Job 24 (BOICB)

1 “Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a? 2 Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi. 3 Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe. 4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. 5 Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri. 6 Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume. 7 Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi. 8 Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba. 9 Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe. 10 Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ. 11 Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ. 12 Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. 13 “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,ndị na-amaghị ụzọ yamaọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. 14 Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15 Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16 Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17 Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18 “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. 19 Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. 20 Akpanwa na-echefu ha,ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;anaghị echetakwa ndị ajọọ omumekama a na-etiji ha dịka osisi. 21 Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ. 22 Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. 23 Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. 24 A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka. 25 “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụghasi otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”

In Other Versions

Job 24 in the ANGEFD

Job 24 in the ANTPNG2D

Job 24 in the AS21

Job 24 in the BAGH

Job 24 in the BBPNG

Job 24 in the BBT1E

Job 24 in the BDS

Job 24 in the BEV

Job 24 in the BHAD

Job 24 in the BIB

Job 24 in the BLPT

Job 24 in the BNT

Job 24 in the BNTABOOT

Job 24 in the BNTLV

Job 24 in the BOATCB

Job 24 in the BOATCB2

Job 24 in the BOBCV

Job 24 in the BOCNT

Job 24 in the BOECS

Job 24 in the BOGWICC

Job 24 in the BOHCB

Job 24 in the BOHCV

Job 24 in the BOHLNT

Job 24 in the BOHNTLTAL

Job 24 in the BOILNTAP

Job 24 in the BOITCV

Job 24 in the BOKCV

Job 24 in the BOKCV2

Job 24 in the BOKHWOG

Job 24 in the BOKSSV

Job 24 in the BOLCB

Job 24 in the BOLCB2

Job 24 in the BOMCV

Job 24 in the BONAV

Job 24 in the BONCB

Job 24 in the BONLT

Job 24 in the BONUT2

Job 24 in the BOPLNT

Job 24 in the BOSCB

Job 24 in the BOSNC

Job 24 in the BOTLNT

Job 24 in the BOVCB

Job 24 in the BOYCB

Job 24 in the BPBB

Job 24 in the BPH

Job 24 in the BSB

Job 24 in the CCB

Job 24 in the CUV

Job 24 in the CUVS

Job 24 in the DBT

Job 24 in the DGDNT

Job 24 in the DHNT

Job 24 in the DNT

Job 24 in the ELBE

Job 24 in the EMTV

Job 24 in the ESV

Job 24 in the FBV

Job 24 in the FEB

Job 24 in the GGMNT

Job 24 in the GNT

Job 24 in the HARY

Job 24 in the HNT

Job 24 in the IRVA

Job 24 in the IRVB

Job 24 in the IRVG

Job 24 in the IRVH

Job 24 in the IRVK

Job 24 in the IRVM

Job 24 in the IRVM2

Job 24 in the IRVO

Job 24 in the IRVP

Job 24 in the IRVT

Job 24 in the IRVT2

Job 24 in the IRVU

Job 24 in the ISVN

Job 24 in the JSNT

Job 24 in the KAPI

Job 24 in the KBT1ETNIK

Job 24 in the KBV

Job 24 in the KJV

Job 24 in the KNFD

Job 24 in the LBA

Job 24 in the LBLA

Job 24 in the LNT

Job 24 in the LSV

Job 24 in the MAAL

Job 24 in the MBV

Job 24 in the MBV2

Job 24 in the MHNT

Job 24 in the MKNFD

Job 24 in the MNG

Job 24 in the MNT

Job 24 in the MNT2

Job 24 in the MRS1T

Job 24 in the NAA

Job 24 in the NASB

Job 24 in the NBLA

Job 24 in the NBS

Job 24 in the NBVTP

Job 24 in the NET2

Job 24 in the NIV11

Job 24 in the NNT

Job 24 in the NNT2

Job 24 in the NNT3

Job 24 in the PDDPT

Job 24 in the PFNT

Job 24 in the RMNT

Job 24 in the SBIAS

Job 24 in the SBIBS

Job 24 in the SBIBS2

Job 24 in the SBICS

Job 24 in the SBIDS

Job 24 in the SBIGS

Job 24 in the SBIHS

Job 24 in the SBIIS

Job 24 in the SBIIS2

Job 24 in the SBIIS3

Job 24 in the SBIKS

Job 24 in the SBIKS2

Job 24 in the SBIMS

Job 24 in the SBIOS

Job 24 in the SBIPS

Job 24 in the SBISS

Job 24 in the SBITS

Job 24 in the SBITS2

Job 24 in the SBITS3

Job 24 in the SBITS4

Job 24 in the SBIUS

Job 24 in the SBIVS

Job 24 in the SBT

Job 24 in the SBT1E

Job 24 in the SCHL

Job 24 in the SNT

Job 24 in the SUSU

Job 24 in the SUSU2

Job 24 in the SYNO

Job 24 in the TBIAOTANT

Job 24 in the TBT1E

Job 24 in the TBT1E2

Job 24 in the TFTIP

Job 24 in the TFTU

Job 24 in the TGNTATF3T

Job 24 in the THAI

Job 24 in the TNFD

Job 24 in the TNT

Job 24 in the TNTIK

Job 24 in the TNTIL

Job 24 in the TNTIN

Job 24 in the TNTIP

Job 24 in the TNTIZ

Job 24 in the TOMA

Job 24 in the TTENT

Job 24 in the UBG

Job 24 in the UGV

Job 24 in the UGV2

Job 24 in the UGV3

Job 24 in the VBL

Job 24 in the VDCC

Job 24 in the YALU

Job 24 in the YAPE

Job 24 in the YBVTP

Job 24 in the ZBP