Job 25 (BOICB)
1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: 2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe. 3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị? 4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha? 5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya, 6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,mmadụ, nke bụ naanị idide.”