Job 38 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: 2 “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na yana-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè? 3 Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpanʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gịnke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha. 4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara. 5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya? 6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya? 7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike? 8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebemgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta, 9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe,werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike, 10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị,tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya, 11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya,nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’? 12 “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu,maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya, 13 ka o jide akụkụ niile nke ụwa akama site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu? 14 Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara;ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe. 15 A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè,meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri. 16 “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri,ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri? 17 O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ?Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ? 18 Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ?Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile. 19 “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?Olee ebe ọchịchịrị bi? 20 Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha? 21 Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!Ị bikwaala ọtụtụ afọ. 22 “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe, 23 nke m chekwara nye oge nsogbu,nʼoge ọgụ na nʼoge agha? 24 Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe,ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa? 25 Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo,onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ? 26 Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị,ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya, 27 ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiriiji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya. 28 Mmiri ozuzo o nwere nna?Onye mụrụ igirigi? 29 Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta?Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe, 30 nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume,meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta? 31 “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades?Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion? 32 Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge hamaọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ? 33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe?Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa? 34 “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojiisi otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị? 35 Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha?Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’? 36 Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ,maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta? 37 Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ?Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile, 38 mgbe aja dị nʼala siri ike,mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha? 39 “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri,mee ka afọ ju ụmụ ọdụm 40 mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha,maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa? 41 Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya,mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ,mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?

In Other Versions

Job 38 in the ANGEFD

Job 38 in the ANTPNG2D

Job 38 in the AS21

Job 38 in the BAGH

Job 38 in the BBPNG

Job 38 in the BBT1E

Job 38 in the BDS

Job 38 in the BEV

Job 38 in the BHAD

Job 38 in the BIB

Job 38 in the BLPT

Job 38 in the BNT

Job 38 in the BNTABOOT

Job 38 in the BNTLV

Job 38 in the BOATCB

Job 38 in the BOATCB2

Job 38 in the BOBCV

Job 38 in the BOCNT

Job 38 in the BOECS

Job 38 in the BOGWICC

Job 38 in the BOHCB

Job 38 in the BOHCV

Job 38 in the BOHLNT

Job 38 in the BOHNTLTAL

Job 38 in the BOILNTAP

Job 38 in the BOITCV

Job 38 in the BOKCV

Job 38 in the BOKCV2

Job 38 in the BOKHWOG

Job 38 in the BOKSSV

Job 38 in the BOLCB

Job 38 in the BOLCB2

Job 38 in the BOMCV

Job 38 in the BONAV

Job 38 in the BONCB

Job 38 in the BONLT

Job 38 in the BONUT2

Job 38 in the BOPLNT

Job 38 in the BOSCB

Job 38 in the BOSNC

Job 38 in the BOTLNT

Job 38 in the BOVCB

Job 38 in the BOYCB

Job 38 in the BPBB

Job 38 in the BPH

Job 38 in the BSB

Job 38 in the CCB

Job 38 in the CUV

Job 38 in the CUVS

Job 38 in the DBT

Job 38 in the DGDNT

Job 38 in the DHNT

Job 38 in the DNT

Job 38 in the ELBE

Job 38 in the EMTV

Job 38 in the ESV

Job 38 in the FBV

Job 38 in the FEB

Job 38 in the GGMNT

Job 38 in the GNT

Job 38 in the HARY

Job 38 in the HNT

Job 38 in the IRVA

Job 38 in the IRVB

Job 38 in the IRVG

Job 38 in the IRVH

Job 38 in the IRVK

Job 38 in the IRVM

Job 38 in the IRVM2

Job 38 in the IRVO

Job 38 in the IRVP

Job 38 in the IRVT

Job 38 in the IRVT2

Job 38 in the IRVU

Job 38 in the ISVN

Job 38 in the JSNT

Job 38 in the KAPI

Job 38 in the KBT1ETNIK

Job 38 in the KBV

Job 38 in the KJV

Job 38 in the KNFD

Job 38 in the LBA

Job 38 in the LBLA

Job 38 in the LNT

Job 38 in the LSV

Job 38 in the MAAL

Job 38 in the MBV

Job 38 in the MBV2

Job 38 in the MHNT

Job 38 in the MKNFD

Job 38 in the MNG

Job 38 in the MNT

Job 38 in the MNT2

Job 38 in the MRS1T

Job 38 in the NAA

Job 38 in the NASB

Job 38 in the NBLA

Job 38 in the NBS

Job 38 in the NBVTP

Job 38 in the NET2

Job 38 in the NIV11

Job 38 in the NNT

Job 38 in the NNT2

Job 38 in the NNT3

Job 38 in the PDDPT

Job 38 in the PFNT

Job 38 in the RMNT

Job 38 in the SBIAS

Job 38 in the SBIBS

Job 38 in the SBIBS2

Job 38 in the SBICS

Job 38 in the SBIDS

Job 38 in the SBIGS

Job 38 in the SBIHS

Job 38 in the SBIIS

Job 38 in the SBIIS2

Job 38 in the SBIIS3

Job 38 in the SBIKS

Job 38 in the SBIKS2

Job 38 in the SBIMS

Job 38 in the SBIOS

Job 38 in the SBIPS

Job 38 in the SBISS

Job 38 in the SBITS

Job 38 in the SBITS2

Job 38 in the SBITS3

Job 38 in the SBITS4

Job 38 in the SBIUS

Job 38 in the SBIVS

Job 38 in the SBT

Job 38 in the SBT1E

Job 38 in the SCHL

Job 38 in the SNT

Job 38 in the SUSU

Job 38 in the SUSU2

Job 38 in the SYNO

Job 38 in the TBIAOTANT

Job 38 in the TBT1E

Job 38 in the TBT1E2

Job 38 in the TFTIP

Job 38 in the TFTU

Job 38 in the TGNTATF3T

Job 38 in the THAI

Job 38 in the TNFD

Job 38 in the TNT

Job 38 in the TNTIK

Job 38 in the TNTIL

Job 38 in the TNTIN

Job 38 in the TNTIP

Job 38 in the TNTIZ

Job 38 in the TOMA

Job 38 in the TTENT

Job 38 in the UBG

Job 38 in the UGV

Job 38 in the UGV2

Job 38 in the UGV3

Job 38 in the VBL

Job 38 in the VDCC

Job 38 in the YALU

Job 38 in the YAPE

Job 38 in the YBVTP

Job 38 in the ZBP