John 12 (BOICB)

1 Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie. 2 Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ. 3 Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ. 4 Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru, 5 “Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?” 6 O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego. 7 Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m. 8 Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.” 9 Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. 10 Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. 11 Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs. 12 Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13 Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,“Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!” 14 Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, 15 “Atụla egwu, gị ada Zayọn!Lee, eze gị ka ọ na-abịa.Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.” 16 Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a. 17 Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. 18 Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ. 19 Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.” 20 Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21 Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22 Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. 23 Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25 Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26 Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ. 27 “Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a. 28 Nna, nye aha gị otuto.”Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29 Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” 30 Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31 Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32 Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33 O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ. 34 Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” 35 Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. 36 Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya. 37 Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. 38 Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru,“Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyịọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?” 39 Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, 40 “O meela ka ha kpuo ìsì,mekwa ka obi ha kpọchieKa ha ghara iji anya ha hụ ụzọmaọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụlaKa ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.” 41 Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya. 42 Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere. 43 Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke. 44 Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. 45 Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. 46 Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị. 47 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. 48 Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ. 49 Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya. 50 Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”

In Other Versions

John 12 in the ANGEFD

John 12 in the ANTPNG2D

John 12 in the AS21

John 12 in the BAGH

John 12 in the BBPNG

John 12 in the BBT1E

John 12 in the BDS

John 12 in the BEV

John 12 in the BHAD

John 12 in the BIB

John 12 in the BLPT

John 12 in the BNT

John 12 in the BNTABOOT

John 12 in the BNTLV

John 12 in the BOATCB

John 12 in the BOATCB2

John 12 in the BOBCV

John 12 in the BOCNT

John 12 in the BOECS

John 12 in the BOGWICC

John 12 in the BOHCB

John 12 in the BOHCV

John 12 in the BOHLNT

John 12 in the BOHNTLTAL

John 12 in the BOILNTAP

John 12 in the BOITCV

John 12 in the BOKCV

John 12 in the BOKCV2

John 12 in the BOKHWOG

John 12 in the BOKSSV

John 12 in the BOLCB

John 12 in the BOLCB2

John 12 in the BOMCV

John 12 in the BONAV

John 12 in the BONCB

John 12 in the BONLT

John 12 in the BONUT2

John 12 in the BOPLNT

John 12 in the BOSCB

John 12 in the BOSNC

John 12 in the BOTLNT

John 12 in the BOVCB

John 12 in the BOYCB

John 12 in the BPBB

John 12 in the BPH

John 12 in the BSB

John 12 in the CCB

John 12 in the CUV

John 12 in the CUVS

John 12 in the DBT

John 12 in the DGDNT

John 12 in the DHNT

John 12 in the DNT

John 12 in the ELBE

John 12 in the EMTV

John 12 in the ESV

John 12 in the FBV

John 12 in the FEB

John 12 in the GGMNT

John 12 in the GNT

John 12 in the HARY

John 12 in the HNT

John 12 in the IRVA

John 12 in the IRVB

John 12 in the IRVG

John 12 in the IRVH

John 12 in the IRVK

John 12 in the IRVM

John 12 in the IRVM2

John 12 in the IRVO

John 12 in the IRVP

John 12 in the IRVT

John 12 in the IRVT2

John 12 in the IRVU

John 12 in the ISVN

John 12 in the JSNT

John 12 in the KAPI

John 12 in the KBT1ETNIK

John 12 in the KBV

John 12 in the KJV

John 12 in the KNFD

John 12 in the LBA

John 12 in the LBLA

John 12 in the LNT

John 12 in the LSV

John 12 in the MAAL

John 12 in the MBV

John 12 in the MBV2

John 12 in the MHNT

John 12 in the MKNFD

John 12 in the MNG

John 12 in the MNT

John 12 in the MNT2

John 12 in the MRS1T

John 12 in the NAA

John 12 in the NASB

John 12 in the NBLA

John 12 in the NBS

John 12 in the NBVTP

John 12 in the NET2

John 12 in the NIV11

John 12 in the NNT

John 12 in the NNT2

John 12 in the NNT3

John 12 in the PDDPT

John 12 in the PFNT

John 12 in the RMNT

John 12 in the SBIAS

John 12 in the SBIBS

John 12 in the SBIBS2

John 12 in the SBICS

John 12 in the SBIDS

John 12 in the SBIGS

John 12 in the SBIHS

John 12 in the SBIIS

John 12 in the SBIIS2

John 12 in the SBIIS3

John 12 in the SBIKS

John 12 in the SBIKS2

John 12 in the SBIMS

John 12 in the SBIOS

John 12 in the SBIPS

John 12 in the SBISS

John 12 in the SBITS

John 12 in the SBITS2

John 12 in the SBITS3

John 12 in the SBITS4

John 12 in the SBIUS

John 12 in the SBIVS

John 12 in the SBT

John 12 in the SBT1E

John 12 in the SCHL

John 12 in the SNT

John 12 in the SUSU

John 12 in the SUSU2

John 12 in the SYNO

John 12 in the TBIAOTANT

John 12 in the TBT1E

John 12 in the TBT1E2

John 12 in the TFTIP

John 12 in the TFTU

John 12 in the TGNTATF3T

John 12 in the THAI

John 12 in the TNFD

John 12 in the TNT

John 12 in the TNTIK

John 12 in the TNTIL

John 12 in the TNTIN

John 12 in the TNTIP

John 12 in the TNTIZ

John 12 in the TOMA

John 12 in the TTENT

John 12 in the UBG

John 12 in the UGV

John 12 in the UGV2

John 12 in the UGV3

John 12 in the VBL

John 12 in the VDCC

John 12 in the YALU

John 12 in the YAPE

John 12 in the YBVTP

John 12 in the ZBP