Joel 3 (BOICB)
1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ,mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem, 2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa,mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat.Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe,nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel.Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile,kee ala m nʼetiti onwe ha. 3 Ha fere nza nʼihi ndị m,were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna.Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ. 4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere. 5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu. 6 Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha. 7 “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. 8 Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. 9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:Jikerenụ agha!Kpọteenụ ndị dike nʼagha.Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. 10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,“Adị m ike!” 11 Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike ONYENWE ANYỊ! 12 “Ka akpọlitekwa mba niile,mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13 Tinye mma iwe ihe ubi,nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14 Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!Nʼihi na ụbọchị ONYENWE ANYỊ dị nso,na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15 Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16 ONYENWE ANYỊ ga-ebigbọ na Zayọn,olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. ONYENWE ANYỊ ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17 “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unubi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18 “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ sọpụtadee Ndagwurugwu Shitim. 19 Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20 Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. 21 Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha?Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bi na Zayọn.”
In Other Versions
Joel 3 in the ANGEFD
Joel 3 in the ANTPNG2D
Joel 3 in the AS21
Joel 3 in the BAGH
Joel 3 in the BBPNG
Joel 3 in the BBT1E
Joel 3 in the BDS
Joel 3 in the BEV
Joel 3 in the BHAD
Joel 3 in the BIB
Joel 3 in the BLPT
Joel 3 in the BNT
Joel 3 in the BNTABOOT
Joel 3 in the BNTLV
Joel 3 in the BOATCB
Joel 3 in the BOATCB2
Joel 3 in the BOBCV
Joel 3 in the BOCNT
Joel 3 in the BOECS
Joel 3 in the BOGWICC
Joel 3 in the BOHCB
Joel 3 in the BOHCV
Joel 3 in the BOHLNT
Joel 3 in the BOHNTLTAL
Joel 3 in the BOILNTAP
Joel 3 in the BOITCV
Joel 3 in the BOKCV
Joel 3 in the BOKCV2
Joel 3 in the BOKHWOG
Joel 3 in the BOKSSV
Joel 3 in the BOLCB
Joel 3 in the BOLCB2
Joel 3 in the BOMCV
Joel 3 in the BONAV
Joel 3 in the BONCB
Joel 3 in the BONLT
Joel 3 in the BONUT2
Joel 3 in the BOPLNT
Joel 3 in the BOSCB
Joel 3 in the BOSNC
Joel 3 in the BOTLNT
Joel 3 in the BOVCB
Joel 3 in the BOYCB
Joel 3 in the BPBB
Joel 3 in the BPH
Joel 3 in the BSB
Joel 3 in the CCB
Joel 3 in the CUV
Joel 3 in the CUVS
Joel 3 in the DBT
Joel 3 in the DGDNT
Joel 3 in the DHNT
Joel 3 in the DNT
Joel 3 in the ELBE
Joel 3 in the EMTV
Joel 3 in the ESV
Joel 3 in the FBV
Joel 3 in the FEB
Joel 3 in the GGMNT
Joel 3 in the GNT
Joel 3 in the HARY
Joel 3 in the HNT
Joel 3 in the IRVA
Joel 3 in the IRVB
Joel 3 in the IRVG
Joel 3 in the IRVH
Joel 3 in the IRVK
Joel 3 in the IRVM
Joel 3 in the IRVM2
Joel 3 in the IRVO
Joel 3 in the IRVP
Joel 3 in the IRVT
Joel 3 in the IRVT2
Joel 3 in the IRVU
Joel 3 in the ISVN
Joel 3 in the JSNT
Joel 3 in the KAPI
Joel 3 in the KBT1ETNIK
Joel 3 in the KBV
Joel 3 in the KJV
Joel 3 in the KNFD
Joel 3 in the LBA
Joel 3 in the LBLA
Joel 3 in the LNT
Joel 3 in the LSV
Joel 3 in the MAAL
Joel 3 in the MBV
Joel 3 in the MBV2
Joel 3 in the MHNT
Joel 3 in the MKNFD
Joel 3 in the MNG
Joel 3 in the MNT
Joel 3 in the MNT2
Joel 3 in the MRS1T
Joel 3 in the NAA
Joel 3 in the NASB
Joel 3 in the NBLA
Joel 3 in the NBS
Joel 3 in the NBVTP
Joel 3 in the NET2
Joel 3 in the NIV11
Joel 3 in the NNT
Joel 3 in the NNT2
Joel 3 in the NNT3
Joel 3 in the PDDPT
Joel 3 in the PFNT
Joel 3 in the RMNT
Joel 3 in the SBIAS
Joel 3 in the SBIBS
Joel 3 in the SBIBS2
Joel 3 in the SBICS
Joel 3 in the SBIDS
Joel 3 in the SBIGS
Joel 3 in the SBIHS
Joel 3 in the SBIIS
Joel 3 in the SBIIS2
Joel 3 in the SBIIS3
Joel 3 in the SBIKS
Joel 3 in the SBIKS2
Joel 3 in the SBIMS
Joel 3 in the SBIOS
Joel 3 in the SBIPS
Joel 3 in the SBISS
Joel 3 in the SBITS
Joel 3 in the SBITS2
Joel 3 in the SBITS3
Joel 3 in the SBITS4
Joel 3 in the SBIUS
Joel 3 in the SBIVS
Joel 3 in the SBT
Joel 3 in the SBT1E
Joel 3 in the SCHL
Joel 3 in the SNT
Joel 3 in the SUSU
Joel 3 in the SUSU2
Joel 3 in the SYNO
Joel 3 in the TBIAOTANT
Joel 3 in the TBT1E
Joel 3 in the TBT1E2
Joel 3 in the TFTIP
Joel 3 in the TFTU
Joel 3 in the TGNTATF3T
Joel 3 in the THAI
Joel 3 in the TNFD
Joel 3 in the TNT
Joel 3 in the TNTIK
Joel 3 in the TNTIL
Joel 3 in the TNTIN
Joel 3 in the TNTIP
Joel 3 in the TNTIZ
Joel 3 in the TOMA
Joel 3 in the TTENT
Joel 3 in the UBG
Joel 3 in the UGV
Joel 3 in the UGV2
Joel 3 in the UGV3
Joel 3 in the VBL
Joel 3 in the VDCC
Joel 3 in the YALU
Joel 3 in the YAPE
Joel 3 in the YBVTP
Joel 3 in the ZBP