPT

Isaiah 14 in the PFNT

Isaiah 14 in the RMNT

Isaiah 14 in the SBIAS

Isaiah 14 in the SBIBS

Isaiah 14 in the SBIBS2

Isaiah 14 in the SBICS

Isaiah 14 in the SBIDS

Isaiah 14 in the SBIGS

Isaiah 14 in the SBIHS

Isaiah 14 in the SBIIS

Isaiah 14 in the SBIIS2

Isaiah 14 in the SBIIS3

Isaiah 14 in the SBIKS

Isaiah 14 in the SBIKS2

Isaiah 14 in the SBIMS

Isaiah 14 in the SBIOS

Isaiah 14 in the SBIPS

Isaiah 14 in the SBISS

Isaiah 14 in the SBITS

Isaiah 14 in the SBITS2

Isaiah 14 in the SBITS3

Isaiah 14 in the SBITS4

Isaiah 14 in the SBIUS

Isaiah 14 in the SBIVS

Isaiah 14 in the SBT

Isaiah 14 in the SBT1E

Isaiah 14 in the SCHL

Isaiah 14 in the SNT

Isaiah 14 in the SUSU

Isaiah 14 in the SUSU2

Isaiah 14 in the SYNO

Isaiah 14 in the TBIAOTANT

Isaiah 14 in the TBT1E

Isaiah 14 in the TBT1E2

Isaiah 14 in the TFTIP

Isaiah 14 in the TFTU

Isaiah 14 in the TGNTATF3T

Isaiah 14 in the THAI

Isaiah 14 in the TNFD

Isaiah 14 in the TNT

Isaiah 14 in the TNTIK

Isaiah 14 in the TNTIL

Isaiah 14 in the TNTIN

Isaiah 14 in the TNTIP

Isaiah 14 in the TNTIZ

Isaiah 14 in the TOMA

Isaiah 14 in the TTENT

Isaiah 14 in the UBG

Isaiah 14 in the UGV

Isaiah 14 in the UGV2

Isaiah 14 in the UGV3

Isaiah 14 in the VBL

Isaiah 14 in the VDCC

Isaiah 14 in the YALU

Isaiah 14 in the YAPE

Isaiah 14 in the YBVTP

Isaiah 14 in the ZBP