John 7 (BOICB)

1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. 2 Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso, 3 ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ. 4 Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” 5 Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya. 6 Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile. 7 Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ. 8 Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.” 9 Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili. 10 Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo. 11 Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?” 12 E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.”Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.” 13 Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu. 14 Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe. 15 Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?” 16 Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m. 17 Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke. 18 Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya. 19 Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?” 20 Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?” 21 Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya. 22 Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu. 23 Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike? 24 Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.” 25 Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu? 26 Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst? 27 Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.” 28 Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya. 29 Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.” 30 Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị. 31 Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?” 32 Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya. 33 Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m. 34 Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.” 35 Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe? 36 Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?” 37 Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri. 38 Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.” 39 O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto. 40 Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.” 41 Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.”Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? 42 Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” 43 Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. 44 Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka. 45 Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?” 46 Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.” 47 Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? 48 Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? 49 E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.” 50 Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, 51 “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?” 52 Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” 53 Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.

In Other Versions

John 7 in the ANGEFD

John 7 in the ANTPNG2D

John 7 in the AS21

John 7 in the BAGH

John 7 in the BBPNG

John 7 in the BBT1E

John 7 in the BDS

John 7 in the BEV

John 7 in the BHAD

John 7 in the BIB

John 7 in the BLPT

John 7 in the BNT

John 7 in the BNTABOOT

John 7 in the BNTLV

John 7 in the BOATCB

John 7 in the BOATCB2

John 7 in the BOBCV

John 7 in the BOCNT

John 7 in the BOECS

John 7 in the BOGWICC

John 7 in the BOHCB

John 7 in the BOHCV

John 7 in the BOHLNT

John 7 in the BOHNTLTAL

John 7 in the BOILNTAP

John 7 in the BOITCV

John 7 in the BOKCV

John 7 in the BOKCV2

John 7 in the BOKHWOG

John 7 in the BOKSSV

John 7 in the BOLCB

John 7 in the BOLCB2

John 7 in the BOMCV

John 7 in the BONAV

John 7 in the BONCB

John 7 in the BONLT

John 7 in the BONUT2

John 7 in the BOPLNT

John 7 in the BOSCB

John 7 in the BOSNC

John 7 in the BOTLNT

John 7 in the BOVCB

John 7 in the BOYCB

John 7 in the BPBB

John 7 in the BPH

John 7 in the BSB

John 7 in the CCB

John 7 in the CUV

John 7 in the CUVS

John 7 in the DBT

John 7 in the DGDNT

John 7 in the DHNT

John 7 in the DNT

John 7 in the ELBE

John 7 in the EMTV

John 7 in the ESV

John 7 in the FBV

John 7 in the FEB

John 7 in the GGMNT

John 7 in the GNT

John 7 in the HARY

John 7 in the HNT

John 7 in the IRVA

John 7 in the IRVB

John 7 in the IRVG

John 7 in the IRVH

John 7 in the IRVK

John 7 in the IRVM

John 7 in the IRVM2

John 7 in the IRVO

John 7 in the IRVP

John 7 in the IRVT

John 7 in the IRVT2

John 7 in the IRVU

John 7 in the ISVN

John 7 in the JSNT

John 7 in the KAPI

John 7 in the KBT1ETNIK

John 7 in the KBV

John 7 in the KJV

John 7 in the KNFD

John 7 in the LBA

John 7 in the LBLA

John 7 in the LNT

John 7 in the LSV

John 7 in the MAAL

John 7 in the MBV

John 7 in the MBV2

John 7 in the MHNT

John 7 in the MKNFD

John 7 in the MNG

John 7 in the MNT

John 7 in the MNT2

John 7 in the MRS1T

John 7 in the NAA

John 7 in the NASB

John 7 in the NBLA

John 7 in the NBS

John 7 in the NBVTP

John 7 in the NET2

John 7 in the NIV11

John 7 in the NNT

John 7 in the NNT2

John 7 in the NNT3

John 7 in the PDDPT

John 7 in the PFNT

John 7 in the RMNT

John 7 in the SBIAS

John 7 in the SBIBS

John 7 in the SBIBS2

John 7 in the SBICS

John 7 in the SBIDS

John 7 in the SBIGS

John 7 in the SBIHS

John 7 in the SBIIS

John 7 in the SBIIS2

John 7 in the SBIIS3

John 7 in the SBIKS

John 7 in the SBIKS2

John 7 in the SBIMS

John 7 in the SBIOS

John 7 in the SBIPS

John 7 in the SBISS

John 7 in the SBITS

John 7 in the SBITS2

John 7 in the SBITS3

John 7 in the SBITS4

John 7 in the SBIUS

John 7 in the SBIVS

John 7 in the SBT

John 7 in the SBT1E

John 7 in the SCHL

John 7 in the SNT

John 7 in the SUSU

John 7 in the SUSU2

John 7 in the SYNO

John 7 in the TBIAOTANT

John 7 in the TBT1E

John 7 in the TBT1E2

John 7 in the TFTIP

John 7 in the TFTU

John 7 in the TGNTATF3T

John 7 in the THAI

John 7 in the TNFD

John 7 in the TNT

John 7 in the TNTIK

John 7 in the TNTIL

John 7 in the TNTIN

John 7 in the TNTIP

John 7 in the TNTIZ

John 7 in the TOMA

John 7 in the TTENT

John 7 in the UBG

John 7 in the UGV

John 7 in the UGV2

John 7 in the UGV3

John 7 in the VBL

John 7 in the VDCC

John 7 in the YALU

John 7 in the YAPE

John 7 in the YBVTP

John 7 in the ZBP