Isaiah 42 (BOICB)

1 “Lee ohu m, onye m na-agba ume,onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ.Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya.Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 2 Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi. 3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa,maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị.Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi. 4 Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba,ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa.Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.” 5 Nke a bụ ihe Chineke bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha,onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta,onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume,na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ. 6 “Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, akpọla gị ka i gosi ezi omume m.Aga m echebe gị, gbaa gị ume,nʼihi na eweere m gị nye ndị mka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike.Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile. 7 Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha. 8 “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ! Nke a bụkwa aha m.Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m.Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m. 9 Lee ihe ochie emezuolama nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta.Tupu ha pụta ìhèana m akpọsa ha nye unu.” 10 Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ; tookwanụ ya,unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa,unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya.Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. 11 Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu,ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ.Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ,ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike. 12 Ka ha nye ONYENWE ANYỊ ebube,kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu. 13 ONYENWE ANYỊ ga-apụta buo agha dịka dike.Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha.Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya,ma merie ha. 14 “Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị;ejidesịrị m onwe m aka ike.Ma ugbu a, aga m egosi iwe m;aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme. 15 Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị,meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ.Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara,meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ. 16 Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị,nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha;Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha,meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie.Ihe ndị a niile ka m ga-eme.Agaghị m agbakụta ha azụ. 17 Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi,ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere. 18 “Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri,leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ. 19 Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m?Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m?Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsìdịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu ONYENWE ANYỊ? 20 Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha.Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.” 21 ONYENWE ANYỊ emeela ka iwu ya dị ukwuu,meekwa ka ọ dị ebube,nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè. 22 Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala,zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche.Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha,ma ọ dịghị onye na-anapụta ha.Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike,ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.” 23 Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu? 24 Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe,onye were Izrel nyefee ndị ohi?Ọ bụ na ọ bụghị ONYENWE ANYỊonye ha mehiere megide?Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile,ha erubeghị isi nye iwu ya. 25 Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya,ihe ike nke agha.Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya;o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.

