Luke 19 (BOICB)

1 Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2 Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3 Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4 Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ. 5 Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” 6 Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya. 7 Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.” 8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” 9 Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.” 11 Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe. 12 Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13 Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ 14 “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ 15 “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. 16 “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ 17 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ 18 “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ 19 “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ 20 “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21 Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ 22 “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23 Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ 24 “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ 25 “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ 26 “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27 Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” 28 Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem. 29 Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 30 sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya. 31 Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ” 32 Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha. 33 Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?” 34 Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.” 35 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya. 36 Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. 37 Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38 na-asị,“Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.” 39 Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!” 40 Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.” 41 Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya, 42 sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị. 43 Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị. 44 Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.” 45 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46 Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ” 47 Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48 Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.

In Other Versions

Luke 19 in the ANGEFD

Luke 19 in the ANTPNG2D

Luke 19 in the AS21

Luke 19 in the BAGH

Luke 19 in the BBPNG

Luke 19 in the BBT1E

Luke 19 in the BDS

Luke 19 in the BEV

Luke 19 in the BHAD

Luke 19 in the BIB

Luke 19 in the BLPT

Luke 19 in the BNT

Luke 19 in the BNTABOOT

Luke 19 in the BNTLV

Luke 19 in the BOATCB

Luke 19 in the BOATCB2

Luke 19 in the BOBCV

Luke 19 in the BOCNT

Luke 19 in the BOECS

Luke 19 in the BOGWICC

Luke 19 in the BOHCB

Luke 19 in the BOHCV

Luke 19 in the BOHLNT

Luke 19 in the BOHNTLTAL

Luke 19 in the BOILNTAP

Luke 19 in the BOITCV

Luke 19 in the BOKCV

Luke 19 in the BOKCV2

Luke 19 in the BOKHWOG

Luke 19 in the BOKSSV

Luke 19 in the BOLCB

Luke 19 in the BOLCB2

Luke 19 in the BOMCV

Luke 19 in the BONAV

Luke 19 in the BONCB

Luke 19 in the BONLT

Luke 19 in the BONUT2

Luke 19 in the BOPLNT

Luke 19 in the BOSCB

Luke 19 in the BOSNC

Luke 19 in the BOTLNT

Luke 19 in the BOVCB

Luke 19 in the BOYCB

Luke 19 in the BPBB

Luke 19 in the BPH

Luke 19 in the BSB

Luke 19 in the CCB

Luke 19 in the CUV

Luke 19 in the CUVS

Luke 19 in the DBT

Luke 19 in the DGDNT

Luke 19 in the DHNT

Luke 19 in the DNT

Luke 19 in the ELBE

Luke 19 in the EMTV

Luke 19 in the ESV

Luke 19 in the FBV

Luke 19 in the FEB

Luke 19 in the GGMNT

Luke 19 in the GNT

Luke 19 in the HARY

Luke 19 in the HNT

Luke 19 in the IRVA

Luke 19 in the IRVB

Luke 19 in the IRVG

Luke 19 in the IRVH

Luke 19 in the IRVK

Luke 19 in the IRVM

Luke 19 in the IRVM2

Luke 19 in the IRVO

Luke 19 in the IRVP

Luke 19 in the IRVT

Luke 19 in the IRVT2

Luke 19 in the IRVU

Luke 19 in the ISVN

Luke 19 in the JSNT

Luke 19 in the KAPI

Luke 19 in the KBT1ETNIK

Luke 19 in the KBV

Luke 19 in the KJV

Luke 19 in the KNFD

Luke 19 in the LBA

Luke 19 in the LBLA

Luke 19 in the LNT

Luke 19 in the LSV

Luke 19 in the MAAL

Luke 19 in the MBV

Luke 19 in the MBV2

Luke 19 in the MHNT

Luke 19 in the MKNFD

Luke 19 in the MNG

Luke 19 in the MNT

Luke 19 in the MNT2

Luke 19 in the MRS1T

Luke 19 in the NAA

Luke 19 in the NASB

Luke 19 in the NBLA

Luke 19 in the NBS

Luke 19 in the NBVTP

Luke 19 in the NET2

Luke 19 in the NIV11

Luke 19 in the NNT

Luke 19 in the NNT2

Luke 19 in the NNT3

Luke 19 in the PDDPT

Luke 19 in the PFNT

Luke 19 in the RMNT

Luke 19 in the SBIAS

Luke 19 in the SBIBS

Luke 19 in the SBIBS2

Luke 19 in the SBICS

Luke 19 in the SBIDS

Luke 19 in the SBIGS

Luke 19 in the SBIHS

Luke 19 in the SBIIS

Luke 19 in the SBIIS2

Luke 19 in the SBIIS3

Luke 19 in the SBIKS

Luke 19 in the SBIKS2

Luke 19 in the SBIMS

Luke 19 in the SBIOS

Luke 19 in the SBIPS

Luke 19 in the SBISS

Luke 19 in the SBITS

Luke 19 in the SBITS2

Luke 19 in the SBITS3

Luke 19 in the SBITS4

Luke 19 in the SBIUS

Luke 19 in the SBIVS

Luke 19 in the SBT

Luke 19 in the SBT1E

Luke 19 in the SCHL

Luke 19 in the SNT

Luke 19 in the SUSU

Luke 19 in the SUSU2

Luke 19 in the SYNO

Luke 19 in the TBIAOTANT

Luke 19 in the TBT1E

Luke 19 in the TBT1E2

Luke 19 in the TFTIP

Luke 19 in the TFTU

Luke 19 in the TGNTATF3T

Luke 19 in the THAI

Luke 19 in the TNFD

Luke 19 in the TNT

Luke 19 in the TNTIK

Luke 19 in the TNTIL

Luke 19 in the TNTIN

Luke 19 in the TNTIP

Luke 19 in the TNTIZ

Luke 19 in the TOMA

Luke 19 in the TTENT

Luke 19 in the UBG

Luke 19 in the UGV

Luke 19 in the UGV2

Luke 19 in the UGV3

Luke 19 in the VBL

Luke 19 in the VDCC

Luke 19 in the YALU

Luke 19 in the YAPE

Luke 19 in the YBVTP

Luke 19 in the ZBP