Jeremiah 20 (BOICB)

1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu, 2 o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “ONYENWE ANYỊ akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu. 4 Nʼihi na nke a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ. 5 Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn. 6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” 7 ONYENWE ANYỊ, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ.Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. 8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.Nʼihi na okwu ONYENWE ANYỊ ewetaralam mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”Ọ dịghị ekwe m.Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. 10 Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,“Oke egwu nʼakụkụ niile!Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!”Ndị enyi m niilenọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,“Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.” 11 Ma ONYENWE ANYỊ nọnyeere m dịka dike nʼagha;nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi. 12 Ma gị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m. 13 Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ!Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto!Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa,site nʼaka ndị ajọ omume. 14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. 15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,“A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!” 16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe ONYENWE ANYỊ mere obodo ndị ahụo bibiri na-enweghị ọmịiko.Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,na akwa ibu agha nʼehihie. 17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m,ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi. 18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụtaịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute,na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?

In Other Versions

Jeremiah 20 in the ANGEFD

Jeremiah 20 in the ANTPNG2D

Jeremiah 20 in the AS21

Jeremiah 20 in the BAGH

Jeremiah 20 in the BBPNG

Jeremiah 20 in the BBT1E

Jeremiah 20 in the BDS

Jeremiah 20 in the BEV

Jeremiah 20 in the BHAD

Jeremiah 20 in the BIB

Jeremiah 20 in the BLPT

Jeremiah 20 in the BNT

Jeremiah 20 in the BNTABOOT

Jeremiah 20 in the BNTLV

Jeremiah 20 in the BOATCB

Jeremiah 20 in the BOATCB2

Jeremiah 20 in the BOBCV

Jeremiah 20 in the BOCNT

Jeremiah 20 in the BOECS

Jeremiah 20 in the BOGWICC

Jeremiah 20 in the BOHCB

Jeremiah 20 in the BOHCV

Jeremiah 20 in the BOHLNT

Jeremiah 20 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 20 in the BOILNTAP

Jeremiah 20 in the BOITCV

Jeremiah 20 in the BOKCV

Jeremiah 20 in the BOKCV2

Jeremiah 20 in the BOKHWOG

Jeremiah 20 in the BOKSSV

Jeremiah 20 in the BOLCB

Jeremiah 20 in the BOLCB2

Jeremiah 20 in the BOMCV

Jeremiah 20 in the BONAV

Jeremiah 20 in the BONCB

Jeremiah 20 in the BONLT

Jeremiah 20 in the BONUT2

Jeremiah 20 in the BOPLNT

Jeremiah 20 in the BOSCB

Jeremiah 20 in the BOSNC

Jeremiah 20 in the BOTLNT

Jeremiah 20 in the BOVCB

Jeremiah 20 in the BOYCB

Jeremiah 20 in the BPBB

Jeremiah 20 in the BPH

Jeremiah 20 in the BSB

Jeremiah 20 in the CCB

Jeremiah 20 in the CUV

Jeremiah 20 in the CUVS

Jeremiah 20 in the DBT

Jeremiah 20 in the DGDNT

Jeremiah 20 in the DHNT

Jeremiah 20 in the DNT

Jeremiah 20 in the ELBE

Jeremiah 20 in the EMTV

Jeremiah 20 in the ESV

Jeremiah 20 in the FBV

Jeremiah 20 in the FEB

Jeremiah 20 in the GGMNT

Jeremiah 20 in the GNT

Jeremiah 20 in the HARY

Jeremiah 20 in the HNT

Jeremiah 20 in the IRVA

Jeremiah 20 in the IRVB

Jeremiah 20 in the IRVG

Jeremiah 20 in the IRVH

Jeremiah 20 in the IRVK

Jeremiah 20 in the IRVM

Jeremiah 20 in the IRVM2

Jeremiah 20 in the IRVO

Jeremiah 20 in the IRVP

Jeremiah 20 in the IRVT

Jeremiah 20 in the IRVT2

Jeremiah 20 in the IRVU

Jeremiah 20 in the ISVN

Jeremiah 20 in the JSNT

Jeremiah 20 in the KAPI

Jeremiah 20 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 20 in the KBV

Jeremiah 20 in the KJV

Jeremiah 20 in the KNFD

Jeremiah 20 in the LBA

Jeremiah 20 in the LBLA

Jeremiah 20 in the LNT

Jeremiah 20 in the LSV

Jeremiah 20 in the MAAL

Jeremiah 20 in the MBV

Jeremiah 20 in the MBV2

Jeremiah 20 in the MHNT

Jeremiah 20 in the MKNFD

Jeremiah 20 in the MNG

Jeremiah 20 in the MNT

Jeremiah 20 in the MNT2

Jeremiah 20 in the MRS1T

Jeremiah 20 in the NAA

Jeremiah 20 in the NASB

Jeremiah 20 in the NBLA

Jeremiah 20 in the NBS

Jeremiah 20 in the NBVTP

Jeremiah 20 in the NET2

Jeremiah 20 in the NIV11

Jeremiah 20 in the NNT

Jeremiah 20 in the NNT2

Jeremiah 20 in the NNT3

Jeremiah 20 in the PDDPT

Jeremiah 20 in the PFNT

Jeremiah 20 in the RMNT

Jeremiah 20 in the SBIAS

Jeremiah 20 in the SBIBS

Jeremiah 20 in the SBIBS2

Jeremiah 20 in the SBICS

Jeremiah 20 in the SBIDS

Jeremiah 20 in the SBIGS

Jeremiah 20 in the SBIHS

Jeremiah 20 in the SBIIS

Jeremiah 20 in the SBIIS2

Jeremiah 20 in the SBIIS3

Jeremiah 20 in the SBIKS

Jeremiah 20 in the SBIKS2

Jeremiah 20 in the SBIMS

Jeremiah 20 in the SBIOS

Jeremiah 20 in the SBIPS

Jeremiah 20 in the SBISS

Jeremiah 20 in the SBITS

Jeremiah 20 in the SBITS2

Jeremiah 20 in the SBITS3

Jeremiah 20 in the SBITS4

Jeremiah 20 in the SBIUS

Jeremiah 20 in the SBIVS

Jeremiah 20 in the SBT

Jeremiah 20 in the SBT1E

Jeremiah 20 in the SCHL

Jeremiah 20 in the SNT

Jeremiah 20 in the SUSU

Jeremiah 20 in the SUSU2

Jeremiah 20 in the SYNO

Jeremiah 20 in the TBIAOTANT

Jeremiah 20 in the TBT1E

Jeremiah 20 in the TBT1E2

Jeremiah 20 in the TFTIP

Jeremiah 20 in the TFTU

Jeremiah 20 in the TGNTATF3T

Jeremiah 20 in the THAI

Jeremiah 20 in the TNFD

Jeremiah 20 in the TNT

Jeremiah 20 in the TNTIK

Jeremiah 20 in the TNTIL

Jeremiah 20 in the TNTIN

Jeremiah 20 in the TNTIP

Jeremiah 20 in the TNTIZ

Jeremiah 20 in the TOMA

Jeremiah 20 in the TTENT

Jeremiah 20 in the UBG

Jeremiah 20 in the UGV

Jeremiah 20 in the UGV2

Jeremiah 20 in the UGV3

Jeremiah 20 in the VBL

Jeremiah 20 in the VDCC

Jeremiah 20 in the YALU

Jeremiah 20 in the YAPE

Jeremiah 20 in the YBVTP

Jeremiah 20 in the ZBP