Isaiah 2 (BOICB)
1 Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2 Nʼụbọchị ikpeazụ,ugwu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ga-abụ nke eguzoberedịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3 Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu ONYENWE ANYỊ,ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile,ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”Iwu ga-esi na Zayọn pụta,okwu ONYENWE ANYỊ ga-esitekwa na Jerusalem pụta. 4 Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5 Unu ụlọ Jekọb, bịanụka anyị na-agbaso ìhè nke ONYENWE ANYỊ anyị. 6 Gị, bụ ONYENWE ANYỊ, Ị gbakụtala ndị gị,bụ ụlọ Jekọb azụ.Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka. 7 Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,ha bara ụba nke ukwuu.Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu. 8 Ala ha jupụtara nʼarụsị,ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ. 9 Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.Ya mere, agbagharala ha. 10 Gaanụ nʼime nkume,zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe ONYENWE ANYỊ,na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. 11 Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.Ọ bụ naanị ONYENWE ANYỊ ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 12 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooronye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,nʼihi na ihe niile e buliri elu(ka a ga-eweda nʼala), 13 nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,na osisi ook niile nke Bashan, 14 nye ugwu ukwu niile nke dị elu,na ugwu nta niile e buliri elu, 15 nye ụlọ elu niile,na mgbidi niile e wusiri ike, 16 nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. 17 Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.Naanị ONYENWE ANYỊ ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 18 A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19 Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,na nʼọnụ e gwuru nʼala,nʼihi egwu ONYENWE ANYỊ,na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20 Nʼụbọchị ndị ahụ,ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,nke ha kpụrụ ma na-efe,hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ. 21 Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume,na nʼime ọgba niile nke oke nkumenʼihi ịgbanarị iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ,na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,mgbe o biliri ịyọgharị ụwa. 22 Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi.O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime,nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
In Other Versions
Isaiah 2 in the ANGEFD
Isaiah 2 in the ANTPNG2D
Isaiah 2 in the AS21
Isaiah 2 in the BAGH
Isaiah 2 in the BBPNG
Isaiah 2 in the BBT1E
Isaiah 2 in the BDS
Isaiah 2 in the BEV
Isaiah 2 in the BHAD
Isaiah 2 in the BIB
Isaiah 2 in the BLPT
Isaiah 2 in the BNT
Isaiah 2 in the BNTABOOT
Isaiah 2 in the BNTLV
Isaiah 2 in the BOATCB
Isaiah 2 in the BOATCB2
Isaiah 2 in the BOBCV
Isaiah 2 in the BOCNT
Isaiah 2 in the BOECS
