Isaiah 26 (BOICB)
1 Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:Anyị nwere obodo e wusiri ike.Chineke na-eme ka mgbidi yana ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị. 2 Meghee ụzọ ama niile,ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi. 3 Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ikenwee udo zuruoke,nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha. 4 Tụkwasị ONYENWE ANYỊ Chineke obi mgbe niile,nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi. 5 Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.Mgbidi yaka ọ na-eme ka ọ daruo ala. 6 Ọ na-enyefe obodo ahụnʼaka ndị a na-emegbu emegbu,na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ. 7 Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị. 8 E, ONYENWE ANYỊ, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,na-ele anya gị.Aha gị na ihe niile e ji mara gịbụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike. 9 Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpeka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe. 10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọadịghị eme ka ha gbanwee.Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, ONYENWE ANYỊ. 11 ONYENWE ANYỊ ebuliela aka ya elu,ha adịghị ahụ ya.Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha. 12 ONYENWE ANYỊ, ị na-enye anyị udo;nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị. 13 O, ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe. 14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;e chefukwaala ha. 15 I meela ka mba a dị ukwuu, ONYENWE ANYỊ;i meela ka mba a saa mbara.I wetarala onwe gị nsọpụrụ,i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa. 16 ONYENWE ANYỊ, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere. 17 Gị, ONYENWE ANYỊ, emeela ka anyị kwaa akwa,dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.Otu a ka anyị nọ nʼihu gị. 18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara. 19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O ONYENWE ANYỊ.Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie.Unu ndị niile bi nʼajatetanụ ma tie mkpu ọṅụ.Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ,ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ. 20 Baanụ nʼụlọ, ndị m,kpọchienụ ụzọ unu!Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta,tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga. 21 Lee anya! ONYENWE ANYỊ si nʼebe obibi yana-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile.Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya,ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
In Other Versions
Isaiah 26 in the ANGEFD
Isaiah 26 in the ANTPNG2D
Isaiah 26 in the AS21
Isaiah 26 in the BAGH
Isaiah 26 in the BBPNG
Isaiah 26 in the BBT1E
Isaiah 26 in the BDS
Isaiah 26 in the BEV
Isaiah 26 in the BHAD
Isaiah 26 in the BIB
Isaiah 26 in the BLPT
Isaiah 26 in the BNT
Isaiah 26 in the BNTABOOT
Isaiah 26 in the BNTLV
Isaiah 26 in the BOATCB
Isaiah 26 in the BOATCB2
Isaiah 26 in the BOBCV
Isaiah 26 in the BOCNT
Isaiah 26 in the BOECS
Isaiah 26 in the BOGWICC
Isaiah 26 in the BOHCB
Isaiah 26 in the BOHCV
