Job 36 (BOICB)
1 Elihu gara nʼihu sị: 2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gịna ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke. 3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;aga m enye Onye kere m ezi omume. 4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị. 5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime. 6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha. 7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike, 9 ọ na-agwa ha ihe ha mere,na ha sitere na nganga ha mehie. 10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme. 11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju. 12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe. 13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ. 14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche. 15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha. 16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ. 17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị. 18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị. 19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gịka ị ghara ịnọ na mkpagbu? 20 Anọla na-echere ka abalị bịa,mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ. 21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu. 22 “E buliela Chineke elu nʼike ya,onye bụ onye ozizi dịka ya? 23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’? 24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ. 25 Mmadụ niile ahụzuola ya;ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya. 26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta. 27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile. 28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime yamee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ. 29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya? 30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu yana-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niilena-enyejukwa ha nri afọ. 32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ. 33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
In Other Versions
Job 36 in the ANGEFD
Job 36 in the ANTPNG2D
Job 36 in the AS21
Job 36 in the BAGH
Job 36 in the BBPNG
Job 36 in the BBT1E
Job 36 in the BDS
Job 36 in the BEV
Job 36 in the BHAD
Job 36 in the BIB
Job 36 in the BLPT
Job 36 in the BNT
Job 36 in the BNTABOOT
Job 36 in the BNTLV
Job 36 in the BOATCB
Job 36 in the BOATCB2
Job 36 in the BOBCV
Job 36 in the BOCNT
Job 36 in the BOECS
Job 36 in the BOGWICC
Job 36 in the BOHCB
Job 36 in the BOHCV
Job 36 in the BOHLNT
Job 36 in the BOHNTLTAL
Job 36 in the BOILNTAP
Job 36 in the BOITCV
Job 36 in the BOKCV
Job 36 in the BOKCV2
Job 36 in the BOKHWOG
Job 36 in the BOKSSV
Job 36 in the BOLCB
Job 36 in the BOLCB2
Job 36 in the BOMCV
Job 36 in the BONAV
Job 36 in the BONCB
Job 36 in the BONLT
Job 36 in the BONUT2
Job 36 in the BOPLNT
Job 36 in the BOSCB
Job 36 in the BOSNC
Job 36 in the BOTLNT
Job 36 in the BOVCB
Job 36 in the BOYCB
Job 36 in the BPBB
Job 36 in the BPH
Job 36 in the BSB
Job 36 in the CCB
Job 36 in the CUV
Job 36 in the CUVS
Job 36 in the DBT
Job 36 in the DGDNT
Job 36 in the DHNT
Job 36 in the DNT
Job 36 in the ELBE
Job 36 in the EMTV
Job 36 in the ESV
Job 36 in the FBV
Job 36 in the FEB
Job 36 in the GGMNT
Job 36 in the GNT
Job 36 in the HARY
Job 36 in the HNT
Job 36 in the IRVA
Job 36 in the IRVB
Job 36 in the IRVG
Job 36 in the IRVH
Job 36 in the IRVK
Job 36 in the IRVM
Job 36 in the IRVM2
Job 36 in the IRVO
Job 36 in the IRVP
Job 36 in the IRVT
Job 36 in the IRVT2
Job 36 in the IRVU
Job 36 in the ISVN
Job 36 in the JSNT
Job 36 in the KAPI
Job 36 in the KBT1ETNIK
Job 36 in the KBV
Job 36 in the KJV
Job 36 in the KNFD
Job 36 in the LBA
Job 36 in the LBLA
Job 36 in the LNT
Job 36 in the LSV
Job 36 in the MAAL
Job 36 in the MBV
Job 36 in the MBV2
Job 36 in the MHNT
Job 36 in the MKNFD
Job 36 in the MNG
Job 36 in the MNT
Job 36 in the MNT2
Job 36 in the MRS1T
Job 36 in the NAA
Job 36 in the NASB
Job 36 in the NBLA
Job 36 in the NBS
Job 36 in the NBVTP
Job 36 in the NET2
Job 36 in the NIV11
Job 36 in the NNT
Job 36 in the NNT2
Job 36 in the NNT3
Job 36 in the PDDPT
Job 36 in the PFNT
Job 36 in the RMNT
Job 36 in the SBIAS
Job 36 in the SBIBS
Job 36 in the SBIBS2
Job 36 in the SBICS
Job 36 in the SBIDS
Job 36 in the SBIGS
Job 36 in the SBIHS
Job 36 in the SBIIS
Job 36 in the SBIIS2
Job 36 in the SBIIS3
Job 36 in the SBIKS
Job 36 in the SBIKS2
Job 36 in the SBIMS
Job 36 in the SBIOS
Job 36 in the SBIPS
Job 36 in the SBISS
Job 36 in the SBITS
Job 36 in the SBITS2
Job 36 in the SBITS3
Job 36 in the SBITS4
Job 36 in the SBIUS
Job 36 in the SBIVS
Job 36 in the SBT
Job 36 in the SBT1E
Job 36 in the SCHL
Job 36 in the SNT
Job 36 in the SUSU
Job 36 in the SUSU2
Job 36 in the SYNO
Job 36 in the TBIAOTANT
Job 36 in the TBT1E
Job 36 in the TBT1E2
Job 36 in the TFTIP
Job 36 in the TFTU
Job 36 in the TGNTATF3T
Job 36 in the THAI
Job 36 in the TNFD
Job 36 in the TNT
Job 36 in the TNTIK
Job 36 in the TNTIL
Job 36 in the TNTIN
Job 36 in the TNTIP
Job 36 in the TNTIZ
Job 36 in the TOMA
Job 36 in the TTENT
Job 36 in the UBG
Job 36 in the UGV
Job 36 in the UGV2
Job 36 in the UGV3
Job 36 in the VBL
Job 36 in the VDCC
Job 36 in the YALU
Job 36 in the YAPE
Job 36 in the YBVTP
Job 36 in the ZBP