In Other Versions

Isaiah 42 in the ANGEFD

Isaiah 42 in the ANTPNG2D

Isaiah 42 in the AS21

Isaiah 42 in the BAGH

Isaiah 42 in the BBPNG

Isaiah 42 in the BBT1E

Isaiah 42 in the BDS

Isaiah 42 in the BEV

Isaiah 42 in the BHAD

Isaiah 42 in the BIB

Isaiah 42 in the BLPT

Isaiah 42 in the BNT

Isaiah 42 in the BNTABOOT

Isaiah 42 in the BNTLV

Isaiah 42 in the BOATCB

Isaiah 42 in the BOATCB2

Isaiah 42 in the BOBCV

Isaiah 42 in the BOCNT

Isaiah 42 in the BOECS

Isaiah 42 in the BOGWICC

Isaiah 42 in the BOHCB

Isaiah 42 in the BOHCV

Isaiah 42 in the BOHLNT

Isaiah 42 in the BOHNTLTAL

Isaiah 42 in the BOILNTAP

Isaiah 42 in the BOITCV

Isaiah 42 in the BOKCV

Isaiah 42 in the BOKCV2

Isaiah 42 in the BOKHWOG

Isaiah 42 in the BOKSSV

Isaiah 42 in the BOLCB

Isaiah 42 in the BOLCB2

Isaiah 42 in the BOMCV

Isaiah 42 in the BONAV

Isaiah 42 in the BONCB

Isaiah 42 in the BONLT

Isaiah 42 in the BONUT2

Isaiah 42 in the BOPLNT

Isaiah 42 in the BOSCB

Isaiah 42 in the BOSNC

Isaiah 42 in the BOTLNT

Isaiah 42 in the BOVCB

Isaiah 42 in the BOYCB

Isaiah 42 in the BPBB

Isaiah 42 in the BPH

Isaiah 42 in the BSB

Isaiah 42 in the CCB

Isaiah 42 in the CUV

Isaiah 42 in the CUVS

Isaiah 42 in the DBT

Isaiah 42 in the DGDNT

Isaiah 42 in the DHNT

Isaiah 42 in the DNT

Isaiah 42 in the ELBE

Isaiah 42 in the EMTV

Isaiah 42 in the ESV

Isaiah 42 in the FBV

Isaiah 42 in the FEB

Isaiah 42 in the GGMNT

Isaiah 42 in the GNT

Isaiah 42 in the HARY

Isaiah 42 in the HNT

Isaiah 42 in the IRVA

Isaiah 42 in the IRVB

Isaiah 42 in the IRVG

Isaiah 42 in the IRVH

Isaiah 42 in the IRVK

Isaiah 42 in the IRVM

Isaiah 42 in the IRVM2

Isaiah 42 in the IRVO

Isaiah 42 in the IRVP

Isaiah 42 in the IRVT

Isaiah 42 in the IRVT2

Isaiah 42 in the IRVU

Isaiah 42 in the ISVN

Isaiah 42 in the JSNT

Isaiah 42 in the KAPI

Isaiah 42 in the KBT1ETNIK

Isaiah 42 in the KBV

Isaiah 42 in the KJV

Isaiah 42 in the KNFD

Isaiah 42 in the LBA

Isaiah 42 in the LBLA

Isaiah 42 in the LNT

Isaiah 42 in the LSV

Isaiah 42 in the MAAL

Isaiah 42 in the MBV

Isaiah 42 in the MBV2

Isaiah 42 in the MHNT

Isaiah 42 in the MKNFD

Isaiah 42 in the MNG

Isaiah 42 in the MNT

Isaiah 42 in the MNT2

Isaiah 42 in the MRS1T

Isaiah 42 in the NAA

Isaiah 42 in the NASB

Isaiah 42 in the NBLA

Isaiah 42 in the NBS

Isaiah 42 in the NBVTP

Isaiah 42 in the NET2

Isaiah 42 in the NIV11

Isaiah 42 in the NNT

Isaiah 42 in the NNT2

Isaiah 42 in the NNT3

Isaiah 42 in the PDDPT

Isaiah 42 in the PFNT

Isaiah 42 in the RMNT

Isaiah 42 in the SBIAS

Isaiah 42 in the SBIBS

Isaiah 42 in the SBIBS2

Isaiah 42 in the SBICS

Isaiah 42 in the SBIDS

Isaiah 42 in the SBIGS

Isaiah 42 in the SBIHS

Isaiah 42 in the SBIIS

Isaiah 42 in the SBIIS2

Isaiah 42 in the SBIIS3

Isaiah 42 in the SBIKS

Isaiah 42 in the SBIKS2

Isaiah 42 in the SBIMS

Isaiah 42 in the SBIOS

Isaiah 42 in the SBIPS

Isaiah 42 in the SBISS

Isaiah 42 in the SBITS

Isaiah 42 in the SBITS2

Isaiah 42 in the SBITS3

Isaiah 42 in the SBITS4

Isaiah 42 in the SBIUS

Isaiah 42 in the SBIVS

Isaiah 42 in the SBT

Isaiah 42 in the SBT1E

Isaiah 42 in the SCHL

Isaiah 42 in the SNT

Isaiah 42 in the SUSU

Isaiah 42 in the SUSU2

Isaiah 42 in the SYNO

Isaiah 42 in the TBIAOTANT

Isaiah 42 in the TBT1E

Isaiah 42 in the TBT1E2

Isaiah 42 in the TFTIP

Isaiah 42 in the TFTU

Isaiah 42 in the TGNTATF3T

Isaiah 42 in the THAI

Isaiah 42 in the TNFD

Isaiah 42 in the TNT

Isaiah 42 in the TNTIK

Isaiah 42 in the TNTIL

Isaiah 42 in the TNTIN

Isaiah 42 in the TNTIP

Isaiah 42 in the TNTIZ

Isaiah 42 in the TOMA

Isaiah 42 in the TTENT

Isaiah 42 in the UBG

Isaiah 42 in the UGV

Isaiah 42 in the UGV2

Isaiah 42 in the UGV3

Isaiah 42 in the VBL

Isaiah 42 in the VDCC

Isaiah 42 in the YALU

Isaiah 42 in the YAPE

Isaiah 42 in the YBVTP

Isaiah 42 in the ZBP