Isaiah 26 in the BOHLNT
Isaiah 26 in the BOHNTLTAL
Isaiah 26 in the BOILNTAP
Isaiah 26 in the BOITCV
Isaiah 26 in the BOKCV
Isaiah 26 in the BOKCV2
Isaiah 26 in the BOKHWOG
Isaiah 26 in the BOKSSV
Isaiah 26 in the BOLCB
Isaiah 26 in the BOLCB2
Isaiah 26 in the BOMCV
Isaiah 26 in the BONAV
Isaiah 26 in the BONCB
Isaiah 26 in the BONLT
Isaiah 26 in the BONUT2
Isaiah 26 in the BOPLNT
Isaiah 26 in the BOSCB
Isaiah 26 in the BOSNC
Isaiah 26 in the BOTLNT
Isaiah 26 in the BOVCB
Isaiah 26 in the BOYCB
Isaiah 26 in the BPBB
Isaiah 26 in the BPH
Isaiah 26 in the BSB
Isaiah 26 in the CCB
Isaiah 26 in the CUV
Isaiah 26 in the CUVS
Isaiah 26 in the DBT
Isaiah 26 in the DGDNT
Isaiah 26 in the DHNT
Isaiah 26 in the DNT
Isaiah 26 in the ELBE
Isaiah 26 in the EMTV
Isaiah 26 in the ESV
Isaiah 26 in the FBV
Isaiah 26 in the FEB
Isaiah 26 in the GGMNT
Isaiah 26 in the GNT
Isaiah 26 in the HARY
Isaiah 26 in the HNT
Isaiah 26 in the IRVA
Isaiah 26 in the IRVB
Isaiah 26 in the IRVG
Isaiah 26 in the IRVH
Isaiah 26 in the IRVK
Isaiah 26 in the IRVM
Isaiah 26 in the IRVM2
Isaiah 26 in the IRVO
Isaiah 26 in the IRVP
Isaiah 26 in the IRVT
Isaiah 26 in the IRVT2
Isaiah 26 in the IRVU
Isaiah 26 in the ISVN
Isaiah 26 in the JSNT
Isaiah 26 in the KAPI
Isaiah 26 in the KBT1ETNIK
Isaiah 26 in the KBV
Isaiah 26 in the KJV
Isaiah 26 in the KNFD
Isaiah 26 in the LBA
Isaiah 26 in the LBLA
Isaiah 26 in the LNT
Isaiah 26 in the LSV
Isaiah 26 in the MAAL
Isaiah 26 in the MBV
Isaiah 26 in the MBV2
Isaiah 26 in the MHNT
Isaiah 26 in the MKNFD
Isaiah 26 in the MNG
Isaiah 26 in the MNT
Isaiah 26 in the MNT2
Isaiah 26 in the MRS1T
Isaiah 26 in the NAA
Isaiah 26 in the NASB
Isaiah 26 in the NBLA
Isaiah 26 in the NBS
Isaiah 26 in the NBVTP
Isaiah 26 in the NET2
Isaiah 26 in the NIV11
Isaiah 26 in the NNT
Isaiah 26 in the NNT2
Isaiah 26 in the NNT3
Isaiah 26 in the PDDPT
Isaiah 26 in the PFNT
Isaiah 26 in the RMNT
Isaiah 26 in the SBIAS
Isaiah 26 in the SBIBS
Isaiah 26 in the SBIBS2
Isaiah 26 in the SBICS
Isaiah 26 in the SBIDS
Isaiah 26 in the SBIGS
Isaiah 26 in the SBIHS
Isaiah 26 in the SBIIS
Isaiah 26 in the SBIIS2
Isaiah 26 in the SBIIS3
Isaiah 26 in the SBIKS
Isaiah 26 in the SBIKS2
Isaiah 26 in the SBIMS
Isaiah 26 in the SBIOS
Isaiah 26 in the SBIPS
Isaiah 26 in the SBISS
Isaiah 26 in the SBITS
Isaiah 26 in the SBITS2
Isaiah 26 in the SBITS3
Isaiah 26 in the SBITS4
Isaiah 26 in the SBIUS
Isaiah 26 in the SBIVS
Isaiah 26 in the SBT
Isaiah 26 in the SBT1E
Isaiah 26 in the SCHL
Isaiah 26 in the SNT
Isaiah 26 in the SUSU
Isaiah 26 in the SUSU2
Isaiah 26 in the SYNO
Isaiah 26 in the TBIAOTANT
Isaiah 26 in the TBT1E
Isaiah 26 in the TBT1E2
Isaiah 26 in the TFTIP
Isaiah 26 in the TFTU
Isaiah 26 in the TGNTATF3T
Isaiah 26 in the THAI
Isaiah 26 in the TNFD
Isaiah 26 in the TNT
Isaiah 26 in the TNTIK
Isaiah 26 in the TNTIL
Isaiah 26 in the TNTIN
Isaiah 26 in the TNTIP
Isaiah 26 in the TNTIZ
Isaiah 26 in the TOMA
Isaiah 26 in the TTENT
Isaiah 26 in the UBG
Isaiah 26 in the UGV
Isaiah 26 in the UGV2
Isaiah 26 in the UGV3
Isaiah 26 in the VBL
Isaiah 26 in the VDCC
Isaiah 26 in the YALU
Isaiah 26 in the YAPE
Isaiah 26 in the YBVTP
Isaiah 26 in the ZBP