Isaiah 2 in the BOGWICC
Isaiah 2 in the BOHCB
Isaiah 2 in the BOHCV
Isaiah 2 in the BOHLNT
Isaiah 2 in the BOHNTLTAL
Isaiah 2 in the BOILNTAP
Isaiah 2 in the BOITCV
Isaiah 2 in the BOKCV
Isaiah 2 in the BOKCV2
Isaiah 2 in the BOKHWOG
Isaiah 2 in the BOKSSV
Isaiah 2 in the BOLCB
Isaiah 2 in the BOLCB2
Isaiah 2 in the BOMCV
Isaiah 2 in the BONAV
Isaiah 2 in the BONCB
Isaiah 2 in the BONLT
Isaiah 2 in the BONUT2
Isaiah 2 in the BOPLNT
Isaiah 2 in the BOSCB
Isaiah 2 in the BOSNC
Isaiah 2 in the BOTLNT
Isaiah 2 in the BOVCB
Isaiah 2 in the BOYCB
Isaiah 2 in the BPBB
Isaiah 2 in the BPH
Isaiah 2 in the BSB
Isaiah 2 in the CCB
Isaiah 2 in the CUV
Isaiah 2 in the CUVS
Isaiah 2 in the DBT
Isaiah 2 in the DGDNT
Isaiah 2 in the DHNT
Isaiah 2 in the DNT
Isaiah 2 in the ELBE
Isaiah 2 in the EMTV
Isaiah 2 in the ESV
Isaiah 2 in the FBV
Isaiah 2 in the FEB
Isaiah 2 in the GGMNT
Isaiah 2 in the GNT
Isaiah 2 in the HARY
Isaiah 2 in the HNT
Isaiah 2 in the IRVA
Isaiah 2 in the IRVB
Isaiah 2 in the IRVG
Isaiah 2 in the IRVH
Isaiah 2 in the IRVK
Isaiah 2 in the IRVM
Isaiah 2 in the IRVM2
Isaiah 2 in the IRVO
Isaiah 2 in the IRVP
Isaiah 2 in the IRVT
Isaiah 2 in the IRVT2
Isaiah 2 in the IRVU
Isaiah 2 in the ISVN
Isaiah 2 in the JSNT
Isaiah 2 in the KAPI
Isaiah 2 in the KBT1ETNIK
Isaiah 2 in the KBV
Isaiah 2 in the KJV
Isaiah 2 in the KNFD
Isaiah 2 in the LBA
Isaiah 2 in the LBLA
Isaiah 2 in the LNT
Isaiah 2 in the LSV
Isaiah 2 in the MAAL
Isaiah 2 in the MBV
Isaiah 2 in the MBV2
Isaiah 2 in the MHNT
Isaiah 2 in the MKNFD
Isaiah 2 in the MNG
Isaiah 2 in the MNT
Isaiah 2 in the MNT2
Isaiah 2 in the MRS1T
Isaiah 2 in the NAA
Isaiah 2 in the NASB
Isaiah 2 in the NBLA
Isaiah 2 in the NBS
Isaiah 2 in the NBVTP
Isaiah 2 in the NET2
Isaiah 2 in the NIV11
Isaiah 2 in the NNT
Isaiah 2 in the NNT2
Isaiah 2 in the NNT3
Isaiah 2 in the PDDPT
Isaiah 2 in the PFNT
Isaiah 2 in the RMNT
Isaiah 2 in the SBIAS
Isaiah 2 in the SBIBS
Isaiah 2 in the SBIBS2
Isaiah 2 in the SBICS
Isaiah 2 in the SBIDS
Isaiah 2 in the SBIGS
Isaiah 2 in the SBIHS
Isaiah 2 in the SBIIS
Isaiah 2 in the SBIIS2
Isaiah 2 in the SBIIS3
Isaiah 2 in the SBIKS
Isaiah 2 in the SBIKS2
Isaiah 2 in the SBIMS
Isaiah 2 in the SBIOS
Isaiah 2 in the SBIPS
Isaiah 2 in the SBISS
Isaiah 2 in the SBITS
Isaiah 2 in the SBITS2
Isaiah 2 in the SBITS3
Isaiah 2 in the SBITS4
Isaiah 2 in the SBIUS
Isaiah 2 in the SBIVS
Isaiah 2 in the SBT
Isaiah 2 in the SBT1E
Isaiah 2 in the SCHL
Isaiah 2 in the SNT
Isaiah 2 in the SUSU
Isaiah 2 in the SUSU2
Isaiah 2 in the SYNO
Isaiah 2 in the TBIAOTANT
Isaiah 2 in the TBT1E
Isaiah 2 in the TBT1E2
Isaiah 2 in the TFTIP
Isaiah 2 in the TFTU
Isaiah 2 in the TGNTATF3T
Isaiah 2 in the THAI
Isaiah 2 in the TNFD
Isaiah 2 in the TNT
Isaiah 2 in the TNTIK
Isaiah 2 in the TNTIL
Isaiah 2 in the TNTIN
Isaiah 2 in the TNTIP
Isaiah 2 in the TNTIZ
Isaiah 2 in the TOMA
Isaiah 2 in the TTENT
Isaiah 2 in the UBG
Isaiah 2 in the UGV
Isaiah 2 in the UGV2
Isaiah 2 in the UGV3
Isaiah 2 in the VBL
Isaiah 2 in the VDCC
Isaiah 2 in the YALU
Isaiah 2 in the YAPE
Isaiah 2 in the YBVTP
Isaiah 2 in the ZBP