Isaiah 40 (BOICB)

1 Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi,ka Chineke gị kwuru. 2 Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu,gwa ya;na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla,na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile,na o sitela nʼaka ONYENWE ANYỊnata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3 Otu onye na-eti mkpu sị,“Dozienụ ụzọ nye ONYENWE ANYỊnʼime ọzara,meenụ ka ụzọ atụliri atụliguzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4 A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu,ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala,ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem,meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5 Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị,mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu.Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya.” 6 Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!”Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa,ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. 7 Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,nʼihi nʼokuku ume nke ONYENWE ANYỊ na-ekukwasị ya.Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. 8 E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa,ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9 Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,rigoro nʼelu ugwu;gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,welie olu gị elu tisie mkpu ike;e, tisie mkpu ike, atụla egwu.Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:“Chineke unu na-abịa.” 10 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-abịa nʼike,ike aka ya ka o ji achị.Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11 Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara. 12 Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri?Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe?Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu?Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu?Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta? 13 Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke ONYENWE ANYỊ,maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe? 14 Ọ bụ onye ka ONYENWE ANYỊ gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe,ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma?Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma,maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta? 15 Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere;a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe;ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ. 16 Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja.Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja. 17 O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,dịka ihe na-erughị ihe efu. 18 Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19 Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. 20 Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu ana-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure.Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma,onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada. 21 Ọ bụ na unu amaghị?Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya?Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite?Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa? 22 Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu.Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana.Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa,were ya mere ebe obibi ya. 23 Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa,mee ha ka ha ghọọ ihe efu. 24 Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute.Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute,mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala,mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha,bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 25 “Olee onye unu ga-eji tụnyere m?Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26 Lee anya nʼeluigwe;onye kere kpakpando ndị a niile?Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27 Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị ONYENWE ANYỊ,Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28 Ọ bụ na ị matabeghị?Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. 29 Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. 30 Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, 31 ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYỊ,ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

