John 2 (BOICB)

1 Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ. 2 A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a. 3 Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.” 4 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.” 5 Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.” 6 A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ. 7 Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri. 8 Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.”Ha mekwara nke a. 9 Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche 10 sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.” 11 Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya. 12 Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ. 13 Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. 14 Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. 15 Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. 16 Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.” 17 Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.” 18 Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.” 19 Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.” 20 Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?” 21 Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya. 22 Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru. 23 Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya. 24 Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma. 25 Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.

In Other Versions

John 2 in the ANGEFD

John 2 in the ANTPNG2D

John 2 in the AS21

John 2 in the BAGH

John 2 in the BBPNG

John 2 in the BBT1E

John 2 in the BDS

John 2 in the BEV

John 2 in the BHAD

John 2 in the BIB

John 2 in the BLPT

John 2 in the BNT

John 2 in the BNTABOOT

John 2 in the BNTLV

John 2 in the BOATCB

John 2 in the BOATCB2

John 2 in the BOBCV

John 2 in the BOCNT

John 2 in the BOECS

John 2 in the BOGWICC

John 2 in the BOHCB

John 2 in the BOHCV

John 2 in the BOHLNT

John 2 in the BOHNTLTAL

John 2 in the BOILNTAP

John 2 in the BOITCV

John 2 in the BOKCV

John 2 in the BOKCV2

John 2 in the BOKHWOG

John 2 in the BOKSSV

John 2 in the BOLCB

John 2 in the BOLCB2

John 2 in the BOMCV

John 2 in the BONAV

John 2 in the BONCB

John 2 in the BONLT

John 2 in the BONUT2

John 2 in the BOPLNT

John 2 in the BOSCB

John 2 in the BOSNC

John 2 in the BOTLNT

John 2 in the BOVCB

John 2 in the BOYCB

John 2 in the BPBB

John 2 in the BPH

John 2 in the BSB

John 2 in the CCB

John 2 in the CUV

John 2 in the CUVS

John 2 in the DBT

John 2 in the DGDNT

John 2 in the DHNT

John 2 in the DNT

John 2 in the ELBE

John 2 in the EMTV

John 2 in the ESV

John 2 in the FBV

John 2 in the FEB

John 2 in the GGMNT

John 2 in the GNT

John 2 in the HARY

John 2 in the HNT

John 2 in the IRVA

John 2 in the IRVB

John 2 in the IRVG

John 2 in the IRVH

John 2 in the IRVK

John 2 in the IRVM

John 2 in the IRVM2

John 2 in the IRVO

John 2 in the IRVP

John 2 in the IRVT

John 2 in the IRVT2

John 2 in the IRVU

John 2 in the ISVN

John 2 in the JSNT

John 2 in the KAPI

John 2 in the KBT1ETNIK

John 2 in the KBV

John 2 in the KJV

John 2 in the KNFD

John 2 in the LBA

John 2 in the LBLA

John 2 in the LNT

John 2 in the LSV

John 2 in the MAAL

John 2 in the MBV

John 2 in the MBV2

John 2 in the MHNT

John 2 in the MKNFD

John 2 in the MNG

John 2 in the MNT

John 2 in the MNT2

John 2 in the MRS1T

John 2 in the NAA

John 2 in the NASB

John 2 in the NBLA

John 2 in the NBS

John 2 in the NBVTP

John 2 in the NET2

John 2 in the NIV11

John 2 in the NNT

John 2 in the NNT2

John 2 in the NNT3

John 2 in the PDDPT

John 2 in the PFNT

John 2 in the RMNT

John 2 in the SBIAS

John 2 in the SBIBS

John 2 in the SBIBS2

John 2 in the SBICS

John 2 in the SBIDS

John 2 in the SBIGS

John 2 in the SBIHS

John 2 in the SBIIS

John 2 in the SBIIS2

John 2 in the SBIIS3

John 2 in the SBIKS

John 2 in the SBIKS2

John 2 in the SBIMS

John 2 in the SBIOS

John 2 in the SBIPS

John 2 in the SBISS

John 2 in the SBITS

John 2 in the SBITS2

John 2 in the SBITS3

John 2 in the SBITS4

John 2 in the SBIUS

John 2 in the SBIVS

John 2 in the SBT

John 2 in the SBT1E

John 2 in the SCHL

John 2 in the SNT

John 2 in the SUSU

John 2 in the SUSU2

John 2 in the SYNO

John 2 in the TBIAOTANT

John 2 in the TBT1E

John 2 in the TBT1E2

John 2 in the TFTIP

John 2 in the TFTU

John 2 in the TGNTATF3T

John 2 in the THAI

John 2 in the TNFD

John 2 in the TNT

John 2 in the TNTIK

John 2 in the TNTIL

John 2 in the TNTIN

John 2 in the TNTIP

John 2 in the TNTIZ

John 2 in the TOMA

John 2 in the TTENT

John 2 in the UBG

John 2 in the UGV

John 2 in the UGV2

John 2 in the UGV3

John 2 in the VBL

John 2 in the VDCC

John 2 in the YALU

John 2 in the YAPE

John 2 in the YBVTP

John 2 in the ZBP