In Other Versions

Isaiah 40 in the ANGEFD

Isaiah 40 in the ANTPNG2D

Isaiah 40 in the AS21

Isaiah 40 in the BAGH

Isaiah 40 in the BBPNG

Isaiah 40 in the BBT1E

Isaiah 40 in the BDS

Isaiah 40 in the BEV

Isaiah 40 in the BHAD

Isaiah 40 in the BIB

Isaiah 40 in the BLPT

Isaiah 40 in the BNT

Isaiah 40 in the BNTABOOT

Isaiah 40 in the BNTLV

Isaiah 40 in the BOATCB

Isaiah 40 in the BOATCB2

Isaiah 40 in the BOBCV

Isaiah 40 in the BOCNT

Isaiah 40 in the BOECS

Isaiah 40 in the BOGWICC

Isaiah 40 in the BOHCB

Isaiah 40 in the BOHCV

Isaiah 40 in the BOHLNT

Isaiah 40 in the BOHNTLTAL

Isaiah 40 in the BOILNTAP

Isaiah 40 in the BOITCV

Isaiah 40 in the BOKCV

Isaiah 40 in the BOKCV2

Isaiah 40 in the BOKHWOG

Isaiah 40 in the BOKSSV

Isaiah 40 in the BOLCB

Isaiah 40 in the BOLCB2

Isaiah 40 in the BOMCV

Isaiah 40 in the BONAV

Isaiah 40 in the BONCB

Isaiah 40 in the BONLT

Isaiah 40 in the BONUT2

Isaiah 40 in the BOPLNT

Isaiah 40 in the BOSCB

Isaiah 40 in the BOSNC

Isaiah 40 in the BOTLNT

Isaiah 40 in the BOVCB

Isaiah 40 in the BOYCB

Isaiah 40 in the BPBB

Isaiah 40 in the BPH

Isaiah 40 in the BSB

Isaiah 40 in the CCB

Isaiah 40 in the CUV

Isaiah 40 in the CUVS

Isaiah 40 in the DBT

Isaiah 40 in the DGDNT

Isaiah 40 in the DHNT

Isaiah 40 in the DNT

Isaiah 40 in the ELBE

Isaiah 40 in the EMTV

Isaiah 40 in the ESV

Isaiah 40 in the FBV

Isaiah 40 in the FEB

Isaiah 40 in the GGMNT

Isaiah 40 in the GNT

Isaiah 40 in the HARY

Isaiah 40 in the HNT

Isaiah 40 in the IRVA

Isaiah 40 in the IRVB

Isaiah 40 in the IRVG

Isaiah 40 in the IRVH

Isaiah 40 in the IRVK

Isaiah 40 in the IRVM

Isaiah 40 in the IRVM2

Isaiah 40 in the IRVO

Isaiah 40 in the IRVP

Isaiah 40 in the IRVT

Isaiah 40 in the IRVT2

Isaiah 40 in the IRVU

Isaiah 40 in the ISVN

Isaiah 40 in the JSNT

Isaiah 40 in the KAPI

Isaiah 40 in the KBT1ETNIK

Isaiah 40 in the KBV

Isaiah 40 in the KJV

Isaiah 40 in the KNFD

Isaiah 40 in the LBA

Isaiah 40 in the LBLA

Isaiah 40 in the LNT

Isaiah 40 in the LSV

Isaiah 40 in the MAAL

Isaiah 40 in the MBV

Isaiah 40 in the MBV2

Isaiah 40 in the MHNT

Isaiah 40 in the MKNFD

Isaiah 40 in the MNG

Isaiah 40 in the MNT

Isaiah 40 in the MNT2

Isaiah 40 in the MRS1T

Isaiah 40 in the NAA

Isaiah 40 in the NASB

Isaiah 40 in the NBLA

Isaiah 40 in the NBS

Isaiah 40 in the NBVTP

Isaiah 40 in the NET2

Isaiah 40 in the NIV11

Isaiah 40 in the NNT

Isaiah 40 in the NNT2

Isaiah 40 in the NNT3

Isaiah 40 in the PDDPT

Isaiah 40 in the PFNT

Isaiah 40 in the RMNT

Isaiah 40 in the SBIAS

Isaiah 40 in the SBIBS

Isaiah 40 in the SBIBS2

Isaiah 40 in the SBICS

Isaiah 40 in the SBIDS

Isaiah 40 in the SBIGS

Isaiah 40 in the SBIHS

Isaiah 40 in the SBIIS

Isaiah 40 in the SBIIS2

Isaiah 40 in the SBIIS3

Isaiah 40 in the SBIKS

Isaiah 40 in the SBIKS2

Isaiah 40 in the SBIMS

Isaiah 40 in the SBIOS

Isaiah 40 in the SBIPS

Isaiah 40 in the SBISS

Isaiah 40 in the SBITS

Isaiah 40 in the SBITS2

Isaiah 40 in the SBITS3

Isaiah 40 in the SBITS4

Isaiah 40 in the SBIUS

Isaiah 40 in the SBIVS

Isaiah 40 in the SBT

Isaiah 40 in the SBT1E

Isaiah 40 in the SCHL

Isaiah 40 in the SNT

Isaiah 40 in the SUSU

Isaiah 40 in the SUSU2

Isaiah 40 in the SYNO

Isaiah 40 in the TBIAOTANT

Isaiah 40 in the TBT1E

Isaiah 40 in the TBT1E2

Isaiah 40 in the TFTIP

Isaiah 40 in the TFTU

Isaiah 40 in the TGNTATF3T

Isaiah 40 in the THAI

Isaiah 40 in the TNFD

Isaiah 40 in the TNT

Isaiah 40 in the TNTIK

Isaiah 40 in the TNTIL

Isaiah 40 in the TNTIN

Isaiah 40 in the TNTIP

Isaiah 40 in the TNTIZ

Isaiah 40 in the TOMA

Isaiah 40 in the TTENT

Isaiah 40 in the UBG

Isaiah 40 in the UGV

Isaiah 40 in the UGV2

Isaiah 40 in the UGV3

Isaiah 40 in the VBL

Isaiah 40 in the VDCC

Isaiah 40 in the YALU

Isaiah 40 in the YAPE

Isaiah 40 in the YBVTP

Isaiah 40 in the ZBP